Ndị Eze nke Mbụ 9:1-28

  • Jehova mere ka Solomọn hụ ya ọzọ ná nrọ (1-9)

  • Onyinye Solomọn nyere Eze Haịram (10-14)

  • Ihe dị iche iche Solomọn rụrụ (15-28)

9  Ozugbo Solomọn rụchara ụlọ Jehova, ụlọ* eze,+ na ihe niile ọ chọrọ ịrụ,+  Jehova mere ka Solomọn hụ ya ná nrọ nke ugboro abụọ, otú ahụ o si mee ka ọ hụ ya na Gibiọn.+  Jehova gwara ya, sị: “Anụla m ekpere gị na arịrịọ ị rịọrọ ka m meere gị amara. Edoola m ụlọ a ị rụrụ nsọ ka a nọrọ na ya na-eto aha m mgbe niile.+ Anya m na obi m ga-adịkwa na ya mgbe niile.+  Ọ bụrụ na i jiri obi gị niile+ jeere m ozi otú Devid nna gị jere,+ kwụwa aka gị ọtọ,+ debe iwu niile m nyere gị,+ mee ihe otú m chọrọ, na-eme ihe ndị m kpebiri,+  m ga-eme ka ocheeze nke alaeze gị n’Izrel sie ike ruo mgbe ebighị ebi, otú m kwere Devid nna gị ná nkwa. M sịrị ya, ‘Ọ dịghị mgbe a na-agaghị enwe onye si n’ezinụlọ gị ga-anọ n’ocheeze Izrel.’+  Ma ọ bụrụ na unu na ụmụ unu agbanwee, kwụsị iso m, kwụsị idebe iwu m, kwụsịkwa iso ntụziaka ndị m nyere unu, gaa fewe chi ọzọ dị iche iche ma kpọwara ha isiala,+  m ga-ala unu n’iyi n’ala a m nyere unu.+ M ga-ebibikwa ụlọ a m ji maka aha m doo nsọ.+ Ndị mba ọzọ niile ga-eji unu mere ihe ọchị,* ha agaghịkwa eji unu kpọrọ ihe.+  Ụlọ a ga-abụzi ụlọ e bibiri ebibi.+ Onye ọ bụla nke na-agafe ya ga-ekporopụ anya na-ele ya, fụọ mkpọrọhịhị, na-asịkwa, ‘Gịnị mere Jehova ji mee ala a na ụlọ a otú a?’+  A ga-asịkwa ya, ‘Ọ bụ n’ihi na ha hapụrụ Jehova bụ́ Chineke ha, onye kpọpụtara ndị nna nna ha n’Ijipt. Ha nabatakwara chi ọzọ dị iche iche, kpọwara ha isiala ma fewe ha. Ọ bụ ya mere Jehova ji mee ka ọdachi a niile dakwasị ha.’”+ 10  Solomọn ji afọ iri abụọ rụchaa ụlọ abụọ ahụ, ya bụ, ụlọ Jehova na ụlọ* eze.+ 11  Haịram+ eze Taya bunyere Solomọn osisi sida na osisi junipa nakwa ọlaedo ole Solomọn chọrọ,+ Eze Solomọn enye Haịram obodo iri abụọ na Galili. 12  N’ihi ya, Haịram si na Taya gawa ịhụ obodo ndị ahụ Solomọn nyere ya, ma ha adịghị ya mma.* 13  Ọ sịrị ya: “Nwanne m, olee ụdị obodo ndị i nyere m ihe a?” A kpọwaziri ala ndị ahụ Ala Kebul* ruo taa. 14  Haịram zigaara Solomọn otu narị talent* ọlaedo na iri abụọ (120).+ 15  Ndị Eze Solomọn manyere ka ha na-arụrụ ya ọrụ+ rụrụ ụlọ Jehova,+ ụlọ nke ya,* Milo,*+ mgbidi Jeruselem, Hezọ,+ Megido,+ na Giza.+ 16  (O nwere oge Fero bụ́ eze Ijipt gara weghara Giza ma gbaa ya ọkụ, gbuokwa ndị Kenan+ bi n’obodo ahụ. O jikwa ya duo nwa ya nwaanyị, bụ́ nwunye Solomọn, ụlọ.)+ 17  Solomọn rụghachiri Giza, Bet-horọn Ndịda,+ 18  Belat,+ na Tema nke dị n’ala ịkpa, n’Izrel,* 19  nakwa obodo niile ọ na-akwasa ihe, obodo ndị a na-adọsa ụgbọ ịnyịnya,+ nakwa obodo ndị ndị na-agba ịnyịnya bi. Solomọn rụkwara ihe ọ bụla ọ chọrọ ịrụ na Jeruselem, Lebanọn, na n’obodo niile ọ na-achị. 20  Ma ndị niile na-abụghị ndị Izrel+ fọrọnụ, ya bụ, ndị Amọraịt, ndị Het, ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt, na ndị Jebus,+ 21  ma ụmụ ha ma ụmụ ụmụ ha ndị fọrọ n’ala ha, ndị ndị Izrel na-enwebeghị ike ibibi, Solomọn manyere ha ka ha na-agbara ya ohu ruo taa.+ 22  Ma, o nweghị onye Izrel ọ bụla Solomọn kpọọrọ ka ọ na-agbara ya ohu,+ n’ihi na ọ bụ ha bụ ndị agha ya, ndị na-ejere ya ozi, ndị o mere ndị isi, ndị na-esote ndị isi agha ya, na ndị isi nke ndị na-agba ụgbọ ịnyịnya ya nakwa ndị isi nke ndị na-agba ịnyịnya ya. 23  Ndị isi nke ndị na-enyere Solomọn aka dị narị mmadụ ise na iri ise (550). Ha bụ ndị isi nke ndị na-arụ ọrụ.+ 24  Ma, nwa Fero+ si n’Obodo Devid pụta+ ma gaa n’ụlọ Solomọn rụụrụ ya. Mgbe ahụzi ka Solomọn rụrụ Milo.*+ 25  Solomọn na-achụ àjà a na-esu ọkụ na àjà udo ugboro atọ n’afọ+ n’elu ebe ịchụàjà ahụ ọ rụụrụ Jehova.+ Otú ahụ ka o si na-esu àjà ọkụ n’ebe ịchụàjà dị n’ihu Jehova. Ọ rụchakwara ụlọ ahụ.+ 26  Eze Solomọn rụkwara ọtụtụ ụgbọ mmiri n’Iziọn-giba,+ nke dị nso n’Ilọt, n’ụsọ Oké Osimiri Uhie, n’Ịdọm.+ 27  Haịram ziri ndị na-ejere ya ozi, ndị bụ́ aka ochie n’ịkwọ ụgbọ mmiri, ka ha na ndị na-ejere Solomọn ozi soro na-akwọ ụgbọ mmiri ndị ahụ.+ 28  Ha gara Ofa+ buru narị talent ọlaedo anọ na iri abụọ (420) butere Eze Solomọn.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “obí.”
Na Hibru, “ga-eji unu na-atụ ilu.”
Ma ọ bụ “obí.”
Na Hibru, “ha adịghị mma n’anya ya.”
O nwere ike ịbụ, “Ala Na-abaghị Uru Ọ Bụla.”
Otu talent bụ kilogram 34.2. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “obí ya.”
Ọ bụ okwu Hibru nke pụtara “ebe e kpojuru ájá, ya adị mkputamkpu.”
Na Hibru, “n’ala ahụ.”
Ọ bụ okwu Hibru nke pụtara “ebe e kpojuru ájá, ya adị mkputamkpu.”