Ndị Eze nke Mbụ 8:1-66

  • E bubatara igbe ọgbụgba ndụ n’ụlọ nsọ (1-13)

  • Solomọn gwara ndị Izrel okwu (14-21)

  • Ekpere Solomọn kpere iji nyefee Chineke ụlọ nsọ ya (22-53)

  • Solomọn gọziri ndị Izrel (54-61)

  • A chụrụ àjà, meekwa ememme e ji nyefee Chineke ụlọ nsọ ya (62-66)

8  N’oge ahụ, Solomọn kpọkọrọ+ ndị okenye Izrel, ya bụ, ndị isi niile nke ebo dị iche iche, na ndị isi ọnụmara dị iche iche n’Izrel.+ Ha gakwuuru Eze Solomọn na Jeruselem iji si n’Obodo Devid,+ ya bụ, Zayọn,+ buru igbe ọgbụgba ndụ Jehova bute n’ụlọ nsọ.  Ndị Izrel niile gbakọrọ na nke Eze Solomọn n’oge ememme* a na-eme n’ọnwa Etanim,* ya bụ, ọnwa nke asaa.+  Mgbe ndị okenye niile n’Izrel bịara, ndị nchụàjà buuru Igbe ahụ.+  Ọ bụ ha butere Igbe Jehova, ụlọikwuu nzute,+ nakwa arịa niile dị nsọ dị n’ụlọikwuu ahụ. Ọ bụ ndị nchụàjà na ndị Livaị* butere ha.  Eze Solomọn na ndị Izrel niile a kpọrọ ka ha bịa nnọkọ ahụ nọ n’ihu Igbe ahụ. Atụrụ na ehi a chụrụ n’àjà+ karịkwara akarị nke na e nweghị ike ịgụta ha ọnụ.  Ndị nchụàjà bubataziri igbe ọgbụgba ndụ Jehova n’ebe ọ ga na-adị,+ n’ọnụ ụlọ dị n’ime ime ụlọ ahụ, ya bụ, n’Ebe Kacha Nsọ, n’okpuru nku cherob ndị ahụ.+  Otú a ka e si dọsa Igbe ahụ n’okpuru nku cherob ndị ahụ gbasara agbasa, nke na cherob ndị ahụ kpuchiri Igbe ahụ na okporo osisi e ji ebu ya.+  Okporo osisi ndị ahụ+ dị ogologo, nke na onye nọ n’Ebe Nsọ, n’ihu Ebe Kacha Nsọ, na-ahụ ọnụ ọnụ ha, ma onye nọ n’èzí anaghị ahụ ha. Ha dịkwa ebe ahụ ruo taa.  Naanị ihe dị n’ime Igbe ahụ bụ mbadamba nkume abụọ+ Mosis tinyere n’ime ya+ na Horeb. O tinyere ha mgbe Jehova na ndị Izrel gbara ndụ,+ n’oge ha si n’Ijipt na-apụta.+ 10  Mgbe ndị nchụàjà si n’ebe nsọ pụta, ígwé ojii+ bịara ju n’ụlọ Jehova.+ 11  Ígwé ojii ahụ mere ka ndị nchụàjà gharazie ije ozi ha, n’ihi na ebube Jehova juru n’ụlọ Jehova.+ 12  Solomọn kwuru n’oge ahụ, sị: “Jehova, i kwuru na ị ga-ebi n’ígwé ojii.+ 13  M rụọlara gị nnukwu ụlọ ka ọ bụrụ ebe ị ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.”+ 14  Ka ndị Izrel niile guzo ọtọ, eze tụgharịrị, chee ha ihu ma gọzie ha.+ 15  O kwukwara, sị: “Ka e too Jehova bụ́ Chineke Izrel, onye ji ọnụ ya kwe Devid nna m nkwa, jirikwa aka ya mezuo ya ma sị, 16  ‘Malite n’ụbọchị m si n’Ijipt kpọpụta ndị Izrel bụ́ ndị m, ọ dịghị obodo m họọrọ n’ebo niile n’Izrel ka a rụọ ụlọ a ga-anọ na-eto aha m.