Ọrụ Ndịozi 21:1-40

  • Mgbe Pọl hà na-aga Jeruselem (1-14)

  • Mgbe ha ruru Jeruselem (15-19)

  • Pọl mere ihe ndị okenye gwara ya mee (20-26)

  • Ndị mmadụ malitere ịkpa aghara n’ụlọ nsọ, e jide Pọl (27-36)

  • A hapụrụ Pọl ka ọ gwa ndị gbakọrọnụ okwu (37-40)

21  Mgbe anyị jisiri ike hapụ ha banye ụgbọ mmiri, anyị gawara Kọs n’akwụsịghị akwụsị. N’echi ya, anyị gara Rods, sikwa ebe ahụ gaa Patara.  Mgbe anyị hụrụ otu ụgbọ mmiri na-aga Finishia, anyị banyere ya wee gawa.  Mgbe anyị ruru ebe anyị nọ na-ahụ agwaetiti Saịprọs n’aka ekpe, anyị gafere ma garuo Siria, wee kwụsị na Taya, n’ihi na ebe ahụ ka ụgbọ ahụ ga-ebutusị ibu o bu.  Anyị chọwara ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ ebe ahụ wee chọta ha ma nọrọ ebe ahụ ruo ụbọchị asaa. Ma n’ihi ihe mmụọ nsọ mere ka ụfọdụ ụmụnna mara, ha gwara Pọl ugboro ugboro ka ọ ghara ịkpa ụkwụ na Jeruselem.+  Mgbe anyị nọchara ụbọchị ole anyị chọrọ ịnọ ebe ahụ, anyị gawara ebe ọzọ. Ma ha niile, ma ụmụ nwaanyị ma ụmụaka, durutere anyị n’ụsọ osimiri dị n’azụ obodo ahụ. Anyị wee gbuo ikpere n’ala n’ụsọ osimiri ahụ, kpee ekpere  ma sị ibe anyị ka e mesịa. Anyị banyeziri n’ụgbọ mmiri, hanwa alaghachi n’ụlọ ha.  Anyị wee banye ụgbọ mmiri na Taya, ya ebute anyị Tọlemeis. Anyị kelekwara ụmụnna ndị nọ ebe ahụ ma nọnyere ha otu ụbọchị.  N’echi ya, anyị gawara Sizaria. Mgbe anyị ruru, anyị banyere n’ụlọ Filip onye na-ezisa ozi ọma, anyị na ya anọrọ. Filip a bụ otu n’ime ụmụ nwoke asaa ahụ+ ndịozi họpụtara na Jeruselem.  Nwoke a nwere ụmụ agbọghọ anọ na-alụbeghị di,* ndị na-ebu amụma.+ 10  Ma, ka anyị nọchara ebe ahụ ọtụtụ ụbọchị, otu onye amụma aha ya bụ Agabọs+ si Judia bịa. 11  Ọ bịakwutere anyị ma chịrị ájị̀* Pọl, jiri ya kee onwe ya agbụ ụkwụ na aka, sị: “Chineke ji mmụọ nsọ kwuo, sị: ‘Otú a ka ndị Juu ga-eke onye nwe ájị̀ a agbụ na Jeruselem+ ma nyefee ya n’aka ndị mba ọzọ.’”+ 12  Mgbe anyị nụrụ ihe a, ma anyịnwa ma ndị ebe ahụ malitere ịrịọ Pọl ka ọ ghara ịga Jeruselem. 13  Ma ọ sịrị: “Gịnị mere unu ji na-ebe ákwá? Gịnịkwa mere unu ji na-eme ka obi ghara isi m ike? Ka o doo unu anya na adị m njikere ka e kee m agbụ, dịkwa njikere ịnwụ na Jeruselem n’ihi aha Onyenwe anyị Jizọs.”+ 14  Mgbe anyị hụrụ na anyị agaghị agbanweli obi ya, anyị kwụsịrị ịgwa ya ka ọ ghara ịga.* Anyị sịkwara: “Ka uche Jehova* mee.” 15  Mgbe ihe a mechara, anyị jikeere gawa Jeruselem. 16  Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, ndị si Sizaria, sokwa anyị gawa. Ha kpọgara anyị na nke Minesin, onye Saịprọs, onye anyị ga-anọ n’ụlọ ya. O so ná ndị mbụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. 17  Mgbe anyị ruru Jeruselem, ụmụnna ji ọṅụ nabata anyị. 18  Ma n’echi ya, anyị na Pọl gakwuuru Jems.+ Ndị okenye niile nọkwa ebe ahụ. 19  Pọl wee kelee ha ma kọọrọ ha ihe niile Chineke si n’ozi ọma o zisara meere ndị mba ọzọ. 20  Mgbe ha nụrụ ihe a, ha malitere ito Chineke. Ma, ha gwakwara Pọl, sị: “Nwanna anyị, ị manụ na e nwere ọtụtụ puku ndị Juu na-eso ụzọ Jizọs, nakwa na ha ji Iwu Mosis kpọrọ ihe.+ 21  Ma ha nụrụ ka ndị mmadụ na-asị: ‘Pọl na-akụziri ndị Juu niile nọ ná mba ọzọ ka ha ghara ime ihe Iwu Mosis kwuru. Ọ na-agwakwa ha ka ha ghara ibi ụmụ ha úgwù, gharakwa ime omenala anyị dị iche iche.’