Ọnụ Ọgụgụ 3:1-51

  • Ụmụ Erọn ndị nwoke (1-4)

  • A họọrọ ndị Livaị ka ha na-eje ozi (5-39)

  • Ihe e ji gbara ụmụ nwoke e bu ụzọ mụọ (40-51)

3  Ndị a bụ ndị ezinụlọ* Erọn na Mosis mgbe Jehova gwara Mosis okwu n’Ugwu Saịnaị.+  Ihe a bụ aha ụmụ Erọn ndị nwoke: Nedab bụ́ ọkpara, na Abaịhu,+ Elieza,+ na Ịtama.+  Ihe a bụ aha ụmụ Erọn ndị nwoke. Ọ bụ ha bụ ndị nchụàjà e tere mmanụ, ndị a họpụtara ka ha bụrụ ndị nchụàjà.+  Ma, Nedab na Abaịhu nwụrụ n’ihu Jehova mgbe ha chụrụ àjà* iwu na-akwadoghị n’ihu Jehova+ n’ala ịkpa Saịnaị. E nweghị onye n’ime ha mụtara nwa. Ma Elieza+ na Ịtama+ nọ na-arụ ọrụ nchụàjà, ha na Erọn nna ha.  Jehova gwaziri Mosis, sị:  “Kpọta ndị si n’ebo Livaị,+ meekwa ka ha guzo n’ihu Erọn onye nchụàjà. Ha ga na-ejere ya ozi.+  Ha ga na-arụrụ Erọn ọrụ ha kwesịrị ịrụrụ ya, na-arụkwara nzukọ Izrel niile ọrụ ha kwesịrị ịrụrụ ha n’ihu ụlọikwuu nzute. Otú ha ga-esi eme ya bụ ịna-eje ozi dị iche iche gbasara ụlọikwuu.  Ha ga na-elekọta arịa niile+ e ji eje ozi n’ụlọikwuu nzute, na-arụkwara ndị Izrel ọrụ ha kwesịrị ịrụrụ ha. Otú ha ga-esi eme ya bụ ịna-eje ozi dị iche iche gbasara ụlọikwuu ahụ.+  Ị ga-akpọrọ ndị Livaị kpọnye Erọn na ụmụ ya ndị nwoke. Ha bụ ndị e si ná ndị Izrel nye ya.+ 10  Ị ga-ahọpụta Erọn na ụmụ ya ndị nwoke. Ha ga na-arụ ọrụ nchụàjà ha.+ Onye ọ bụla na-abụghị onye nchụàjà* bịara nso, a ga-egbu ya.”+ 11  Jehova gwakwara Mosis, sị: 12  “M si ná ndị Izrel na-akpọrọ ndị Livaị ka ha nọchie anya nwa ọ bụla ndị Izrel bu ụzọ mụọ.*+ Ndị Livaị ga-abụ nke m. 13  N’ihi na ọ bụ m nwe nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ.+ Ọ bụ n’ụbọchị m gburu nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’Ijipt+ ka m mere ka nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’Izrel dịrị m nsọ, malite na mmadụ ruo n’anụmanụ.+ Ha ga-abụ nke m. Abụ m Jehova.” 14  Jehova gwakwuru Mosis okwu n’ala ịkpa Saịnaị,+ sị: 15  “Deba aha ụmụ Livaị ndị nwoke n’akwụkwọ n’ọnụmara n’ọnụmara nakwa n’ezinụlọ n’ezinụlọ. Ị ga-edeba aha nwoke ọ bụla dị otu ọnwa gbagowe n’akwụkwọ.”+ 16  Mosis wee deba aha ha n’akwụkwọ otú Jehova nyere ya n’iwu. 17  Ihe a bụ aha ụmụ Livaị ndị nwoke: Geshọn, Kohat, na Meraraị.+ 18  Ihe a bụ aha ụmụ Geshọn ndị nwoke n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Libnaị na Shimiaị.+ 19  Ụmụ Kohat ndị nwoke n’ezinụlọ n’ezinụlọ bụ Amram, Izha, Hebrọn, na Ọziel.+ 20  Ụmụ Meraraị ndị nwoke n’ezinụlọ n’ezinụlọ bụ Malaị+ na Mushaị.+ Ọ bụ ezinụlọ ndị a bụ ezinụlọ ndị Livaị, n’ọnụmara n’ọnụmara. 21  Ezinụlọ ụmụ Libnaị na ezinụlọ ụmụ Shimiaị si n’ezinụlọ Geshọn.+ Ọ bụ ha bụ ndị ezinụlọ ụmụ Geshọn. 22  Ụmụ nwoke ha niile ndị e debara aha ha n’akwụkwọ, bụ́ ndị dị otu ọnwa gbagowe, dị puku asaa na narị ise (7,500).+ 23  Ndị ezinụlọ ụmụ Geshọn mara ụlọikwuu ha n’azụ ụlọikwuu ahụ,+ n’ebe ọdịda anyanwụ. 24  Onyeisi ọnụmara ụmụ Geshọn bụ Elayasaf nwa Leyel. 25  Ọrụ ụmụ Geshọn+ n’ụlọikwuu nzute bụ ilekọta ụlọikwuu ahụ na ákwà ya,+ ihe e ji kpuchie ya,+ ákwà ngebichi*+ dị n’ọnụ ụzọ e si abata n’ụlọikwuu nzute, 26  ákwà mgbochi+ ndị dị n’ogige ya, ákwà ngebichi*+ dị n’ọnụ ụzọ ogige ya nke gbara ụlọikwuu ahụ na ebe ịchụàjà gburugburu, ụdọ ndị e ji ejide ákwà ụlọikwuu ya, na ọrụ niile gbasara ihe ndị a. 27  Ezinụlọ ụmụ Amram, ezinụlọ ụmụ Izha, ezinụlọ ụmụ Hebrọn, na ezinụlọ ụmụ Ọziel si n’ezinụlọ Kohat. Ọ bụ ha bụ ndị ezinụlọ ụmụ Kohat.+ 28  Ụmụ nwoke ha niile ndị dị otu ọnwa gbagowe dị puku asatọ na narị isii (8,600). Ọrụ ha bụ ilekọta ebe nsọ.+ 29  Ndị ezinụlọ ụmụ Kohat mara ụlọikwuu ha n’ebe ndịda ụlọikwuu ahụ.+ 30  Onyeisi ọnụmara ezinụlọ ụmụ Kohat niile bụ Elizefan nwa Ọziel.+ 31  Ọrụ ha bụ ilekọta Igbe ahụ,+ tebụl,+ ihe e ji adọsa ọkụ,*+ ebe ịchụàjà+ ndị ahụ, arịa+ ndị e ji eje ozi n’ebe nsọ, ákwà ngebichi,*+ nakwa ọrụ niile gbasara ihe ndị a.+ 32  Ọ bụ Elieza nwa Erọn onye nchụàjà bụ onyeisi ndị isi+ ụmụ Livaị niile. Ọ bụ ya na-elekọta ndị na-arụ ọrụ dị iche iche n’ebe nsọ. 33  Ezinụlọ ụmụ Malaị na ezinụlọ ụmụ Mushaị si n’ezinụlọ Meraraị. Ọ bụ ha bụ ndị ezinụlọ Meraraị.+ 34  Ụmụ nwoke ha niile ndị e debara aha ha n’akwụkwọ, bụ́ ndị dị otu ọnwa gbagowe, dị puku isii na narị abụọ (6,200).+ 35  Onyeisi ọnụmara ezinụlọ Meraraị bụ Zuriel nwa Abihel. Ha mara ụlọikwuu ha n’ebe ugwu ụlọikwuu ahụ.+ 36  Ọrụ ụmụ Meraraị bụ ilekọta frem+ ụlọikwuu, okporo osisi ya,+ ogidi ya,+ ntọala ya ndị nwere oghere, arịa ya niile,+ na ọrụ niile gbasara ihe ndị a,+ 37  nakwa ogidi niile gbara ogige ya gburugburu na ntọala ha ndị nwere oghere,+ mkpọ́ ndị e ji ejide ákwà ogige ụlọikwuu, na ụdọ ndị e ji ejide ákwà ogige ya. 38  Ọ bụ Mosis na Erọn na ụmụ ya ndị nwoke mara ụlọikwuu ha n’ihu ụlọikwuu ahụ, n’ebe ọwụwa anyanwụ, n’ihu ụlọikwuu nzute. Ọ bụ ha na-elekọta ebe nsọ ahụ. Ọ bụ ọrụ ha na-arụrụ ndị Izrel. Onye ọ bụla na-abụghị onye Livaị* bịara nso, a ga-egbu ya.