+ Ma, ahọrọla m Devid ka ọ chịwa ndị Izrel bụ́ ndị m.’ 17  Ọ dị Devid nna m n’obi ịrụ ụlọ a ga-anọ na-eto aha Jehova bụ́ Chineke Izrel.+ 18  Ma Jehova gwara Devid nna m, sị, ‘Ị gbalịala, ebe ọ bụ na ọ dị gị n’obi ịrụ ụlọ a ga-anọ na-eto aha m. 19  Ma, ọ bụghị gị ga-arụ ụlọ ahụ. Kama, ọ bụ nwa a ga-amụrụ gị* ga-arụ ụlọ ahụ a ga-anọ na-eto aha m.’+ 20  Jehova emezuokwala nkwa o kwere, n’ihi na anọchiela m Devid nna m, m nọkwa n’ocheeze Izrel, otú Jehova kwere ná nkwa. Arụọkwala m ụlọ a ga-anọ na-eto aha Jehova bụ́ Chineke Izrel.+ 21  Ọ bụkwa n’ime ụlọ a ka m rụrụ ebe a ga-adọsa Igbe e tinyere mbadamba nkume ndị e dere ọgbụgba ndụ+ Jehova na nna nna anyị hà gbara mgbe o si n’Ijipt na-akpọpụta ha.” 22  Solomọn bịaziri guzoro n’ihu ebe ịchụàjà Jehova, n’ihu ndị Izrel niile, gbasaa aka ya abụọ chee ha n’eluigwe.+ 23  O kwuziri, sị: “Jehova bụ́ Chineke Izrel, ọ dịghị Chi dị ka gị+ n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa. Gị na mmadụ gbaa ndụ, ị na-emezu ihe unu kwekọrịtara. Ị na-egosikwa ndị ohu gị na ị hụrụ ha n’anya,*+ ya bụ, ndị ji obi ha niile na-eme ihe i kwuru.+ 24  I mezuola nkwa i kwere ohu gị Devid bụ́ nna m. I ji ọnụ gị kwe ya nkwa a. I jirikwala aka gị mezuo ya taa.+ 25  Ugbu a, Jehova bụ́ Chineke Izrel, mezuokwa nkwa a i kwere ohu gị Devid bụ́ nna m. I kwere ya nkwa, sị: ‘Ọ bụrụhaala na ụmụ gị ejisie ike na-edebe iwu m otú gịnwa debere, ọ dịghị mgbe a na-agaghị enwe onye si n’ezinụlọ gị ga-anọ n’ocheeze Izrel.’+ 26  Ugbu a, Chineke Izrel, biko, mezuo nkwa i kwere ohu gị Devid bụ́ nna m. 27  “Ma Chineke ọ̀ ga-ebi n’ụwa n’eziokwu?+ Eluigwe, ya bụ, eluigwe niile, enweghị ike ịba gị,+ ma ya fọdụzie ụlọ a m rụrụ.+ 28  Jehova bụ́ Chineke m, biko, gee ntị n’ekpere ohu gị na-ekpe nakwa n’arịrịọ ọ na-arịọ ka i meere ya amara. Nụkwa ákwá ohu gị na-ebesara gị ka i nyere ya aka na ekpere ọ na-ekpe n’ihu gị taa. 29  Biko, ka anya gị dịrị n’ụlọ a ehihie na abalị, n’ebe a i kwuru gbasara ya, sị, ‘Aha m ga-adịgide na ya.’+ Geekwa ntị n’ekpere ohu gị chere ihu ebe a na-ekpe.+ 30  Biko, nụrụ arịrịọ ohu gị na-arịọ gị ka i meere ya amara, nụrụkwa nke ndị Izrel bụ́ ndị gị ga-eche ihu ebe a na-arịọ. Nọrọ n’eluigwe ebe i bi nụ ya.+ Biko, nụ ya ma gbaghara.