Ọpụpụ 11:1-10

  • A mara ọkwa ahụhụ nke iri (1-10)

    • A gwara ndị Izrel ka ha rịọta ndị Ijipt onyinye (2)

11  Jehova wee sị Mosis: “M ga-ata Fero na Ijipt otu ahụhụ ọzọ. E mechaa, ọ ga-ahapụ unu ka unu gawa.+ Mgbe ọ ga-ahapụ unu, ọ ga na-achụ unu achụ ka unu si n’ebe a pụọ.+  Gwa ụmụ nwoke niile na ụmụ nwaanyị niile ná ndị m ka ha rịọ ndị agbata obi ha ka ha nye ha ihe ndị e ji ọlaọcha mee na ihe ndị e ji ọlaedo mee.”+  Jehova mekwara ka ihe ndị Izrel masị ndị Ijipt. Ndị na-ejere Fero ozi na ndị Ijipt ndị ọzọ na-akwanyekwara Mosis ezigbo ùgwù n’Ijipt.  Mosis wee sị: “Jehova kwuru, sị, ‘N’ihe dị ka n’etiti abalị, m ga-abanye n’ime Ijipt.+  Nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’Ijipt ga-anwụ,+ malite na nwa mbụ Fero, onye nọ n’ocheeze, ruo na nwa mbụ nke nwaanyị na-eje ozi, bụ́ onye na-egwe ihe na nkume e ji egwe nri, nakwa nwa ọ bụla anụ ụlọ bu ụzọ mụọ.+  N’Ijipt niile, a ga-ebe oké ákwá nke a na-ebetụbeghị ụdị ya, nke a na-agaghịkwa ebe ụdị ya ọzọ.+  Ma, nkịta agaghịdị agbọ ndị Izrel ụja, ma ụmụ nwoke ha ma anụmanụ ha, ka unu wee mara na Jehova nwere ike ime ka e nwee ihe dị iche ná ndị Ijipt na ndị Izrel.’+  Ndị niile na-ejere gị ozi ga-abịakwute m ma kpọọrọ m isiala, sị, ‘Gawa, gị na ndị niile na-eso gị.’+ E mechaa, m ga-agawa.” O wee jiri iwe hapụ Fero pụọ.  Jehova gwaziri Mosis, sị: “Fero agaghị ege unu ntị,+ ka ọrụ ebube m wee dị ọtụtụ n’Ijipt.”+ 10  Mosis na Erọn rụrụ ọrụ ebube ndị a niile n’ihu Fero.+ Ma Jehova kwere ka obi Fero kpọchie, nke mere na ọ hapụghị ndị Izrel ka ha si n’ala ya pụọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji