Ndị Eze nke Mbụ 12:1-33

  • Rehoboam gwara ndị Izrel okwu ọjọọ (1-15)

  • Ebo iri nupụụrụ Rehoboam isi (16-19)

  • E chiri Jeroboam eze Izrel (20)

  • A gwara Rehoboam ka ọ ghara ịlụso ndị Izrel agha (21-24)

  • Jeroboam kpụrụ nwa ehi ọlaedo a na-efe ofufe (25-33)

12  Rehoboam gawara Shikem, n’ihi na ndị Izrel niile gara Shikem+ ka ha chie ya eze.+  Ozugbo Jeroboam nwa Nibat nụrụ ya (ọ ka nọ n’Ijipt n’oge ahụ n’ihi na ọ gbagara ebe ahụ maka Eze Solomọn, o bikwa n’Ijipt),+  ndị Izrel ziri ya ozi ka ọ bịa. Mgbe ọ bịara, ya na ndị Izrel niile bịara gwa Rehoboam, sị:  “Nna gị boro anyị ibu arọ.+ Ma, ọ bụrụ na i mee ka ihe dịtụrụ anyị mfe n’ọrụ siri ike nna gị nyere anyị, meekwa ka ibu* o boro anyị dị mfe, anyị ga na-ejere gị ozi.”  Ya asị ha: “Laanụ, bịaghachinụ n’abalị atọ taa.” Ha wee lawa.+  Eze Rehoboam wee kpọọ ndị okenye, ndị jeere Solomọn nna ya ozi mgbe ọ dị ndụ, ka ha tụọrọ ya aro ihe ọ ga-eme. Ọ sịrị ha: “Gịnị ka m ga-aza ndị a?”  Ha asị ya: “Ọ bụrụ na i bido taa na-eme ka ị̀ bụ ohu ndị a, na-emere ha ihe ha rịọrọ gị, zaakwa ha ihe dị mma, ha ga na-ejere gị ozi mgbe niile.”  Ma, ọ nabataghị aro a ndị okenye ahụ tụụrụ ya. Ọ kpọrọ ụmụ okorobịa na-ejere ya ozi, ndị ya na ha tokọrọ, ka ha tụọrọ ya aro.+  Ọ jụrụ ha, sị: “Gịnị ka anyị ga-aza ndị a bịara gwa m, sị, ‘Mee ka ibu* nna gị boro anyị dị mfe’?” 10  Ụmụ okorobịa ahụ ya na ha tokọrọ asị ya: “Ebe ọ bụ na ha sịrị gị, ‘Nna gị mere ka ibu anyị dị arọ, gịnwa mee ka ọ dịrị anyị mfe,’ ihe a ka ị ga-agwa ha, ‘Mkpịsị aka m nke ntakịrị ga-adị okpotokpo karịa úkwù nna m. 11  Nna m boro unu ibu arọ, ma m ga-atụkwasị ihe n’ibu unu. Nna m pịara unu ụtarị nkịtị, ma m ga-apịa unu ụtarị na-emerụsị mmadụ ahụ́.’” 12  Jeroboam na ndị Izrel niile bịakwutere Rehoboam n’ụbọchị nke atọ, otú ahụ eze gwara ha ka ha bịaghachi n’ụbọchị nke atọ.+ 13  Ma eze ji olu ike gwa ha okwu. Otú a ka o si hapụ aro ndị okenye tụụrụ ya. 14  Ọ gwara ha ihe ụmụ okorobịa ahụ tụụrụ ya aro ka ọ gwa ha. Ọ gwara ha, sị: “Nna m mere ka ibu unu dị arọ, ma m ga-atụkwasị ihe n’ibu unu. Nna m pịara unu ụtarị nkịtị, ma m ga-apịa unu ụtarị na-emerụsị mmadụ ahụ́.” 15  Otú a ka eze si hapụ ime ihe ndị Izrel rịọrọ ya. Ọ bụ Jehova mere ka ọ hapụ ime ya,+ ka Jehova wee mezuo ihe o si n’ọnụ Ahaịja+ onye Shaịlo gwa Jeroboam nwa Nibat. 16  Mgbe ndị Izrel niile hụrụ na eze emeghị ihe ha rịọrọ ya, ha sịrị ya: “Gịnị jikọrọ anyị na Devid? E nweghị ihe nwa Jesi anyị ga-eketa. Ndị Izrel, onye ọ bụla gaa fewe chi ya. Devid, lekọtawa ụlọ gị.” Ndị Izrel wee laa n’ụlọ* ha.+ 17  Ma Rehoboam nọ na-achị ndị Izrel bi n’obodo ndị dị n’ebo Juda.