+ 31  “Ọ bụrụ na mmadụ emehie mmadụ ibe ya, e meekwa ka ọ ṅụọ iyi,* ya abịakwa n’ihu ebe ịchụàjà gị dị n’ụlọ a ka ọ ṅụọ iyi,+ 32  biko, nọrọ n’eluigwe nụrụ, meekwa ihe gbasara ya. Kpeere ndị ohu gị ikpe. Mee ka onye ajọ omume buru ihe o metara, ka ọ bụrụ ụgwọ ọrụ ya. Kwuokwa na aka onye ezi omume dị ọcha,* kwụọkwa ya ụgwọ maka ezi omume ya.+ 33  “Ọ bụrụ na ndị iro emerie ndị Izrel bụ́ ndị gị n’ihi na ha na-emehie gị,+ ha emechaa lọghachikwute gị ma bịa nọrọ n’ụlọ a too aha gị,+ kpee ekpere, rịọkwa gị arịrịọ ka i meere ha amara,+ 34  biko, nọrọ n’eluigwe nụrụ arịrịọ ha, gbaghara mmehie ndị Izrel bụ́ ndị gị, ma kpọghachi ha n’ala i nyere ndị nna nna ha.+ 35  “Ọ bụrụ na eluigwe akpọchie, mmiri akwụsịkwa izo+ n’ihi na ndị Izrel nọ na-emehie gị,+ ha chee ihu ebe a kpee ekpere, too aha gị, hapụkwa mmehie ha maka na i menyela ha ihere,*+ 36  biko, nọrọ n’eluigwe nụrụ arịrịọ ha, gbagharakwa mmehie ndị ohu gị, ya bụ, ndị Izrel bụ́ ndị gị. Zi ha+ ụzọ dị mma ha kwesịrị iso, meekwa ka mmiri zoo n’ala gị+ nke i nyere ndị gị ka ọ bụrụ nke ha. 37  “Ọ bụrụ na ụnwụ adaa n’ala a,+ ma ọ bụ e nwee ọrịa na-efe efe, ma ọ bụ, ọ bụrụ na ihe ndị gị kụrụ n’ubi akpọnwụọ, ma ọ bụ ihe ndị ha nwere amaa ebu,+ ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na igurube ma ọ bụ ụkpara ebibie ihe ndị ha kụrụ n’ubi, ma ọ bụ, ọ bụrụ na ndị iro ha anọchibido ha n’obodo ha ọ bụla,* ma ọ bụ, ha ana-ata ụdị ahụhụ ọ bụla ma ọ bụ na-arịa ụdị ọrịa ọ bụla,+ 38  ọ bụrụ na otu onye n’ime ha ma ọ bụ ha niile bụ́ ndị gị agbasaa aka chee ụlọ a ihu kpee ekpere ma ọ bụ rịọ gị ka i meere ha amara,+ (n’ihi na onye ọ bụla ma ihe na-enye ya nsogbu n’obi),+ 39  biko, nọrọ n’eluigwe ebe i bi+ nụrụ, gbaghara+ ma nyere ha aka. Kwụọkwa onye ọ bụla ụgwọ otú o si kpaa àgwà,+ n’ihi na ị ma obi onye ọ bụla (n’eziokwu, ọ bụ naanị gị ma obi ndị mmadụ).+ 40  Ihe a ga-eme ka ha na-atụ egwu gị ụbọchị niile ha dị ndụ n’ala i nyere nna nna anyị hà. 41  “Ọ bụrụkwa na onye mba ọzọ, onye na-abụghị onye Izrel, onye sikwa n’obodo dị anya bịa n’ihi aha gị+ 42  (n’ihi na ha ga-anụ gbasara aha gị dị ebube,+ aka gị siri ike, na ike gị), abịa chee ihu n’ụlọ a kpee ekpere, 43  biko, nọrọ n’eluigwe ebe i bi nụ ekpere ya,+ meekwara ya ihe niile ọ na-arịọ gị, ka ndị niile nọ n’ụwa wee mara aha gị, na-atụkwa egwu gị+ otú ndị Izrel bụ́ ndị gị na-eme, ka ha wee marakwa na m rụrụ ụlọ a ka a nọrọ na-eto aha gị. 44  “Ọ bụrụ na ndị gị agaa ịlụso ndị iro ha agha n’ebe ị sị