Ndị Eze nke Mbụ 17:1-24

  • Ịlaịja buru amụma na mmiri agaghị ezo n’Izrel (1)

  • Ugoloọma nọ na-ewetara Ịlaịja nri (2-7)

  • Ịlaịja gara na nke otu nwaanyị isi mkpe na Zarefat (8-16)

  • Nwa otu nwaanyị isi mkpe nwụrụ, a kpọlite ya n’ọnwụ (17-24)

17  Ịlaịja,*+ onye Tishbe, nke dị na Gilied,+ wee sị Ehab: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke Izrel dị ndụ, onye m na-efe,* na-aṅụ iyi na igirigi agaghị ada, mmiri agaghịkwa ezo ruo afọ ole na ole, ọ gwụkwala ma m̀ kwuru ka o zoo.”+  Jehova gwaziri Ịlaịja, sị:  “Si ebe a gaa ebe ọwụwa anyanwụ ma zoo na Ndagwurugwu* Kirit, nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan.  Na-aṅụ mmiri dị na ndagwurugwu ahụ. M ga-ezikwa ugoloọma ka ha na-ewetara gị nri ebe ahụ.”+  Ọ gara ozugbo mee ihe Jehova kwuru. Ọ gara nọrọ n’akụkụ Ndagwurugwu* Kirit, nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan.  Ugoloọma na-ewetakwara ya achịcha na anụ n’ụtụtụ nakwa achịcha na anụ n’anyasị. Ọ na-aṅụkwa mmiri dị na ndagwurugwu ahụ.+  Ma, ka oge na-aga, mmiri dị na ndagwurugwu ahụ tara,+ n’ihi na mmiri kwụsịrị izo n’obodo ahụ.  Jehova gwaziri Ịlaịja, sị:  “Bilie gaa Zarefat dị na Saịdọn, nọrọkwa ebe ahụ. M ga-agwa otu nwaanyị isi mkpe nọ ebe ahụ ka ọ na-enye gị nri.”+ 10  O biliziri gawa Zarefat. Mgbe o rutere n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ, ọ hụrụ otu nwaanyị isi mkpe nọ ebe ahụ na-akpa nkụ. Ọ kpọrọ ya, sị ya: “Biko, kutetụrụ m mmiri ka m ṅụọ.”+ 11  Mgbe ọ gawara ikute ya, ọ kpọrọ ya, sị ya: “Biko, wetatụkwara m achịcha.” 12  Nwaanyị ahụ wee sị ya: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke gị, onye dị ndụ, na-aṅụ iyi na enweghị m achịcha ọ bụla, ma e wezụga obere ntụ ọka dị ná nnukwu ite nakwa obere mmanụ dị n’obere ite.+ M na-akpata obere nkụ. M ga-agakwa mee achịcha mụ na nwa m ga-ata. Anyị tachaa, anyị echerezie ọnwụ.” 13  Ịlaịja asị ya: “Atụla egwu. Gaa mee ihe i kwuru. Kama buru ụzọ si ná ntụ ọka ahụ mee obere achịcha wetara m, gị agazie mee nke gị na nwa gị ga-ata. 14  Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, sị: ‘Ntụ ọka ahụ dị ná nnukwu ite agaghị agwụ. Mmanụ ahụ dị n’obere ite agaghịkwa agwụ ruo ụbọchị Jehova ga-eme ka mmiri zoo.’”+ 15  Nwaanyị ahụ gaziri mee ihe Ịlaịja gwara ya, nke mere na ya na ezinụlọ ya na Ịlaịja nwere nri ha nọ na-eri ruo ọtụtụ ụbọchị.+ 16  Ntụ ọka ahụ dị ná nnukwu ite agwụghị, mmanụ ahụ dị n’obere ite agwụghịkwa, otú Jehova si n’ọnụ Ịlaịja kwuo. 17  Mgbe ihe ndị a mechara, nwa nwaanyị ahụ dara ọrịa. Ọrịa ahụ mechakwara ka njọ, nke na o gburu ya.+ 18  Nwaanyị ahụ wee sị Ịlaịja: “Onye nke ezi Chineke, gịnị ka m mere gị?* Ị̀ bịara ebe a ka i chetara m mmehie m, gbuokwa nwa m nwoke?”+ 19  Ma Ịlaịja sịrị ya: “Kunye m nwa gị.” O kunyere ya nwa ahụ, ya ekuru ya gbagoo n’ọnụ ụlọ dị n’elu, bụ́ ebe o bi, nyiwe ya n’àkwà* ya.+ 20  Ọ kpọkukwara Jehova, sị: “Jehova bụ́ Chineke m,+ gịnịkwanụ mere i ji mee nwaanyị isi mkpe a m bi n’ụlọ ya ihe a, kwe ka nwa ya nwụọ?” 21  O hulataziri n’elu nwa ahụ ugboro atọ ma kpọkuo Jehova, sị: “Jehova bụ́ Chineke m, biko, mee ka nwatakịrị a dịghachi ndụ.” 22  Jehova nụkwara arịrịọ Ịlaịja,+ nwatakịrị ahụ adịrịghachi ndụ.+ 23  Ịlaịja akpọrọzie nwa ahụ, si n’ọnụ ụlọ ahụ dị n’elu kpọdata ya, banye n’ọnụ ụlọ ha ma kpọnye ya nne ya, sị: “Lekwa nwa gị. Ọ dịla ndụ.”+ 24  Nwaanyị ahụ asị Ịlaịja: “Ugbu a ka m matara na ị bụ onye nke Chineke n’eziokwu+ nakwa na ihe Jehova gwara gị kwuo bụ eziokwu.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ịlaịja pụtara “Chineke M Bụ Jehova.”
Na Hibru, “onye m guzo n’ihu ya.”
Ma ọ bụ “gịnị jikọrọ mụ na gị?”
Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”