Ọrụ Ndịozi 27:1-44

  • E ji ụgbọ mmiri buru Pọl gawa Rom (1-12)

  • Oké ifufe nọ na-ebugharị ụgbọ ahụ (13-38)

  • Ụgbọ ahụ kpuru (39-44)

27  Ebe e kpebiri na ọ bụ ụgbọ mmiri ka a ga-eji ebuga anyị Ịtali,+ ha nyefere ma Pọl ma ụfọdụ ndị mkpọrọ ọzọ n’aka otu onyeisi ndị agha aha ya bụ Juliọs, onye so n’ìgwè ndị agha a na-akpọ Ọgọstọs.  Anyị banyere n’otu ụgbọ mmiri nke si Adramitiọm, nke chọrọ ịga n’ọdụ ụgbọ mmiri ndị dị n’ụsọ osimiri ná mpaghara Eshia, ụgbọ mmiri ahụ eburu anyị gawa. Arịstakọs,+ onye Tesalonaịka nke dị na Masedonia, sokwa anyị.  N’echi ya, anyị kwụsịrị na Saịdọn. Juliọs mesoro Pọl otú dị mma. O kwekwara ka ọ gakwuru ndị enyi ya ka ha nyere ya aka.  Ụgbọ mmiri sizi ebe ahụ buru anyị gaa Saịprọs, bụ́ ebe anyị ruru ifufe akwụsị inye anyị nsogbu.  Anyị sikwa n’oké osimiri dị n’akụkụ Silishia na Pamfilia gaa kwụsị n’ọdụ ụgbọ mmiri dị na Maịra nke dị na Lishia.  N’ebe ahụ, onyeisi ndị agha ahụ hụrụ otu ụgbọ mmiri si Alegzandria na-aga Ịtali, ya asị anyị banye na ya, anyị abanye.  Ụgbọ mmiri ahụ bu anyị nọ na-aga nwayọọ nwayọọ, ma, anyị mechara ruo Kinaịdọs ka ọtụtụ ụbọchị gachara. Ebe ọ bụkwa na ifufe ekweghị anyị na-aga ebe anyị chọrọ ịga, ndị kwọ ụgbọ ahụ kwọọrọ ya gaa n’akụkụ Krit, nke dị nso na Salmoni, bụ́ ebe anyị ruru ifufe akwụsị inye anyị nsogbu.  Ka anyị jisikwara ike kwọrọ ụgbọ na-aga, anyị bịaruru ebe a na-akpọ Ọdụ Ụgbọ Mmiri Ọma, ebe dị nso na Lesia.  Ọtụtụ ụbọchị agaala. Iji ụgbọ mmiri aga ebe ọ bụla ugbu a nwekwara ike ịta isi mmadụ n’ihi na Ụbọchị Ikpuchi Mmehie+ ndị mmadụ na-ebu ọnụ agafeedịla.* N’ihi ya, Pọl tụụrụ ha aro, 10  sị: “Ka anyị cheretụnụ. Anyị gawa ije a ugbu a, ụgbọ anyị ga-ekpu. Ihe niile anyị ji ga-ala n’iyi. Anyị nwekwara ike ịnwụ.” 11  Ma, onyeisi ndị agha ahụ gere onye na-akwọ ụgbọ mmiri ahụ na onye nwe ụgbọ mmiri ahụ ntị kama ige Pọl ntị. 12  Ma ebe ọ bụ na n’oge oyi, ọ dịghị mma ịnọ n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ, ọtụtụ n’ime ndị nọ n’ụgbọ ahụ tụrụ aro ka a kwọrọ ụgbọ ahụ gawa, ka ha lee ma è nwere otú ha ga-esi ruo ọdụ ụgbọ mmiri Finiks nke dị na Krit ma nọrọ ebe ahụ ka oge oyi gafee. Ọdụ ụgbọ mmiri a chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ. 13  Mgbe ifufe nke si n’ebe ndịda na-efe nwayọọ nwayọọ, ha chere na ha ga-eru Finiks. Ha dọlitekwara nko e ji ejide ụgbọ mmiri* ma kwọrọ ụgbọ ahụ na-aga Krit. Ha nọ na-aga mmiri ahụ akụkụ akụkụ. 