Ọnụ Ọgụgụ 15:1-41

  • Iwu ndị na-achị àjà dị iche iche (1-21)

    • Otu iwu ga na-achị nwa afọ na onye mbịarambịa (15, 16)

  • Àjà a na-achụ maka mmehie e mere n’amaghị ụma (22-29)

  • Ahụhụ a ga-ata onye kpachaara anya mehie (30, 31)

  • E gburu onye dara iwu Ụbọchị Izu Ike (32-36)

  • Ndị Izrel ga-adụnye ihe dị yọrị yọrị n’ọnụ ọnụ ala uwe ha (37-41)

15  Jehova gwara Mosis okwu ọzọ, sị:  “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Mgbe unu mechara bata n’ala m na-enye unu ka unu biri na ya,+  unu achọọ isi n’ìgwè ehi ma ọ bụ n’ìgwè ewu na atụrụ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma* unu na-achụrụ Jehova,+ ma ọ̀ bụ àjà a na-esu ọkụ+ ma ọ̀ bụ àjà mmadụ chọrọ iji mezuo nkwa pụrụ iche o kwere ma ọ̀ bụ onyinye si ya n’obi+ ọ chọrọ inye ma ọ bụ onyinye a na-enye n’oge ememme unu dị iche iche,+  onye na-eweta onyinye ya ga-ewetakwara Jehova àjà ọka, ya bụ, otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa* ntụ ọka e gwere nke ọma,+ nke a gwara otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu hin* mmanụ.  Unu ga-ejikwa otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu hin mmanya chụọ àjà mmanya mgbe unu na-achụ àjà a na-esu ọkụ+ ma ọ bụ mgbe unu ji nwa ebule ọ bụla na-achụ àjà.  Ma ọ bụ, mgbe unu na-achụ ebule n’àjà, unu ga-eji ụzọ abụọ n’ụzọ iri nke otu efa ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara otu ụzọ n’ụzọ atọ nke otu hin mmanụ chụọ àjà ọka.  Unu ga-ewetakwa otu ụzọ n’ụzọ atọ nke otu hin mmanya ka ọ bụrụ àjà mmanya. Ọ bụ àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova.  “‘Ma ọ bụrụ na unu chọrọ iji oké ehi chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ+ ma ọ bụ àjà udo+ ma ọ bụ àjà unu ji emezu nkwa pụrụ iche+ unu kwere,  unu ga-ewetakọta oké ehi ahụ na àjà ọka,+ ya bụ, ụzọ atọ n’ụzọ iri nke otu efa ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara ọkara otu hin mmanụ. 10  Unu ga-ewetakwa ọkara otu hin mmanya ka ọ bụrụ àjà mmanya.+ Ọ bụ àjà a na-esu ọkụ, àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova. 11  Ọ bụ ihe a ka a ga-eme mgbe unu na-achụ oké ehi ọ bụla ma ọ bụ ebule ọ bụla ma ọ bụ nwa ebule ọ bụla ma ọ bụ ewu ọ bụla n’àjà. 12  N’agbanyeghị ole unu na-achụ n’àjà, ọ bụ ihe a ka unu ga-eme mgbe unu na-achụ nke ọ bụla n’àjà. 13  Ọ bụ otú a ka nwa afọ Izrel ọ bụla ga-esi na-achụ àjà a na-esu ọkụ, ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova. 14  “‘Ọ bụrụ na onye mbịarambịa nke binyeere unu ma ọ bụ onye bi n’obodo unu kemgbe ọtụtụ afọ chọrọ ịchụ àjà a na-esu ọkụ ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova, o kwesịrị ịchụ ya otú unu si achụ ya.+ 15  Ọ bụ otu iwu ga na-achị ununwa ndị so n’ọgbakọ a na onye mbịarambịa binyeere unu. Ọ ga-abụ iwu ga-adịgide adịgide nke ọgbọ unu niile ga na-edebe. Unu na onye mbịarambịa ga-abụ otu n’ihu Jehova.+ 16  Otu iwu na otu ntụziaka ga na-achị unu na onye mbịarambịa binyeere unu.’” 17  Jehova gwakwara Mosis, sị: 18  “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Mgbe unu ga-abata n’ala m na-akpọga unu, 19  unu ewee rie nri* ala ahụ mepụtara,+ unu ga-enye Jehova onyinye. 20  Unu ga-eji ntụ ọka* si ná mkpụrụ mbụ+ unu wetara n’ubi mee achịcha ndị dị okirikiri ma jiri ha nye onyinye. Unu ga-enye ha n’onyinye otú unu si enye ihe si n’ebe unu na-azọcha ọka. 21  Unu ga na-enye Jehova ụfọdụ ntụ ọka si ná mkpụrụ mbụ unu wetara n’ubi ka ọ bụrụ onyinye a na-enye ya n’ọgbọ unu niile. 