Akwụkwọ Ozi Mbụ E Degaara Ndị kọrịnt 14:1-40

  • Ibu amụma na ịsụ asụsụ dị iche iche (1-25)

  • Otú ihe ga-esi na-aga n’usoro n’ọmụmụ ihe Ndị Kraịst (26-40)

    • Ihe ụmụ nwaanyị ga-eme ma ọgbakọ zukọọ (34, 35)

14   Hụnụ ndị ọzọ n’anya. Na-agbasikwanụ mbọ ike ka unu nweta* onyinye dị iche iche Chineke na-enye, karịchaa ka unu na-ebu amụma.+  O nweghị onye na-aghọta ihe onye na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche na-ekwu.+ Naanị Chineke na-aghọta ya. Ọ bụ eziokwu na o ji ike mmụọ nsọ na-ekwu ihe nzuzo ndị dị nsọ,+ o nweghị onye na-aghọta ihe ọ na-ekwu.  Ma, onye na-ebu amụma na-ekwu ihe ga-abara ndị mmadụ uru, na-agbakwa ha ume ma na-agụgụ ha obi.  Onye na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche na-eme ihe ga-abara onwe ya uru, ma onye na-ebu amụma na-eme ihe ga-abara ọgbakọ uru.  N’ihi ya, achọrọ m ka unu niile na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche,+ ma ihe m chọrọ ka unu na-emekwu bụ ibu amụma.+ N’eziokwu, onye na-ebu amụma ka onye na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche, ọ gwụla ma ọ̀ na-asụgharị ihe ọ na-ekwu, ka ọ baara ọgbakọ uru.  Ma ugbu a, ụmụnna m, ọ bụrụ na mụ abịa na-agwa unu okwu n’asụsụ dị iche iche, olee uru ọ ga-abara unu? Ọ bụrụ na m chọrọ inyere unu aka, m ga-agwa unu ihe Chineke gwara m+ ma ọ bụ gwa unu ihe m ma+ ma ọ bụ buoro unu amụma ma ọ bụkwanụ kụziere unu ihe.  Ọ dị ka ngwá egwú, dị ka ọjà ma ọ bụ ụbọ akwara. Ọ bụrụ na mmadụ na-egbu ọjà ma ọ bụ na-akpọ ụbọ akwara, ya abụrụkwa na a naghị anụcha ụda ya nke ọma, olee otú a ga-esi mara nke bụ́ ọjà na nke bụ́ ụbọ akwara?  Ọ bụrụ na onye na-egbu opi e ji akpọ ndị agha òkù egbuo ihe na-edochaghị anya, ònye ga-ejikere agha?  Ọ bụrụkwa na unu ekwughị ihe dị mfe nghọta, olee otú a ga-esi mata ihe unu na-ekwu? N’eziokwu, ọ ga-adị ka ùnu na-agwa ikuku okwu. 10  E nwere ọtụtụ asụsụ n’ụwa, ma, a na-aghọtacha ha niile. 11  Ọ bụrụ na aghọtaghị m ihe onye na-agwa m okwu n’asụsụ ọzọ na-ekwu, m ga-adị ka onye mba ọzọ n’anya ya. 12  Otú ahụkwa ka ọ dị ununwa. Ebe unu na-agbasi mbọ ike ka unu na-eme ihe dị iche iche mmụọ nsọ na-eme ka mmadụ nwee ike ime, na-agbanụ mbọ ka unu na-eme ha nke ọma ka ọ baara ọgbakọ uru.+ 13  N’ihi ya, ka onye na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche kpee ekpere ka o nwee ike ịsụgharị ya.+ 14  Ọ bụrụ na m na-ekpe ekpere n’asụsụ ọzọ, ọ bụghị m na-ekpe ya, kama ọ bụ mmụọ nsọ mere ka m nwee ike ikpe ya. N’ihi ya, aghọtaghị m ihe ahụ m na-ekpe n’ekpere. 15  Gịnịzi ka m ga-eme? M kpewe ekpere, m ga-eme ihe mmụọ nsọ mere ka m nwee ike ime, ma, m ga-ekpe ihe m ga-aghọta. M bụwa abụ m ji eto Chineke, m ga-eme ihe mmụọ nsọ mere ka m nwee ike ime, ma, m ga-abụ ihe m ga-aghọta. 16  Ma ọ́ bụghị ya, ọ bụrụ na mmụọ nsọ mere ka i nwee ike ito Chineke, olee otú onye nkịtị ga-esi asị “Amen” mgbe i kelechara Chineke, ebe ọ na-amaghị ihe i kwuru? 17  N’eziokwu, ị na-ekele Chineke otú dị mma, ma ọ gaghị abara onye ọzọ uru. 18  Ana m ekele Chineke na m na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche karịa unu niile. 19  Ma n’ọgbakọ, m ga-ekwu mkpụrụ okwu ise a ga-aghọta, ka m wee kụziere ndị ọzọ ihe, kama ikwu puku mkpụrụ okwu iri n’asụsụ ọzọ.