Ndị Eze nke Mbụ 10:1-29

  • Eze nwaanyị Shiba gara na nke Solomọn (1-13)

  • Akụnụba Solomọn enweghị atụ (14-29)

10  Mgbe eze nwaanyị Shiba nụrụ akụkọ Solomọn, nụkwa na ude ọ na-ede mere ka a na-eto aha Jehova,+ ọ bịara ka ọ jụọ ya ajụjụ ndị tara akpụ ka ọ mara ma ọ̀ ga-azata ha.+  Ọtụtụ mmadụ so ya bịa Jeruselem.+ Ha jikwa kamel dị iche iche buru mmanụ balsam,+ ọtụtụ ọlaedo, na nkume ndị dị oké ọnụ.* Ọ gakwuuru Solomọn jụọ ya ihe niile ọ chọrọ ịjụ ya.  Solomọn zakwara ya ajụjụ niile ọ jụrụ ya. O nweghị ihe ọ bụla nwaanyị ahụ jụrụ ya siiri ya ike ịza.  Mgbe eze nwaanyị Shiba hụrụ otú Solomọn si mara ihe,+ hụkwa ụlọ ọ rụrụ,+  o riri ya ọnụ. Ihe ndị ọzọ ọ hụrụ riri ya ọnụ bụ nri a na-adọsara Solomọn na tebụl,+ otú e si hazie ndị na-ejere ya ozi, otú ndị na-ebutere ya nri si ebute ya, otú ndị na-ebutere ya mmanya si ebute ya na otú ha si eji ejiji, nakwa àjà a na-esu ọkụ ọ na-achụ mgbe niile n’ụlọ Jehova.  O wee sị eze: “Ihe m nụrụ n’obodo m gbasara ike ị na-akpa* nakwa otú i si mara ihe bụ eziokwu.  Ma, ekwetaghị m ihe ndị mmadụ nọ na-akọ ruo ugbu a m bịara jiri anya m hụ ya. A gwarughịdị m ọkara ihe m hụrụ. Otú ị maruru ihe na otú i nweruru akụ̀ karịrị ihe m nụrụ.  Ndị gị ga na-enwe obi ụtọ. Ndị na-ejere gị ozi, ndị gị na ha na-anọ mgbe niile, ha ana-ege ntị n’okwu onye amamihe ị na-ekwu, ga na-enwekwa obi ụtọ.+  Ka e too Jehova Chineke gị,+ onye mere ka ị nọrọ n’ocheeze Izrel, maka na ihe gị masịrị ya. Jehova hụrụ ndị Izrel n’anya, ọ ga-ahụkwa ha n’anya ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụ ya mere o ji họrọ gị ka ị bụrụ eze ha, ka ị na-ekpe ikpe ziri ezi, na-emekwa ezi omume.” 10  O bunyeziri eze otu narị talent* ọlaedo na iri abụọ (120), mmanụ balsam karịrị akarị,+ na nkume ndị dị oké ọnụ.*+ O nweghị mgbe ọzọ e buteere Eze Solomọn mmanụ balsam há ka nke ahụ eze nwaanyị Shiba buteere ya. 11  E si Ofa jiri ọtụtụ ụgbọ mmiri Haịram bute ọlaedo+ na osisi algọm+ karịrị akarị nakwa nkume ndị dị oké ọnụ.*+ 12  Eze ji osisi algọm ndị ahụ rụọ obere idé n’ụlọ Jehova na n’ụlọ* eze, jirikwa ha rụọrọ ndị na-abụ abụ une na ụbọ akwara.+ E butetụbeghị osisi algọm ndị há otú ahụ ọzọ, a hụbeghịkwa ndị há otú ahụ ọzọ ruo taa. 13  Eze Solomọn nyere eze nwaanyị Shiba ihe ọ bụla masịrị ya ọ rịọrọ ya, nyekwa ya ihe ndị ọzọ o ji aka ya kpebie inye ya.* Nwaanyị ahụ na ndị na-ejere ya ozi mechara laghachi n’obodo ha.+ 14  N’afọ ọ bụla, ọlaedo a na-ebutere Solomọn na-adị narị talent isii na iri isii na isii (666),+ 15  n’agụnyeghị ndị nke ndị ahịa dị iche iche na ndị eze ndị Arab niile nakwa ndị gọvanọ mpaghara dị iche iche na-ebutere Solomọn. 16  Eze Solomọn jikwa ọlaedo a gwara agwa rụọ narị nnukwu ọta abụọ (200)+ (o ji narị shekel* ọlaedo isii (600) rụọ ọta nke ọ bụla).+ 17  O jikwa ọlaedo a gwara agwa rụọ narị obere ọta atọ (300) (o ji maịna* ọlaedo atọ rụọ obere ọta nke ọ bụla). Eze dowekwara ha n’ụlọ a na-akpọ Ụlọ Oké Ọhịa Lebanọn.