Ọnụ Ọgụgụ 24:1-25

  • Ihe nke atọ Belam kwuru (1-11)

  • Ihe nke anọ Belam kwuru (12-25)

24  Mgbe Belam hụrụ na ọ dị Jehova mma ịgọzi Izrel, ọ gawaghị ọzọ ka ọ jụta ase ihe ọjọọ,+ kama o chere ihu n’ala ịkpa.  Mgbe Belam lere anya hụ ka Izrel mara ụlọikwuu ha n’ebo n’ebo,+ Chineke wụsara ya mmụọ ya.+  O wee kwuo, sị:+ “Ihe Belam nwa Biọ kwuru,Ihe nwoke e meghere anya ya emeghe kwuru,   Ihe onye na-anụ okwu Chineke kwuru,Onye hụrụ ọhụụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,Onye na-emechighị anya ya emechi kpọọ isiala:+   Jekọb, ụlọikwuu gị mara ezigbo mma,Bụ́ ebe i bi, Izrel.+   O ruru ebe dị anya ka ndagwurugwu,+Ka ubi ndị dị n’akụkụ osimiri,Ka ahịhịa alo Jehova kụrụ,Ka osisi sida ndị dị n’akụkụ mmiri.   Mmiri na-esi na bọket ya* abụọ e ji akpụkpọ anụ mee atapụsị. A na-akụ mkpụrụ ya* n’akụkụ ọtụtụ mmiri.+ Eze ya+ ga-aka Egag ukwuu,+Alaeze ya ga-adịkwa ukwuu.+   Chineke si n’Ijipt na-akpọpụta ya. Ọ bụụrụ ha mpi atụ́. Ọ ga-ebibi mba dị iche iche, bụ́ ndị na-emegbu ya.+ Ọ ga-atapịa ọkpụkpụ ha, ọ ga-ejikwa akụ́ ya gbarie ha.   Ọ makpurula. O dinarala ka ọdụm. Ebe ọ dị ka ọdụm, ònye ga-anwa anwa chọọ ya okwu? Ndị na-agọzi gị bụ ndị a gọziri agọzi. Ndị na-abụ gị ọnụ bụ ndị a bụrụ ọnụ.”+ 10  Belak wee wesa Belam ezigbo iwe. Belak kụrụ aka n’iwe sị Belam: “M kpọrọ gị ka ị bụọ ndị iro m ọnụ,+ ma naanị ihe i mere bụ ịgọzi ha ugboro atọ a. 11  Ugbu a, lawa n’ụlọ gị ozugbo. Ebu m n’obi ịkwụ gị ezigbo ụgwọ,+ ma Jehova egbochiela gị inweta ụgwọ m gaara akwụ gị.” 12  Belam sịrị Belak: “Ọ̀ bụ na mụ agwaghị ndị ozi i zitere, sị, 13  ‘Ọ bụrụgodị na Belak enye m ụlọ ya ọlaọcha na ọlaedo juru, agaghị m eji aka m eme ihe ọ bụla Jehova na-agwaghị m mee, ma ọ̀ bụ ihe ọma ma ọ̀ bụ ihe ọjọọ. Naanị ihe m ga-ekwu bụ ihe Jehova gwara m ka m kwuo’?+ 14  Ugbu a, m na-alakwuru ndị obodo m. Bịa ka m gwa gị ihe ndị a ga-eme ndị obodo gị n’ọdịnihu.”* 15  O wee kwuo, sị:+ “Ihe Belam nwa Biọ kwuru,Ihe nwoke e meghere anya ya emeghe kwuru,+ 16  Ihe onye na-anụ okwu Chineke kwuru,Onye Onye Kacha Elu mere ka ọ mara ihe,Onye hụrụ ọhụụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile Mgbe ọ na-akpọ isiala n’emechighị anya ya emechi: 17  M ga-ahụ ya, ma ọ bụghị ugbu a. M ga-ahụ ya, ma ọ gaghị abụ nso nso a. Kpakpando+ ga-esi na Jekọb pụta,Mkpanaka eze+ ga-esikwa n’Izrel pụta.+ Ọ ga-etiwa egedege ihu Moab,+Tiwaakwa okpokoro isi nke ụmụ mbibi niile. 18  Ọ ga-eweghara Ịdọm.+ N’eziokwu, ndị iro Sia+ ga-eweghara ya+Mgbe Izrel na-egosi na obi siri ya ike. 19  E nwere onye ga-esi na Jekọb na-emeri.+ Ọ ga-ebibikwa onye ọ bụla fọrọ n’obodo ahụ.” 20  Mgbe ọ hụrụ Amalek, o kwukwara, sị: “Amalek bụ mba mbụ ná mba dị iche iche.+ Ma n’ikpeazụ, ọ ga-ala n’iyi.”+ 21  Mgbe ọ hụrụ ndị Kenaịt,+ o kwukwara, sị: “Ahụ́ ruru gị ala n’ebe i bi, a rụkwara ụlọ gị n’elu nnukwu nkume. 22  Ma mmadụ ga-agba Keyin ọkụ. Gịnị ka ọ fọrọ ka Asiria dọrọ gị n’agha?” 23  O kwukwara, sị: “Chaị! Ònye ga-afọ ndụ mgbe Chineke ga-eme ihe a? 24  Ụgbọ mmiri ga-esi n’ụsọ osimiri Kitim bịa.+ Ha ga-emekpa Asiria ahụ́,+Ha ga-emekpakwa Iba ahụ́. Ma yanwa ga-alakwa n’iyi kpamkpam.” 25  Belam+ wee bilie lawa. Belak lawakwara.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ Izrel ka a na-ekwu.
O nwere ike ịbụ, “Ụmụ ya ga-ebi.”
Ma ọ bụ “ná ngwụcha ụbọchị ndị a.”