ha gaa,+ ha echeekwa ihu n’obodo a ị họọrọ+ nakwa n’ụlọ a m rụrụ ka a nọrọ na-eto aha gị,+ rịọ gịnwa bụ́ Jehova ka i nyere ha aka,+ 45  nọrọ n’eluigwe nụrụ ekpere ha na arịrịọ ha na-arịọ ka i meere ha amara, mesookwa ha otú dị mma. 46  “Ọ bụrụ na ha emehie gị (n’ihi na ọ dịghị mmadụ ọ bụla na-anaghị eme mmehie),+ gị ewesa ha ezigbo iwe, nyefeekwa ha n’aka ndị iro, ndị meriri ha adọrọkwa ha n’agha laa ebe dị nso ma ọ bụ ebe dị anya,+ 47  anya emechaakwa doo ha ebe ahụ a dọọrọ ha n’agha laa,+ ha alọghachikwute gị+ ma rịọ gị ka i meere ha amara n’obodo ndị dọọrọ ha n’agha,+ ha asịkwa, ‘Anyị emehiela, anyị emejọọla, anyị akpaala àgwà ọjọọ,’+ 48  ha anọrọkwa n’obodo ndị iro ha dọọrọ ha n’agha, jiri obi ha niile na mkpụrụ obi* ha niile lọghachikwute gị,+ ha echeekwa ihu n’ụlọ a m rụrụ ka a nọrọ na-eto aha gị, nke dị n’ala i nyere ndị nna nna ha nakwa n’obodo ị họọrọ, rịọ gị ka i nyere ha aka,+ 49  biko, nọrọ n’eluigwe, ebe i bi,+ nụrụ ekpere ha na arịrịọ ha na-arịọ ka i meere ha amara, mesookwa ha otú dị mma. 50  Gbaghara ndị gị mehiere gị. Gbaghara ha mmehie niile ha mere. Meekwa ka ndị dọọrọ ha n’agha lewe ha anya ka ndị e kwesịrị imere ebere. Ha ga-emekwara ha ebere+ 51  (n’ihi na ha bụ ndị gị na ndị i ketara,+ ndị i si n’Ijipt, n’ọkụ na-agbaze ígwè,+ kpọpụta).+ 52  Biko, gee ntị n’arịrịọ ohu gị na-arịọ ka i meere ya amara.+ Mgbe ọ bụla ndị Izrel bụ́ ndị gị rịọrọ gị ka i meere ha amara, biko, geekwa ha ntị.*+ 53  N’ihi na i mere ka ha dị iche, bụrụ ndị nke gị n’ime ndị niile nọ n’ụwa,+ otú gịnwa, bụ́ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, si n’ọnụ Mosis bụ́ ohu gị kwuo mgbe i si n’Ijipt na-akpọpụta nna nna anyị hà.” 54  Ozugbo Solomọn kpechara ekpere a niile, rịọkwa Jehova ka o meere ya amara, o si n’ihu ebe ịchụàjà Jehova bilie. Ebe ahụ ka o gburu ikpere n’ala kemgbe, gbasaakwa aka ya abụọ chee n’eluigwe.+ 55  Ọ kwụụrụ ọtọ, jirikwa olu dara ụda gọzie ndị Izrel niile gbakọrọnụ. Ọ sịrị: 56  “Ka otuto dịrị Jehova, onye mere ka ndị Izrel bụ́ ndị ya biri n’udo otú o kwere ná nkwa.+ O nweghị otu n’ime ọmarịcha nkwa niile o si n’ọnụ Mosis bụ́ ohu ya kwe nke na-emezubeghị.+ 57  Ka Jehova bụ́ Chineke anyị nọnyere anyị otú ọ nọnyeere nna nna anyị hà.+ Ya ahapụla anyị, ya agbahapụkwala anyị.