Ọpụpụ 22:1-31

  • Iwu e nyere ndị Izrel (1-31)

    • Gbasara izu ohi (1-4)

    • Gbasara imebi ihe a kụrụ n’ubi (5, 6)

    • Gbasara ịkwụ mmadụ ụgwọ ihe ya (7-15)

    • Gbasara ịrafu mmadụ (16, 17)

    • Gbasara ife Chineke na imegbu mmadụ (18-31)

22  “Ọ bụrụ na mmadụ ezuo ehi ma ọ bụ atụrụ, wee gbuo ya ma ọ bụ ree ya, ọ ga-eji ehi ise kwụọ ụgwọ ehi ahụ, jirikwa atụrụ anọ kwụọ ụgwọ atụrụ ahụ.+  (“Ọ bụrụ na a hụ onye ohi+ ka ọ na-abanye n’ụlọ mmadụ n’abalị, a kụgbuo ya, ikpe ọbara amaghị onye gburu ya.  Ọ bụrụ na anyanwụ awaala mgbe onye ohi ahụ bịara, ikpe ọbara mara onye gburu ya.) “Onye ohi ga-akwụ ụgwọ ihe o zuru. Ọ bụrụ na e nweghị ihe o nwere, a ga-ere ya kwụọ ụgwọ ihe o zuru.  Ọ bụrụ na a hụ ihe o zuru n’aka ya mgbe ihe ahụ ka dị ndụ, ọ ga-akwụ ụgwọ ya okpukpu abụọ, ma ọ̀ bụ ehi ma ọ̀ bụ jakị ma ọ̀ bụ atụrụ.  “Ọ bụrụ na mmadụ akpọpụ anụmanụ ya ka ha gaa taa nri n’ugbo ma ọ bụ n’ubi vaịn, ha ataa nri n’ugbo onye ọzọ, onye ahụ ga-eji ugbo ya kacha mma ma ọ bụ ubi vaịn ya kacha mma kwụọ ụgwọ ya.  “Ọ bụrụ na a mụnyere ọkụ, ya abanye n’osisi ogwu ma rechapụ ọka* ndị e kere n’ùkwù n’ùkwù ma ọ bụ ọka ndị kwụ ọtọ ma ọ bụ ubi, onye mụnyere ọkụ ahụ ga-akwụ ụgwọ ihe ọkụ ahụ mebiri.  “Ọ bụrụ na mmadụ enye mmadụ ibe ya ego ma ọ bụ ihe ọzọ ka o jidere ya, e wee zuru ya n’ụlọ onye ahụ, ọ bụrụ na a hụ onye zuru ya, ọ ga-akwụ ụgwọ ya okpukpu abụọ.+  Ọ bụrụ na a hụghị onye zuru ya, a ga-akpọta onye nwe ụlọ ahụ n’ihu ezi Chineke+ ka a mara ma ọ̀ bụ ya weere ihe mmadụ ibe ya.  Mgbe ọ bụla mmadụ abụọ na-ese okwu n’ihi ehi, jakị, atụrụ, uwe, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ furu efu maka na otu onye sịrị, ‘Ọ bụ m nwe ihe a,’ ha abụọ ga-abịa n’ihu ezi Chineke.+ Onye ọ bụla Chineke kwuru na ọ bụ ya ka ikpe mara ga-akwụ onye nke ọzọ ụgwọ ihe ahụ okpukpu abụọ.+ 10  “Ọ bụrụ na mmadụ kpụnyere mmadụ ibe ya jakị ma ọ bụ ehi ma ọ bụ atụrụ ma ọ bụ anụ ụlọ ọ bụla ọzọ ka o lekọtara ya, o wee nwụọ ma ọ bụ e merụọ ya ahụ́ ma ọ bụ a kpụrụ ya, ma e nweghị onye hụrụ ihe merenụ, 11  onye a kpụnyere anụ ahụ ga-aṅụ iyi n’ihu Jehova na ya emetụghị ihe mmadụ ibe ya aka. Onye nwe anụ ahụ ga-ekwere ihe o kwuru. Onye ahụ a kpụnyere ya agaghị akwụ ụgwọ ya.+ 12  Ma ọ bụrụ na e zuru anụ ahụ mgbe ọ ka nọ n’aka ya, ọ ga-akwụ onye nwe ya ụgwọ ya. 13  Ọ bụrụ na ọ bụ anụ ọhịa dọgburu ya, ọ ga-ebute ozu anụ ahụ ka ọ bụrụ ihe akaebe. Ọ gaghị akwụ ụgwọ anụ ọ bụla anụ ọhịa dọgburu. 