14  Ma obere oge, oké ifufe a na-akpọ Yuroakwilo* malitere ife. 15  Ifufe ahụ busiwere ụgbọ mmiri ahụ ike, nke mere na o nweghịzi ike ịga ebe a chọrọ ka ọ gaa. Anyị enweghịkwa ike ime ihe ọ bụla gbasara ya. N’ihi ya, anyị hapụrụ ka ifufe ahụ buru anyị na-aga. 16  Ma, anyị ruru n’otu obere agwaetiti a na-akpọ Kọda, ebe ifufe ahụ kwụsịtụrụ inye anyị nsogbu. Ma, ibubata ụgbọ epeepe* na-adị n’azụ ụgbọ anyị siiri anyị ike. 17  Ma, mgbe anyị bubatachara ya n’ime ụgbọ mmiri ahụ, ndị na-akwọ ụgbọ ahụ ji ụdọ kesie okpuru ụgbọ ahụ ike. Ebe ha na-atụkwa ụjọ na ụgbọ mmiri ha ga-akpụ n’ala na Sietis,* ha tọturu ihe e ji eduzi ụgbọ mmiri, ifufe eburu ụgbọ anyị na-aga. 18  Ma n’echi ya, ha tụpụsịrị ihe ụfọdụ dị n’ụgbọ mmiri ahụ, n’ihi na oké ifufe ahụ nọ na-aṅagharịsi ụgbọ anyị ike. 19  N’ụbọchị nke atọ, ha tụpụsịrị ihe ndị e ji arụ ọrụ n’ụgbọ mmiri ahụ. 20  Mgbe anyanwụ ma ọ bụ kpakpando na-apụtaghị ruo ọtụtụ ụbọchị, oké ifufe mmiri ana-efekwa anyị, anyị kwụsịrị inwe olileanya na a ga-azọpụta anyị. 21  Mgbe anyị nọchara oge a niile n’erighị nri, Pọl biliri, sị: “A sị na unu gere m ntị, anyị agaraghị esi na Krit pụọ, anyị agaraghịkwa ata ahụhụ niile a anyị na-ata ma ọ bụ tụpụsịa ihe ndị ahụ anyị tụpụsịrị.+ 22  Otú o sina dị, obi sie unu ike, n’ihi na o nweghị onye* ọ bụla n’ime unu ga-ala n’iyi, naanị ụgbọ a ga-ala n’iyi. 23  N’abalị ụnyaahụ, Chineke, onye m bụ nke ya na onye m na-efe, zitere otu mmụọ ozi,+ ya abịa guzoro m nso, 24  sị: ‘Pọl, ụjọ atụla gị. Gị na Siza ga-ahụ.+ Chineke ga-azọpụta gị na ndị niile gị na ha nọ n’ụgbọ mmiri a.’ 25  N’ihi ya, obi sie unu ike maka na ekwere m na Chineke ga-eme ihe a mmụọ ozi gwara m. 26  Ma, ụgbọ anyị ga-akpọkasị, anyịnwa apụta n’ikpere mmiri n’otu agwaetiti.”+ 27  Mgbe ifufe nọ na-aṅagharị ụgbọ mmiri anyị n’elu oké osimiri Edria ruo abalị iri na anọ, n’etiti abalị, ndị na-akwọ ụgbọ mmiri ahụ malitere iche na ha eruwela elu ala nso. 28  Ha wee tụọ otú ebe anyị nọ n’osimiri ahụ dịruru n’omimi ma hụ na ọ dị otu narị amaụkwụ na iri abụọ (120).* Ha agatụkwuokwa n’ihu, tụọ ya ọzọ, hụ na ọ dị amaụkwụ iri itoolu.* 29  Ma, ụjọ nọ na-atụ ndị na-akwọ ụgbọ ahụ na o nwere ike ịkụ n’elu nkume kpuo. N’ihi ya, ha si n’azụ ya tụpụ nko anọ e ji ejide ụgbọ mmiri,* obi ha niile abụrụ ka chi bọwa ngwa ngwa. 30  Ma ndị ahụ na-akwọ ụgbọ mmiri ahụ chọwara isi n’ụgbọ ahụ pụọ. Ọ bụ ya mere ha ji bido iwetu ụgbọ epeepe na mmiri ahụ. Ma, ha nọ na-eme ka à ga-asị na ha chọrọ isi n’ihu ụgbọ ahụ wedasịa nko ndị ahụ e ji ejide ụgbọ mmiri.* 31  Mgbe Pọl matara ihe a, ọ gwara onyeisi ndị agha ahụ na ndị agha ya, sị: “Ọ bụrụ na ndị a esi n’ụgbọ a pụọ, a gaghị azọpụta unu.”