+ 58  Ya mee ka obi anyị dịrị ebe ọ nọ,+ ka anyị nwee ike na-eso ụzọ ya niile, na-eme ihe ndị o kpebiri, na-edebe iwu ya, na-emekwa ihe ndị o kwuru, bụ́ ihe ndị ọ gwara nna nna anyị hà ka ha na-eme. 59  Ka arịrịọ niile a m rịọrọ Jehova ka o meere m amara dịrị Jehova bụ́ Chineke anyị n’obi ehihie na abalị, ka o wee mesoo ohu ya na ndị Izrel bụ́ ndị ya otú dị mma kwa ụbọchị. 60  Ọ ga-eme ka ndị niile nọ n’ụwa mara na Jehova bụ ezi Chineke.+ Ọ dịghị Chineke ọzọ dịnụ.+ 61  N’ihi ya, jirinụ obi unu niile+ na-efe Jehova bụ́ Chineke anyị. Otú unu ga-esi na-eme ya bụ ịna-eso ntụziaka ya na ịna-edebe iwu ya otú unu na-eme taa.” 62  Eze na ndị Izrel niile chụụrụ Jehova ọtụtụ àjà.+ 63  Solomọn chụụrụ Jehova àjà udo.+ Ihe o ji chụọ ya bụ puku ehi iri abụọ na puku abụọ (22,000) nakwa otu narị puku atụrụ na puku iri abụọ (120,000). Otú a ka eze na ndị Izrel niile si nyefee Jehova ụlọ ahụ.+ 64  N’ụbọchị ahụ, eze doro etiti ogige nke dị n’ihu ụlọ Jehova nsọ n’ihi na ọ chọrọ ịnọ ebe ahụ chụọ àjà a na-esu ọkụ na àjà ọka, jirikwa abụba si n’anụ e ji chụọ àjà udo chụọ àjà. Ọ chọrọ ịnọ ebe ahụ chụọ àjà maka na ebe ịchụàjà e ji ọla kọpa rụọ,+ nke dị n’ihu ụlọ nsọ Jehova, dị nnọọ obere ịnọ chụọ àjà a na-esu ọkụ, àjà ọka, na àjà udo e ji abụba+ achụ. 65  N’oge ahụ, Solomọn na ndị Izrel niile nọ n’ihu Jehova bụ́ Chineke anyị mee ememme+ ụbọchị asaa nakwa ụbọchị asaa ọzọ, ya bụ, ụbọchị iri na anọ. Ndị gbakọrọnụ hiri nne, malite na Libo-hemat* ruo na Ndagwurugwu* Ijipt.+ 66  N’ụbọchị na-esonụ,* ọ gwara mmadụ niile ka ha lawa, ha agọzie eze, laakwa n’ụlọ ha dị iche iche. Obi nọkwa na-atọ ha ụtọ, ha ana-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihi ihe ọma niile+ Jehova meere Devid bụ́ ohu ya na ndị Izrel bụ́ ndị ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, Ememme Ụlọ Ndò.
Gụọ B15.
Ma ọ bụ “ndị nchụàjà bụ́ ndị Livaị.”
Na Hibru, “nwa gị, nke ga-esi n’úkwù gị pụta.”
Ma ọ bụ “Ị na-egosikwa ndị ohu gị ịhụnanya pụrụ iche.”
Ịṅụ iyi a na-ekwu okwu ya ebe a bụ nke a na-ata onye ṅụrụ ya ahụhụ ma ihe o kwuru abụghị eziokwu ma ọ bụkwanụ ma ọ bụrụ na o meghị ihe ọ ṅụrụ iyi na ọ ga-eme.
Na Hibru, “Kpọọkwa onye ezi omume onye ezi omume.”
Ma ọ bụ “ị taala ha ahụhụ.”
Ma ọ bụ “n’ọnụ ụzọ ámá obodo ha.”
Ma ọ bụ “biko, meekwara ndị Izrel bụ́ ndị gị ihe ọ bụla ha rịọrọ gị.”
Ma ọ bụ “n’ebe e si abanye Hemat.”
Na Hibru, “N’ụbọchị nke asatọ,” ya bụ, ụbọchị na-eso ụbọchị nke iri na anọ.