14  “Ma ọ bụrụ na mmadụ agbaziri anụmanụ mmadụ ibe ya, anụmanụ ahụ emerụọ ahụ́ ma ọ bụ nwụọ mgbe ọ na-anọghị n’aka onye nwe ya, onye ahụ gbaziiri ya ga-akwụ ụgwọ ya. 15  Ọ bụrụ na ọ nọ n’aka onye nwe ya, ọ gaghị akwụ ụgwọ ya. Ọ bụrụ na a kwụrụ onye nwe ya ụgwọ gbaziri ya, ego ahụ a kwụrụ ga-abụzi ụgwọ anụ ahụ. 16  “Ọ bụrụ na nwoke arafuo nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke a na-ekwebeghị nkwa ọlụlụ, ya na ya enwee mmekọahụ,* ọ ga-akwụ ụgwọ isi ya lụwa ya.+ 17  Ọ bụrụ na nna nwa agbọghọ ahụ ekweghị ka nwoke ahụ lụọ ya, ọ ga-akwụ ego ole a na-akwụ n’isi nwa agbọghọ na-amaghị nwoke. 18  “Ahapụla nwaanyị na-agba afa ndụ.+ 19  “A ga-egbu onye ọ bụla ya na anụmanụ nwere mmekọahụ.+ 20  “Onye ọ bụla chụụrụ chi ọ bụla àjà ma e wepụ naanị Jehova, a ga-egbu ya.+ 21  “Unu emesila onye mbịarambịa ike, unu emegbukwala ya,+ n’ihi na e nwere mgbe unu bụ ndị mbịarambịa n’Ijipt.+ 22  “Unu emegbula nwaanyị di ya nwụrụ ma ọ bụ nwa na-enweghị nna.*+ 23  E nwee ka unu si megbuo ya, ya ebesara m ákwá, m ga-anụ ákwá ya.+ 24  M ga-ewesa unu ezigbo iwe, m ga-ejikwa mma agha gbuo unu. Ndị nwunye unu ga-abụ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, ụmụ unu ga-abụkwa ụmụ na-enweghị nna. 25  “Ọ bụrụ na i binye onye ọ bụla bụ́ ogbenye n’ime ndị m gị na ya bi ego, emesola ya otú ndị na-anara ọmụrụ nwa ma ha binye mmadụ ego si eme. Anarala ya ọmụrụ nwa.+ 26  “Ọ bụrụ na ị chịrị uwe mmadụ ibe gị ka ọ bụrụ ihe ibé mgbe i binyere ya ego,+ ị ga-achịghachiri ya uwe ya mgbe anyanwụ dara. 27  N’ihi na ọ bụ naanị ákwà o nwere o ji ekpuchi ahụ́ ya. Gịnịzi ka ọ ga-eji hie ụra?+ O besara m ákwá, m ga-anụ olu ya n’ihi na m na-eme ebere.*+ 28  “Akpọla Chineke iyi.*+ Akpọkwala onye na-achị* ndị gị iyi.+ 29  “Ejila obi abụọ enye m onyinye mgbe ubi gị mepụtara ihe n’ụba nakwa mgbe mmanya na mmanụ juru n’ebe a na-azọchapụtara gị mmanya na mmanụ.+ Ị ga-enye m nwa nwoke mbụ ị mụtara.+ 30  Ihe a ka ị ga-eme ehi gị na atụrụ gị:+ Ya na nne ya ga-anọ ruo ụbọchị asaa. N’ụbọchị nke asatọ, ị ga-enye m ya.+ 31  “Unu ga-abụrụ m ndị dị nsọ.+ Unu erikwala anụ ọ bụla anụ ọhịa dọgburu n’ọhịa.+ Unu ga-atụpụrụ ya nkịta.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Na Hibru, “edinaa.”
Ma ọ bụ “nwa na-enweghị nne na nna.”
Ma ọ bụ “na-eme amara.”
Ma ọ bụ “Ekwujọla Chineke.”
Ma ọ bụ “onyeisi.”