Ọnụ Ọgụgụ 29:1-40

  • Otú a ga-esi na-achụ àjà dị iche iche (1-40)

    • Ụbọchị a ga-afụ opi (1-6)

    • Ụbọchị Ikpuchi Mmehie (7-11)

    • Ememme Ụlọ Ndò (12-38)

29  “‘N’abalị mbụ n’ọnwa nke asaa, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ. Unu arụla ọrụ ọ bụla siri ike.+ Ọ bụ ụbọchị unu ga-afụ opi.+  Unu ga-eji otu oké ehi, otu ebule, na ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ otu afọ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ, ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma.* Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.  Unu ga-achụkọta ha na àjà ọka ha, ya bụ, ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. Ụzọ atọ n’ụzọ iri nke otu efa ga-abụ maka oké ehi ahụ, ụzọ abụọ n’ụzọ iri abụrụ maka ebule ahụ,  otu ụzọ n’ụzọ iri abụrụ maka nwa ebule nke ọ bụla n’ime ụmụ ebule asaa ahụ.  Unu ga-achụkwa otu nwa mkpi n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie a ga-eji kpuchiere unu mmehie.  Unu ga-achụ ihe ndị a n’àjà, ha na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ kwa ọnwa na àjà ọka ya na ya na-agakọ,+ chụọkwa àjà a na-esu ọkụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ.+ Unu ga-achụkọta ha na àjà mmanya ha+ otú e nyere iwu ka e si na-achụ ha, ka ha bụrụ àjà na-esi ísì ọma,* àjà a na-esu ọkụ a na-achụrụ Jehova.  “‘N’abalị iri n’ọnwa asaa ahụ, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ.+ Unu ga-emekpa onwe* unu ahụ́.* Unu arụla ọrụ ọ bụla.+  Unu ga-eji otu oké ehi, otu ebule, na ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ otu afọ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ, ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma.* Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+  Unu ga-achụkwa ha na àjà ọka ha, ya bụ, ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. Ụzọ atọ n’ụzọ iri ga-abụ maka oké ehi ahụ, ụzọ abụọ n’ụzọ iri abụrụ maka ebule ahụ, 10  otu ụzọ n’ụzọ iri abụrụ maka nwa ebule nke ọ bụla n’ime ụmụ ebule asaa ahụ. 11  Unu ga-achụkwa otu nwa ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà mmehie a ga-eji kpuchiere unu mmehie,+ chụọkwa àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ nakwa àjà mmanya ha na ha na-agakọ. 12  “‘N’abalị iri na ise n’ọnwa nke asaa, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ. Unu arụla ọrụ ọ bụla siri ike. Unu ga-emekwara Jehova ememme ruo ụbọchị asaa.+ 13  Unu ga-eji oké ehi iri na atọ, ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ,+ ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma.* Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 14  Unu ga-achụkwa ha na àjà ọka ha, ya bụ, ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. Ụzọ atọ n’ụzọ iri ga-abụ maka oké ehi nke ọ bụla n’ime oké ehi iri na atọ ahụ, ụzọ abụọ n’ụzọ iri abụrụ maka nke ọ bụla n’ime ebule abụọ ahụ, 15  otu ụzọ n’ụzọ iri abụrụ maka nwa ebule nke ọ bụla n’ime ụmụ ebule iri na anọ ahụ. 16  Unu ga-achụkwa otu nwa ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ya na ya na-agakọ.+ 17  “‘N’ụbọchị nke abụọ, unu ga-eji oké ehi iri na abụọ, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọ àjà. Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 18  Ọ bụ ole oké ehi, ebule, na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka unu ga-eji mara otú àjà ọka na àjà mmanya unu ga-achụ ga-aha. Unu ga-achụ ha otú e nyere n’iwu ka e si na-achụ ha. 19  Unu ga-achụkwa otu nwa ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ha na ha na-agakọ.+ 20  “‘N’ụbọchị nke atọ, unu ga-eji oké ehi iri na otu, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọ àjà. Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 21  Ọ bụ ole oké ehi, ebule, na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka unu ga-eji mara otú àjà ọka na àjà mmanya unu ga-achụ ga-aha. Unu ga-achụ ha otú e nyere n’iwu ka e si na-achụ ha. 22  Unu ga-achụkwa otu ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ya na ya na-agakọ.+ 23  “‘N’ụbọchị nke anọ, unu ga-eji oké ehi iri, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọ àjà. Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 24  Ọ bụ ole oké ehi, ebule, na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka unu ga-eji mara otú àjà ọka na àjà mmanya unu ga-achụ ga-aha. Unu ga-achụ ha otú e nyere n’iwu ka e si na-achụ ha. 25  Unu ga-achụkwa otu nwa ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ya na ya na-agakọ.+ 26  “‘N’ụbọchị nke ise, unu ga-eji oké ehi itoolu, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọ àjà. Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 27  Ọ bụ ole oké ehi, ebule, na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka unu ga-eji mara otú àjà ọka na àjà mmanya unu ga-achụ ga-aha. Unu ga-achụ ha otú e nyere n’iwu ka e si na-achụ ha. 28  Unu ga-achụkwa otu ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ya na ya na-agakọ.+ 29  “‘N’ụbọchị nke isii, unu ga-eji oké ehi asatọ, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọ àjà. Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 30  Ọ bụ ole oké ehi, ebule, na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka unu ga-eji mara otú àjà ọka na àjà mmanya unu ga-achụ ga-aha. Unu ga-achụ ha otú e nyere n’iwu ka e si na-achụ ha. 31  Unu ga-achụkwa otu ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ha na ya na-agakọ.+ 32  “‘N’ụbọchị nke asaa, unu ga-eji oké ehi asaa, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọ àjà. Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 33  Ọ bụ ole oké ehi, ebule, na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka unu ga-eji mara otú àjà ọka na àjà mmanya unu ga-achụ ga-aha. Unu ga-achụ ha otú e nyere n’iwu ka e si na-achụ ha. 34  Unu ga-achụkwa otu ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ya na ya na-agakọ.+ 35  “‘N’ụbọchị nke asatọ, unu ga-enwe nzukọ pụrụ iche. Unu arụla ọrụ ọ bụla siri ike.+ 36  Unu ga-eji otu oké ehi, otu ebule, na ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ otu afọ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ, ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma.* Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 37  Ọ bụ ole oké ehi, ebule, na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka unu ga-eji mara otú àjà ọka na àjà mmanya unu ga-achụ ga-aha. Unu ga-achụ ha otú e nyere n’iwu ka e si na-achụ ha. 38  Unu ga-achụkwa otu ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ya na ya na-agakọ.+ 39  “‘Unu ga na-achụrụ Jehova ihe ndị a n’àjà mgbe unu na-eme ememme unu na-eme n’oge dị iche iche,+ ha na onyinye ndị unu kwere ná nkwa+ na onyinye ndị si unu n’obi,+ ka ha bụrụ àjà unu a na-esu ọkụ+ na àjà ọka unu+ na àjà mmanya unu+ na àjà udo unu.’”+ 40  Mosis gwara ndị Izrel ihe niile Jehova nyere ya n’iwu.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
“Mmadụ imekpa onwe ya ahụ́” pụtara na onye ahụ agaghị emere onwe ya ihe ndị o kwesịrị imere onwe ya. Ibu ọnụ so na ya.
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”