22  “‘Ọ bụrụ na unu emehie ma ghara ime ihe a niile Jehova nyere Mosis n’iwu, 23  ya bụ, ihe niile Jehova si n’ọnụ Mosis nye unu n’iwu, malite n’ụbọchị Jehova nyere ha n’iwu ruo n’ọgbọ unu niile, 24  ọ bụrụ na e mere ihe ahụ n’amaghị ụma, ya abụrụkwa na nzukọ unu amaghị banyere ya, nzukọ unu niile ga-achụ oké ehi n’àjà ka ọ bụrụ àjà a na-esu ọkụ, àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova. Unu ga-achụkwa àjà ọka na àjà mmanya ha na ya na-agakọ otú e nyere iwu ka e si na-achụ ha,+ jirikwa otu nwa ewu chụọ àjà mmehie.+ 25  Onye nchụàjà ga-ekpuchiri nzukọ Izrel niile mmehie ha, a ga-agbagharakwa ha mmehie ha,+ n’ihi na e mere ya n’amaghị ụma, ha wetakwara onyinye ha ka e jiri ha chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ, wetakwa àjà mmehie ha n’ihu Jehova n’ihi ihe ha mere n’amaghị ụma. 26  A ga-agbaghara nzukọ Izrel niile na ndị mbịarambịa binyeere ha n’ihi na ha niile mere mmehie ahụ n’amaghị ụma. 27  “‘Ọ bụrụ na onye* ọ bụla emehie n’amaghị ụma, ọ ga-eweta nne ewu na-agafebeghị otu afọ ka ọ bụrụ àjà mmehie.+ 28  Onye nchụàjà ga-ekpuchiri onye* ahụ mehiere n’amaghị ụma mmehie ya nke o mere n’ihu Jehova, ka e wee kpuchie mmehie ahụ. A ga-agbagharakwa ya.+ 29  Otu iwu ga na-achị ụmụ afọ Izrel na onye mbịarambịa binyeere ha ma a bịa n’ihe gbasara mmehie mmadụ mere n’amaghị ụma.+ 30  “‘Ma onye* kpachaara anya mehie,+ ma ọ̀ bụ nwa afọ ma ọ̀ bụ onye mbịarambịa, ọ na-ekwulu Jehova. A ga-egbu ya.* 31  A ga-egburịrị onye* ahụ maka na o leghaara okwu Jehova anya, mebiekwa iwu ya.+ Mmehie ya ga-adị ya n’isi.’”+ 32  Mgbe ndị Izrel nọ n’ala ịkpa, ha hụrụ otu nwoke ka ọ na-akpa nkụ n’Ụbọchị Izu Ike.+ 33  Ndị hụrụ ka ọ na-akpa nkụ kpọọrọ ya bịakwute Mosis na Erọn na nzukọ ahụ niile. 34  Ha jichiri ya+ n’ihi na e kwubeghị ihe a ga-eme ya. 35  Jehova wee gwa Mosis, sị: “A ga-egburịrị nwoke ahụ.+ Nzukọ ahụ niile ga-esi n’ebe unu mara ụlọikwuu kpọpụ ya ma tụọ ya nkume.”+ 36  Nzukọ ahụ niile wee si n’ebe ha mara ụlọikwuu kpọpụ ya ma were nkume tụgbuo ya, otú Jehova nyere Mosis n’iwu. 37  Jehova gwaziri Mosis, sị: 38  “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha na ha ga na-adụnye ihe dị yọrị yọrị n’ọnụ ọnụ ala uwe mwụda ha n’ọgbọ ha niile. Ha ga-adụnyekwa eriri na-acha anụnụ anụnụ n’elu ebe ahụ a dụnyere ihe ahụ dị yọrị yọrị n’ọnụ ọnụ ala uwe mwụda ha.+ 39  ‘Unu ga-adụnye ihe ahụ dị yọrị yọrị ka unu na-ahụ ya wee na-echeta ihe niile Jehova nyere n’iwu ma na-eme ha.+ Unu esokwala obi unu na anya unu, bụ́ ihe ndị na-eme ka unu kpaa àgwà ka ndị akwụna hapụ m fewe chi ọzọ.+ 40  Iwu a ga-eme ka unu na-echeta ihe niile m nyere n’iwu. Unu ga-emekwa ha ma bụrụ ndị dị nsọ n’anya Chineke unu.+ 41  Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu, onye kpọpụtara unu n’Ijipt iji gosi na m bụ Chineke unu.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Efa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa bụ lita 2.2. Gụọ B14.
Hin bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu hin bụ lita 3.67. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Na Hibru, “achịcha.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Hibru, “A ga-esi ná ndị ya gbupụ ya.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”