+ 32  Ndị agha ahụ wee gbubie ụdọ ji ụgbọ epeepe ahụ ma hapụ ya ka ọ dapụ. 33  Ma ka chi na-achọ ịbọ, Pọl gbara ha niile ume ka ha rie nri. Ọ sịrị: “Taa mere ya abalị iri na anọ unu nọ na-atụ anya ịpụta ná nsogbu a, o nwebeghịkwa ihe unu riri. 34  N’ihi ya, gbalịanụ rie nri maka ọdịmma unu. O nweghị onye n’ime unu otu ntutu isi ya ga-ala n’iyi.” 35  Mgbe o kwuchara ihe a, o weere otu ogbe achịcha, kelee Chineke n’ihu ha niile, nyawaa ya ma bido ịta ya. 36  Ihe a o mere mesiri ha obi ike, ha amalitekwa iri ihe. 37  Anyị niile nọ n’ụgbọ ahụ dị narị mmadụ* abụọ na iri asaa na isii (276). 38  Mgbe ha rijuru afọ, ha bidoro na-atụba ọka wit na mmiri ahụ ka ụgbọ ahụ dị fere fere.+ 39  Mgbe chi bọrọ, ndị na-akwọ ụgbọ ahụ enweghị ike ịmata ebe anyị nọ.+ Ma ha hụrụ mbara ala nwere ọnụ mmiri, chọọkwa ịkwụsị ụgbọ ahụ ebe ahụ ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe ha omume. 40  N’ihi ya, ha gbubiri nko ndị ahụ e ji ejide ụgbọ mmiri,* hapụkwa ha ha adaba na mmiri ahụ. Ha tọpụkwara ụdọ e ji kedo ụmara ụgbọ ahụ ozugbo. Mgbe ha dọlitechara ákwà na-adị n’ihu ụgbọ mmiri ka ifufe na-ebu ya, ha gawara n’ikpere osimiri ahụ. 41  Mgbe ha kwọọrọ ụgbọ ahụ na-aga ka ha banye na mbara ala ahụ, ụgbọ ahụ kụrụ n’elu otu mkputamkpu ájá, nke mmiri na-asọ n’akụkụ ya abụọ. Ihu ya wee tọ ebe ahụ, ebili mmiri amalitekwa ịkụrisị azụ ya.+ 42  Ndị agha ahụ wee kpebie na ha ga-egbu ndị mkpọrọ ahụ, ka onye ọ bụla ghara ịwụba na mmiri ahụ, gwuru mmiri gbalaga. 43  Ma onyeisi ndị agha ahụ achọghị ka ihe ọ bụla mee Pọl. N’ihi ya, o kweghị ka ndị agha ya mee ihe ahụ ha chọrọ ime. Ọ gwara ndị ma egwu mmiri ka ha maba na mmiri buru ụzọ gwuru mmiri pụta n’elu ala. 44  Ọ gwakwara ndị ọzọ ka ha soro ha n’azụ, ka ụfọdụ jide ibé osisi aka, ndị ọzọ ejide ihe ụfọdụ si n’ụgbọ mmiri ahụ aka. Otú a ka mmadụ niile si pụta n’elu ala n’enweghị ihe mere ha.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ihe a na-eme n’ọnwa Tishri nke bụ́ ọnwa mmiri ji ebido izo na oge oké osimiri na-akpa ike dị egwu.
Ma ọ bụ “dọlitekwara arịlịka.”
Ya bụ, ifufe si ebe ugwu ọwụwa anyanwụ.
Ọ bụ ụgbọ e nwere ike iji gụpụta onye mmiri chọrọ iri.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ihe dị ka mita 36 ma ọ bụ fatọm 20. Gụọ B14.
Ihe dị ka mita 27 ma ọ bụ fatọm 15. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “tụpụ arịlịka anọ.”
Ma ọ bụ “wedasịa arịlịka ndị ahụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “gbubiri arịlịka ndị ahụ.”