+ 39  Ụmụ nwoke ndị Livaị niile Mosis na Erọn debara aha ha n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ otú Jehova nyere n’iwu, bụ́ ndị dị otu ọnwa gbagowe, dị puku iri abụọ na puku abụọ (22,000). 40  Jehova sịziri Mosis: “Deba aha ụmụ nwoke niile ndị Izrel bu ụzọ mụọ n’akwụkwọ, bụ́ ndị dị otu ọnwa gbagowe.+ Gụọ ha ọnụ ma dee aha ha. 41  Kpọpụta ndị Livaị ka ha bụrụ nke m, ka ha nọchie anya nwa ọ bụla ndị Izrel bu ụzọ mụọ.+ Kpụrụkwa anụ ụlọ ndị Livaị ka ha nọchie anya anụ niile anụ ụlọ ndị Izrel bu ụzọ mụọ.+ Abụ m Jehova.” 42  Mosis wee deba aha ụmụ niile ndị Izrel bu ụzọ mụọ n’akwụkwọ otú Jehova nyere ya n’iwu. 43  Ụmụ nwoke niile e bu ụzọ mụọ e debara aha ha n’akwụkwọ, bụ́ ndị dị otu ọnwa gbagowe, dị puku iri abụọ na abụọ, narị abụọ na iri asaa na atọ (22,273). 44  Jehova gwakwara Mosis, sị: 45  “Kpọrọ ndị Livaị ka ha nọchie anya ụmụ niile ndị Izrel bu ụzọ mụọ, kpụrụkwa anụ ụlọ ndị Livaị ka ha nọchie anya anụ ụlọ ha. Ndị Livaị ga-abụ nke m. Abụ m Jehova. 46  Iji gbara+ narị mmadụ abụọ na iri asaa na atọ (273) ndị Izrel bu ụzọ mụọ, bụ́ mmadụ ole ụmụ nwoke Izrel ji karịa ndị nke Livaị,+ 47  nata shekel* ise maka otu onye.+ Ọ bụ shekel dị n’ebe nsọ* ka ị ga-eji tụọ ya. Otu shekel bụ gira* iri abụọ.+ 48  Ị ga-enye Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ego ahụ ka ọ bụrụ ego e ji gbara mmadụ ole ndị Izrel ji karịa ha.” 49  Mosis wee nata ego ole e ji gbara mmadụ ole ahụ ndị Izrel ji karịa ndị Livaị. 50  Ọ natara ego ahụ e ji gbara ndị Izrel e bu ụzọ mụọ, ya bụ, otu puku shekel, narị atọ na iri isii na ise (1,365), ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ tụọ ya. 51  Mosis nyeziri Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ego ahụ e ji gbara ndị ahụ otú Jehova kwuru, otú Jehova nyere Mosis n’iwu.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ụmụ.”
Na Hibru, “chere ọkụ.”
Na Hibru, “Onye mbịarambịa ọ bụla,” ya bụ, nwoke na-esighị n’ezinụlọ Erọn.
Na Hibru, “nwa mbụ ọ bụla meghere akpa nwa.”
Ma ọ bụ “ákwà ọnụ ụzọ.”
Ma ọ bụ “ákwà ọnụ ụzọ.”
Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”
Ma ọ bụ “ákwà ọnụ ụzọ.”
Na Hibru, “Onye mbịarambịa ọ bụla.”
Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “shekel dị nsọ.”
Otu gira bụ gram 0.57. Gụọ B14.