Zekaraya 7:1-14

  • Jehova anabataghị ibu ọnụ na-esighị ndị ya n’obi (1-14)

    • ‘Ọ̀ bụ m ka unu buuru ọnụ n’eziokwu?’ (5)

    • ‘Na-ekpenụ ikpe ziri ezi, na-ahụnụ ibe unu n’anya, na-emerenụ ibe unu ebere’ (9)

7  N’afọ nke anọ n’ọchịchị Eze Darayọs, Jehova gwara Zekaraya+ okwu n’abalị anọ n’ọnwa nke itoolu, ya bụ, n’ọnwa Kislev.* 2  Ndị Betel zipụrụ Shariza na Rigem-melek na ndị obodo ya ka ha gaa rịọ Jehova ka o meere ha amara.* 3  Ha sịrị ndị nchụàjà nọ n’ụlọ* Jehova nke ụsụụ ndị agha na ndị amụma: “Ọ̀ bụ anyị* bee ákwá n’ọnwa nke ise,+ gharakwa iri nri, otú anyị* merela ọtụtụ afọ?” 4  Jehova nke ụsụụ ndị agha gwara m okwu ọzọ, sị: 5  “Gwa ndị niile bi n’ala a na ndị nchụàjà, sị, ‘Mgbe unu buru ọnụ ma bee ákwá arịrị n’ọnwa nke ise nakwa n’ọnwa nke asaa+ ruo afọ iri asaa,+ ọ̀ bụ m ka unu buuru ya n’eziokwu? 6  Mgbe unu riri ihe ma ṅụọ mmanya, ọ́ bụghị onwe unu ka unu riiri ya ma ṅụọrọ ya? 7  Ọ̀ bụ na unu ekwesịghị irube isi n’okwu Jehova si n’ọnụ ndị amụma oge mbụ kwuo+ mgbe ndị mmadụ bi na Jeruselem nakwa n’obodo ya ndị gbara ya gburugburu, mgbe ha nọkwa n’udo, mgbe ndị mmadụ bikwa na Negeb* nakwa na Shefila?’”* 8  Jehova gwara Zekaraya okwu ọzọ, sị: 9  “Ihe a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Na-ekpenụ ikpe ziri ezi.+ Na-ahụnụ ibe unu n’anya,*+ na-emekwaranụ ibe unu ebere. 10  Unu erigbula nwaanyị di ya nwụrụ ma ọ bụ nwa na-enweghị nna,*+ onye ala ọzọ+ ma ọ bụ ogbenye.+ Unu akpakwala nkata ọjọọ n’obi unu ka unu mee ibe unu ihe ọjọọ.’+ 11  Ma ha ekweghị ege ntị.+ Ha mere isi ike,+ ha kpọchikwara ntị ha ka ha ghara ịnụ ihe.+ 12  Ha mere ka obi ha sie ike ka dayamọnd.*+ Ha erubeghị isi n’iwu* nakwa n’okwu Jehova nke ụsụụ ndị agha ji mmụọ ya mee ka ndị amụma oge mbụ kwuo.+ Jehova nke ụsụụ ndị agha wee wee oké iwe.”+ 13  “Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, ‘Otú ahụ ha na-egeghị ntị mgbe m* kpọrọ ha,+ agaghịkwa m ege ntị ma ha kpọọ m.+ 14  M wee jiri oké ifufe fesasịa ha ná mba niile ha na-amaghị.+ Ala ha wee tọgbọrọ chakoo mgbe ha pụchara. E nweghị onye si na ya na-agafe, e nweghịkwa onye na-alọghachi na ya+ n’ihi na ha mere ka ala ahụ mara mma bụrụ ala na-atụ ụjọ.’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Gụọ B15.
Ma ọ bụ “mee ka obi Jehova jụrụ.”
Ma ọ bụ “n’ụlọ nsọ.”
Na Hibru, “m.”
Na Hibru, “m.”
Ma ọ bụ “n’ebe ndịda.”
Ma ọ bụ “n’ebe ugwu.”
Ma ọ bụ “Na-egosinụ ibe unu ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “nwa na-enweghị nne na nna.”
O nwere ike ịbụ, “nkume siri ike,” dị ka nkume emụri.
Ma ọ bụ “ná ntụziaka.”
Na Hibru, “ọ.”