+ 18  Eze Rehoboam ziri Adoram,+ onye na-elekọta ndị eze manyere ka ha na-arụrụ ya ọrụ, ka ọ gaa hụ ndị Izrel, ma ha ji nkume tụgbuo ya. Eze Rehoboam jisiri ike rịgoro n’ụgbọ ịnyịnya ya gbalaa Jeruselem.+ 19  Ndị Izrel nọkwa na-enupụrụ ndị ezinụlọ Devid isi+ ruo taa. 20  Ozugbo ndị Izrel niile nụrụ na Jeroboam alọghachila, ha kpọrọ ya ka ọ bịa nzukọ ha, ya abịa, ha emee ya eze ndị Izrel niile.+ Naanị ebo Juda kwadosiri ọchịchị ndị ezinụlọ Devid ike.+ 21  Ozugbo Rehoboam lọrutere Jeruselem, ọ kpọkọrọ otu narị puku na puku iri asatọ (180,000) ndị agha a zụrụ azụ,* bụ́ ndị Juda na ndị Benjamin, ka ha gaa lụso ndị Izrel ndị ọzọ agha, ka Rehoboam nwa Solomọn nwee ike nwetaghachi alaeze ahụ niile.+ 22  Ezi Chineke wee gwa Shemaya,+ onye nke ezi Chineke, sị: 23  “Gwa Rehoboam nwa Solomọn eze Juda na ndị Juda na ndị Benjamin niile nakwa ndị fọdụrụ, sị, 24  ‘Jehova kwuru, sị: “Unu agala ịlụso ndị Izrel, bụ́ ụmụnne unu, agha. Onye ọ bụla n’ime unu laghachi n’ụlọ ya, n’ihi na ọ bụ m mere ihe a ji na-eme.”’”+ Ha wee mee ihe Jehova kwuru, laghachi n’ụlọ ha otú Jehova kwuru. 25  Jeroboam gara rụsie Shikem ike+ ma biri na ya. Ebe ahụ dị n’ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu. O sikwa ebe ahụ pụta gaa rụsie Penuel ike.+ 26  Jeroboam sịkwara n’obi ya: “Alaeze a nwekwanụrụ ike imecha laghachi n’aka ezinụlọ Devid.+ 27  Ọ bụrụ na ndị a ana-aga achụ àjà n’ụlọ Jehova dị na Jeruselem,+ obi ha ga-adị ọzọ n’ebe Rehoboam eze Juda, bụ́ onyenwe ha, nọ. Ha ga-egbuzi m ma laghachikwuru ya.” 28  Mgbe eze na ndị na-adụ ya ọdụ kparịtachara, ọ kpụrụ nwa ehi ọlaedo abụọ+ ma gwa ndị Izrel, sị: “Ịna-aga Jeruselem ga na-enye unu ezigbo nsogbu. Lekwanụ Chineke unu, onye si n’Ijipt kpọpụta unu.”+ 29  O dowere otu nwa ehi ọlaedo ahụ na Betel,+ dowe nke ọzọ na Dan.+ 30  Ihe a mere ka ndị Izrel mehie.+ Ha na-agaruchakwa Dan efe nke dị ebe ahụ. 31  Jeroboam rụgasịrị ụlọ n’ebe ndị dị elu ka a nọrọ na ha na-efe chi dị iche iche. Ọ họpụtakwara ndị nkịtị na-abụghị ndị Livaị ka ha bụrụ ndị nchụàjà.+ 32  Jeroboam mekwara ka a malite ime otu ememme n’abalị iri na ise n’ọnwa nke asatọ. A na-eme ụdị ememme a na Juda.+ Ọ nọkwa n’elu ebe ịchụàjà ọ rụrụ na Betel+ chụọrọ ụmụ ehi ndị ọ kpụrụ àjà. Ọ họpụtakwara ndị nchụàjà ga na-eje ozi n’ebe ndị dị elu ọ rụrụ na Betel. 33  Ọ malitere ịnọ n’elu ebe ịchụ àjà ahụ ọ rụrụ na Betel achụ àjà n’abalị iri na ise n’ọnwa nke asatọ. O chepụtara ọnwa a n’onwe ya. O hiweere ndị Izrel ememme ha ga na-eme, gaakwa nọrọ n’elu ebe ịchụàjà na-esu àjà ọkụ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “yok dị arọ.”
Ma ọ bụ “yok.”
Na Hibru, “n’ụlọikwuu.”
Na Hibru, “a họrọ ahọ.”