+ 22  Gịnịzi ka anyị ga-eme gbasara ya? O doro anya na ha ga-anụ na ị bịala ebe a. 23  N’ihi ya, mee ihe a anyị na-agwa gị: Anyị nwere ụmụ nwoke anọ ndị chọrọ imezu nkwa ha kwere Chineke. 24  Kpọrọ ụmụ nwoke ndị a gaa ka gị na ha sachaa onwe unu otú iwu kwuru, kwụọkwa ụgwọ ihe niile ọ ga-efu ha, ka e wee kpụọ ha isi.* Onye ọ bụla ga-esikwa otú a mara na ihe ahụ ndị mmadụ na-akọ banyere gị abụghị eziokwu, kama na ị na-eme ihe kwesịrị ekwesị, na-edebekwa Iwu Mosis.+ 25  Anyị ezigarala ndị mba ọzọ na-eso ụzọ Jizọs akwụkwọ ozi anyị dere ihe anyị kpebiri ka ha na-eme. Anyị gwara ha ka ha jụ ihe ọ bụla gbasara ikpere arụsị,+ ghara iri ọbara,+ ghara iri anụ a nyagburu anyagbu,*+ gharakwa ịkwa iko.”*+ 26  N’echi ya, Pọl kpọọrọ ụmụ nwoke ndị ahụ gawa, ya na ha asachaa onwe ha otú iwu kwuru.+ O wee banye n’ụlọ nsọ iji mee ka a mara mgbe abalị asaa ha ga-eji sachaa onwe ha otú iwu kwuru ga-agwụ, ka onye nchụàjà wee chụọ àjà maka onye nke ọ bụla n’ime ha n’ụbọchị ahụ. 27  Ma mgbe abalị asaa ahụ na-aga ịgwụ, ndị Juu si Eshia hụrụ Pọl n’ụlọ nsọ, bido ime ka mmadụ niile nọ ebe ahụ kpawa aghara. Ha wee jide ya, 28  na-eti mkpu, sị: “Ndị Izrel, bịanụ nye aka! Onye a bụ nwoke ahụ na-akụziri ndị nọ ebe niile ka ha ghara iji ndị ala anyị na Iwu Mosis nakwa ụlọ nsọ a kpọrọ ihe. Nke ka njọ bụ na ọ kpọbatadịrị ndị Grik n’ụlọ nsọ a, merụọkwa ebe a dị nsọ.”+ 29  Ha kwuru ihe a maka na o nwere mgbe ha hụrụ ya na Trọfimọs+ onye Efesọs na Jeruselem, ha nọkwa na-eche na Pọl kpọbatara ya n’ụlọ nsọ. 30  Obodo ahụ niile malitere ịgba ghara ghara. Ndị mmadụ gbakọtakwara n’ụlọ nsọ, jide Pọl, kpụrụ ya pụọ. E mechikwara ụzọ ozugbo ha pụrụ. 31  Ka ha nọ na-achọ igbu ya, ozi ruru otu ọchịagha ntị na Jeruselem niile na-agba ghara ghara. 32  Ozugbo ahụkwa, ọ kpọọrọ ndị agha na ndị isi ha, ha agbara ọsọ gawa ebe ahụ ha nọ. Mgbe ha hụrụ ọchịagha ahụ na ndị agha ya, ha kwụsịrị iti Pọl ihe. 33  Ọchịagha ahụ bịaziri nso, nwụchie ya ma kwuo ka e kee ya agbụ ígwè abụọ.+ Ọ jụziri onye ọ bụ na ihe o mere. 34  Ma ụfọdụ ndị ahụ gbakọrọnụ malitere na-eti otu ihe ná mkpu, ndị ọzọ ana-eti ihe ọzọ. Ebe ọchịagha ahụ na-amataghị ihe na-emenụ n’ihi aghara ahụ ndị mmadụ nọ na-akpa, o kwuru ka a kpọta ya n’ogige ndị agha. 35  Ma mgbe Pọl ruru na steepụ ụlọ ahụ, ndị agha ahụ buuru ya eburu n’ihi na ìgwè mmadụ ahụ nọ na-achọ imerụ ya ahụ́. 36  Ndị mmadụ nọkwa na-eso ha, na-eti mkpu, sị: “Gbuonụ ya!” 37  Ka a na-achọ iduru Pọl baa n’ogige ndị agha, ọ sịrị ọchịagha ahụ: “M̀ nwere ike ịgwatụ gị okwu?” Ya asị: “Ị̀ na-asụ Grik? 38  Ọ́ bụghị gị bụ onye Ijipt ahụ mere ka ndị mmadụ megidewe ndị ọchịchị n’oge gara aga, durukwa puku ụmụ nwoke anọ (4,000) ndị ji daga baa n’ala ịkpa?” 39  Pọl wee sị: “N’eziokwu, abụ m onye Juu,+ onye Tasọs+ dị na Silishia, nwa amaala obodo a ma ama. N’ihi ya, biko, kwe m ka m gwa ndị a okwu.” 40  Mgbe ọ gwara ya kwuwe, Pọl eguzoro na steepụ ụlọ ahụ feere ndị mmadụ aka, ebe niile adaa jụụ, ya amalite ịgwa ha okwu n’asụsụ Hibru.+ Ọ sịrị:

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “na-amaghị nwoke.”
Ya bụ, belt.
Na Grik, “anyị gbara nkịtị.”
Gụọ A5.
Ya bụ, ka ha wee mezuo nkwa ha kwere Chineke.
Ma ọ bụ “anụ a na-egbupụghị ọbara.”
Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.