Ọpụpụ 7:1-25

  • Jehova gbara Mosis ume (1-7)

  • Mkpara Erọn ghọrọ nnukwu agwọ (8-13)

  • Ahụhụ nke mbụ: mmiri ghọrọ ọbara (14-25)

7  Jehova wee gwa Mosis, sị: “Lee, emeela m ka ị bụụrụ Fero Chineke, Erọn nwanne gị ga-abụkwa onye amụma gị.+  Ị ga-ekwu ihe niile m ga-enye gị iwu ka i kwuo. Erọn nwanne gị ga-agwa Fero okwu, ọ ga-ahapụkwa ndị Izrel ka ha si n’ala ya pụọ.  Ma m ga-ekwe ka obi Fero kpọchie.+ M ga-eme ọtụtụ ihe àmà, rụọkwa ọtụtụ ọrụ ebube n’Ijipt.+  Ma, Fero agaghị ege unu ntị. M ga-ebi Ijipt aka ma si n’Ijipt kpọpụta ndị m dị ọtụtụ,* bụ́ ndị Izrel, taakwa Ijipt nnukwu ahụhụ.+  Ndị Ijipt ga-amarakwa na m bụ Jehova+ mgbe m ga-eweli aka m mee Ijipt ihe ma kpọpụta ndị Izrel n’obodo ha.”  Mosis na Erọn mere ihe Jehova nyere ha n’iwu. Ha mere nnọọ otú ahụ.  Mosis dị afọ iri asatọ, Erọn adịrị afọ iri asatọ na atọ mgbe ha gwara Fero okwu.+  Jehova wee gwa Mosis na Erọn, sị:  “Ọ bụrụ na Fero asị unu, ‘Rụọnụ ọrụ ebube,’ gwa Erọn, sị, ‘Were mkpara gị tụpụ n’ala n’ihu Fero.’ Ọ ga-aghọ nnukwu agwọ.”+ 10  Mosis na Erọn wee gakwuru Fero ma mee nnọọ ihe Jehova nyere ha n’iwu. Erọn tụpụrụ mkpara ya n’ala n’ihu Fero na ndị na-ejere ya ozi, ya aghọọ nnukwu agwọ. 11  Ma, Fero kpọkọtara ndị ma ihe na ndị dibịa afa. Ndị dibịa anwansi ndị a e nwere n’Ijipt+ jikwa anwansi* ha mee otu ihe ahụ.+ 12  Onye ọ bụla n’ime ha tụpụrụ mkpara ya n’ala, mkpara ya aghọọ nnukwu agwọ. Ma mkpara Erọn loro mkpara ha. 13  N’agbanyeghị ihe a, Fero kpọchiri obi ya,+ o geghịkwa ha ntị, otú Jehova kwuru. 14  Jehova wee gwa Mosis, sị: “Obi Fero akpọchiela.+ Ọ jụla ịhapụ ha ka ha laa. 15  Gakwuru Fero n’ụtụtụ. Ọ ga-apụta ka ọ gaa ná mmiri. Ị ga-anọrọ n’ọnụ ọnụ Osimiri Naịl ka i zute ya. Ị gawa, jiri mkpara ahụ n’aka, ya bụ, mkpara ahụ nke ghọrọ agwọ.+ 16  Ị ga-asị ya, ‘Jehova bụ́ Chineke ndị Hibru zitere m ka m bịakwute gị.+ Ọ sịrị: “Hapụ ndị m ka ha gaa fee m* n’ala ịkpa.” Ma i gebeghị ntị ruo ugbu a. 17  Jehova kwuru, sị: “Ị ga-eji ihe a mata na m bụ Jehova.+ M ga-akụ mkpara m ji n’aka ná mmiri dị n’Osimiri Naịl, mmiri ahụ ga-aghọkwa ọbara. 18  Azụ̀ ndị dị n’Osimiri Naịl ga-anwụ. Osimiri Naịl ga na-esi ísì, mmiri Osimiri Naịl agaghịkwa ekwe ndị Ijipt ọṅụṅụ.”’” 19  Jehova sịziri Mosis: “Gwa Erọn, sị, ‘Were mkpara gị, setịa aka gị n’elu mmiri ndị dị n’Ijipt,+ n’elu osimiri ndị dị na ya, n’elu ọwa mmiri ya niile,* n’elu ọdọ mmiri ya niile,+ nakwa n’elu ebe niile mmiri na-asọba, ka ha ghọọ ọbara.’ Ọbara ga-adị n’ala Ijipt niile, ma n’arịa ndị e ji osisi mee ma n’arịa ndị e ji nkume mee.” 20  Ozugbo ahụ, Mosis na Erọn mere nnọọ otú Jehova nyere ha iwu. O weliri mkpara ahụ kụọ mmiri dị n’Osimiri Naịl n’ihu Fero na ndị na-ejere ya ozi, mmiri niile dị n’osimiri ahụ ghọziri ọbara.+ 21  Azụ̀ ndị dị n’osimiri ahụ nwụrụ.+ Osimiri ahụ malitere isi ísì, ndị Ijipt enweghịkwa ike ịṅụ mmiri si n’Osimiri Naịl.+ Ọbara wee ju ebe niile n’ala Ijipt. 22  Ma, ndị dibịa anwansi ndị Ijipt ji anwansi* ha mee otu ihe ahụ,+ nke mere ka obi Fero ka kpọchie akpọchie, o geghịkwa ha ntị, otú Jehova kwuru.+ 23  Fero wee laghachi n’ụlọ ya, ma o chebaraghị ihe a merenụ echiche. 24  Ndị Ijipt niile nọ na-egwu olulu gburugburu Osimiri Naịl ka ha nweta mmiri ha ga-aṅụ, n’ihi na ha enweghị ike ịṅụ mmiri ọ bụla si n’Osimiri Naịl. 25  Ụbọchị asaa gafere mgbe Jehova mechara ka mmiri dị n’Osimiri Naịl ghọọ ọbara.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ndị agha m, ndị m.”
Ma ọ bụ “majik.”
Na Hibru, “jeere m ozi.”
Ya bụ, ọwa mmiri ndị si n’Osimiri Naịl.
Ma ọ bụ “majik.”