+ 18  Eze jikwa ọdụ́ rụọ otu nnukwu ocheeze+ ma were ọlaedo a nụchara anụcha machie ya.+ 19  Steepụ e si arịgo n’ocheeze ahụ nwere ụzọ ebe isii a na-azọkwasị ụkwụ ma a rịgowe ya. E nwekwara ihe dị gburugburu kpuchiri azụ ocheeze ahụ. A rụnyekwara ebe a na-atụkwasị aka n’akụkụ ya abụọ. A kpụnyekwara ọdụm abụọ+ n’akụkụ ebe nke ọ bụla a na-atụkwasị aka. 20  A kpụnyere ọdụm iri na abụọ n’elu ebe isii ahụ a na-azọkwasị ụkwụ ma a rịgowe steepụ ahụ. Ọdụm abụọ dị na nke ọ bụla n’elu steepụ ndị ahụ, otu n’aka nri, otu n’aka ekpe. O nweghị alaeze ọzọ rụrụ ụdị ihe a. 21  E ji ọlaedo mee iko niile Eze Solomọn nwere, jirikwa ọlaedo a na-agwaghị agwa mee arịa niile dị n’ụlọ ahụ a na-akpọ Ụlọ Oké Ọhịa Lebanọn.+ E nweghị ihe ọ bụla e ji ọlaọcha mee, n’ihi na e nweghị ihe e ji ọlaọcha kpọrọ n’oge Solomọn na-achị.+ 22  Eze nwere ọtụtụ ụgbọ mmiri ha na ụgbọ mmiri ndị nke Haịram na-eso esi n’oké osimiri aga Tashish.*+ Otu ugboro n’afọ atọ, ụgbọ mmiri ndị a na-aga Tashish ebute ọlaedo, ọlaọcha, ọdụ́,+ adaka, na ekwuru. 23  Eze Solomọn nwere akụnụba karịa ndị eze ndị ọzọ niile nọ n’ụwa,+ kakwa ha mara ihe.+ 24  Ndị mmadụ na-esikwa ebe niile n’ụwa achọta* Solomọn ka ha gere okwu onye amamihe Chineke tinyere n’obi ya.+ 25  Kwa afọ, onye ọ bụla n’ime ha na-ewetara ya onyinye. Ha na-eweta ihe ndị e ji ọlaọcha mee, ihe ndị e ji ọlaedo mee, uwe, ngwá agha, mmanụ balsam, ịnyịnya, na jakị. 26  Solomọn nọkwa na-enweta ụgbọ ịnyịnya na ịnyịnya.* O nwere otu puku ụgbọ ịnyịnya na narị anọ (1,400) nakwa puku ịnyịnya* iri na abụọ (12,000).+ O dowekwara ha n’obodo dị iche iche a na-edowe ụgbọ ịnyịnya nakwa n’ebe dị yanwa bụ́ eze nso na Jeruselem.+ 27  Ọlaọcha eze webatara na Jeruselem dị ọtụtụ ka nkume. Osisi sida o butere dịkwa ọtụtụ ka osisi sịkamọ ndị dị na Shefila.*+ 28  Solomọn sikwa n’Ijipt na-atụbata ịnyịnya. Ọ bụkwa ndị na-azụrụ ya ahịa na-atụbata ha n’ìgwè n’ìgwè.*+ 29  Ha na-eji narị mkpụrụ ego ọlaọcha isii (600) esi n’Ijipt atụbata otu ụgbọ ịnyịnya, ha na-ejikwa otu narị mkpụrụ ego ọlaọcha na iri ise (150) atụbata otu ịnyịnya. Ha na-eresịkwa ha ndị eze niile na-achị ndị Het+ na ndị nke na-achị ndị Siria.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “nkume ndị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “okwu ndị ị na-ekwu.”
Otu talent bụ kilogram 34.2. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “nkume ndị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “nkume ndị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
Na Hibru, “nyekwa ya ihe ndị ọzọ otú aka hà Eze Solomọn.”
Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.
Maịna e kwuru okwu ya n’Akwụkwọ Nsọ Hibru bụ gram 570. Gụọ B14.
A na-akpọkwa ụgbọ mmiri na-aga Tashish ụgbọ mmiri Tashish.
Na Hibru, “achọ ihu.”
Ma ọ bụ “ndị na-agba ịnyịnya.”
Ma ọ bụ “ndị na-agba ịnyịnya.”
Ma ọ bụ “n’ebe ugwu.”
O nwere ike ịbụ, “sikwa n’Ijipt nakwa na Kiu; ndị na-azụrụ eze ahịa na-aga Kiu zụta ha.” Kiu a nwere ike ịbụ Silishia.