+ 20  Ụmụnna m, unu echela echiche ka ụmụaka,+ kama bụrụnụ ụmụaka n’ihe gbasara ihe ọjọọ.+ Ma, unu kwesịrị ịna-eche echiche ka dimkpa.+ 21  E dere n’Iwu Mosis, sị: “Jehova* sịrị, ‘M ga-eji ndị na-asụ asụsụ dị iche iche na ndị mba ọzọ gwa ndị a okwu. Ma, ha agaghị achọ ige m ntị.’”+ 22  N’ihi ya, a na-asụ asụsụ dị iche iche ka e jiri ya mee ka ndị na-ekweghị na Jizọs kwere na ya,+ a naghị asụ ha maka ndị kweere na ya. Ma, amụma a na-ebu bụ maka ndị kweere na Jizọs, ọ bụghị maka ndị na-ekweghị na ya. 23  N’ihi ya, ọ bụrụ na ọgbakọ unu abịakọta ọnụ, onye ọ bụla ana-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche, ma, ndị nkịtị ma ọ bụ ndị na-ekweghị na Jizọs abata, ọ̀ bụ na ha agaghị asị na isi adịghị unu mma? 24  Ma, ọ bụrụ na unu niile na-ebu amụma, onye na-ekweghị na Jizọs ma ọ bụ onye nkịtị abata, unu ga-eji ihe unu niile kwuru dọọ ya aka ná ntị, ọ ga-emekwa ka o lezie onwe ya anya nke ọma. 25  Ọ ga-amata ihe zoro ezo dị n’obi ya, nke na ọ ga-egbu ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala, kpọọrọ Chineke isiala, sị: “N’eziokwu, Chineke nọnyeere unu.”+ 26  Ụmụnna m, gịnịzi ka unu ga-eme? Mgbe unu zukọtara, otu onye na-eji abụ eto Chineke, onye ọzọ na-akụzi ihe, onye ọzọ na-ekwu ihe Chineke gwara ya, onye ọzọ na-asụ asụsụ ọzọ, onye ọzọ ana-asụgharị ya, na-akọwakwa ya.+ Ka e mee ihe niile otú ọ ga-abara mmadụ niile uru. 27  Ọ bụrụkwa na ndị mmadụ na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche, ka ọ bụrụ mmadụ abụọ, ma ha akarịla mmadụ atọ, onye kwuchaa, ibe ya ekwuo. Ka otu onye na-asụgharịkwa ihe ha na-ekwu.+ 28  Ma ọ bụrụ na e nweghị onye nsụgharị, ha gbachi nkịtị n’ọgbakọ ma na-agwa Chineke okwu n’obi ha. 29  Ka ndị amụma+ abụọ ma ọ bụ atọ kwuo okwu, ka ndị ọzọ chọpụtakwa ihe ihe ha na-ekwu pụtara. 30  Ma ọ bụrụ na e nwere onye nọ ọdụ ebe ahụ, Chineke agwa ya okwu, ka onye nke na-ekwu okwu mgbe ahụ gbachi nkịtị ka o kwuo. 31  Ka ndị niile na-ebu amụma na-eme ya otú a, otu onye buchaa, ibe ya ebuo, ka mmadụ niile wee mụta ihe, a gbaakwa ha niile ume.+ 32  Ndị mmụọ nsọ mere ka ha na-ebu amụma kwesịrị ịna-ebu amụma n’usoro. 33  N’ihi na Chineke abụghị Chineke aghara, kama nke udo.+ Dị ka ọ dị n’ọgbakọ niile nke ndị nsọ, 34  ka ụmụ nwaanyị na-agbachi nkịtị n’ọgbakọ, n’ihi na e nyeghị ha ike ikwu okwu.+ Kama, ka ha nọrọ n’okpuru ụmụ nwoke,+ otú Iwu Chineke kwuru. 35  Ọ bụrụ na ha chọrọ ịmụta ihe, ha jụọ di ha n’ụlọ, n’ihi na nwaanyị ịgwa ọgbakọ okwu bụ ihe ihere. 36  Okwu Chineke ọ̀ malitere n’aka unu, ka ọ̀ bụ naanị unu ka e nyere ya? 37  Ọ bụrụ na e nwere onye chere na ya bụ onye amụma ma ọ bụ na e nwere ihe mmụọ nsọ nyere ya ike ime, o kwesịrị ikweta na ihe m na-edetara unu bụ ihe Onyenwe anyị nyere n’iwu. 38  Ma ọ bụrụ na e nwere onye na-ejighị ihe a kpọrọ ihe, Chineke agaghịkwa eji onye ahụ kpọrọ ihe.* 39  N’ihi ya, ụmụnna m, na-agbanụ mbọ ka unu na-ebu amụma,+ ma unu egbochikwala onye ọ bụla ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche.+ 40  Ma, na-emenụ ihe niile otú kwesịrị ekwesị nakwa n’usoro.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Jirinụ ịnụ ọkụ n’obi na-achọ.”
Gụọ A5.
O nwere ike ịbụ, “Ma ọ bụrụ na e nwere onye na-achọghị ịghọta ihe a, o mekataghị ghọta ya.”