Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Rom

Isi

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16

Ihe Ndị Dị na Ya

  • 1

    • Ekele (1-7)

    • Pọl sịrị na ọ na-agụ ya agụụ ịga Rom (8-15)

    • Onye ezi omume ga-adị ndụ maka na o nwere okwukwe (16, 17)

    • Ndị ajọ omume enweghị ihe mere ha ga-eji kwuo na Chineke adịghị (18-32)

      • A na-ahụ àgwà Chineke n’ihe ndị e kere eke (20)

  • 2

    • Ikpe Chineke ga-ekpe ndị Juu na ndị Grik (1-16)

      • Otú akọnuche si arụ ọrụ (14, 15)

    • Ndị Juu na Iwu Mosis (17-24)

    • Úgwù e biri n’obi (25-29)

  • 3

    • “Ka Chineke bụrụ onye eziokwu” (1-8)

    • Ndị Juu na ndị Grik bụcha ndị mmehie (9-20)

    • Mmadụ ga-abụli onye ezi omume n’ihi okwukwe (21-31)

      • Àgwà ndị mmadụ anaghị egosi ebube Chineke (23)

  • 4

    • A kpọrọ Ebreham onye ezi omume n’ihi okwukwe ya (1-12)

      • Ebreham bụ nna ndị nwere okwukwe (11)

    • E kwere Ebreham nkwa n’ihi okwukwe ya (13-25)

  • 5

    • Kraịst mere ka anyị na Chineke dịrị ná mma (1-11)

    • Ọnwụ si n’aka Adam, ndụ si n’aka Kraịst (12-21)

      • Mmehie na ọnwụ gbasara ruo mmadụ niile (12)

      • Otu ezi omume (18)

  • 6

    • Ndị e mere baptizim ka ha na-ebi ndụ ọhụrụ (1-11)

    • Unu ekwela ka mmehie na-achị ahụ́ unu (12-14)

    • Unu kwụsịrị ịgbara mmehie ohu gbawara Chineke ohu (15-23)

      • Ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ; onyinye Chineke bụ ndụ (23)

  • 7

    • Ihe atụ gosiri otú anyị si nwere onwe anyị n’Iwu Mosis (1-6)

    • Iwu Mosis mere ka a mata ihe bụ́ mmehie (7-12)

    • Mgba mmadụ na mmehie na-agba (13-25)

  • 8

    • Mmụọ nsọ na-enye ndụ, na-emekwa ka mmadụ nwere onwe ya (1-11)

    • Mmụọ nke mere ka ha bụrụ ụmụ na-agbara ha àmà (12-17)

    • Ihe e kere eke na-atụ anya oge ụmụ Chineke ga-enwere onwe ha (18-25)

    • “Mmụọ nsọ na-arịọrọ anyị arịrịọ” (26, 27)

    • Ihe Chineke kpebiri tupu oge eruo (28-30)

    • Anyị na-emeri n’ihi na Chineke hụrụ anyị n’anya (31-39)

  • 9

    • Pọl ruuru ndị Izrel uju (1-5)

    • Ndị bụ́ ụmụ Ebreham n’eziokwu (6-13)

    • A gaghị ata Chineke ụta maka ihe o kpebiri (14-26)

      • Arịa ndị e kwesịrị ibibi ebibi na ndị nke a ga-emere ebere (22, 23)

    • Ọ bụ naanị ndị fọdụrụ ka a ga-azọpụta (27-29)

    • Izrel kpọrọ ụkwụ na nkume mkpọbi ụkwụ (30-33)

  • 10

    • Otú mmadụ ga-esi abụ onye ezi omume n’anya Chineke (1-15)

      • Ikwupụta okwukwe n’ihu ọha (10)

      • A ga-azọpụta onye na-akpọku Jehova (13)

      • Ụkwụ ndị na-ezisa ozi ọma mara mma (15)

    • Ha anabataghị ozi ọma (16-21)

  • 11

    • A jụghị Izrel kpamkpam (1-16)

    • Ihe atụ osisi oliv (17-32)

    • Amamihe Chineke enweghị atụ (33-36)

  • 12

    • Nyefeenụ ahụ́ unu ka àjà dị ndụ (1, 2)

    • Otu ahụ́ nke nwere onyinye dị iche iche (3-8)

    • Otú Ndị Kraịst kwesịrị isi na-ebi ndụ (9-21)

  • 13

    • Na-erubere ndị ọchịchị isi (1-7)

      • Ịtụ ụtụ isi (6, 7)

    • Onye hụrụ ndị ọzọ n’anya na-emezu iwu (8-10)

    • Na-akpa àgwà kwesịrị ekwesị (11-14)

  • 14

    • Kwụsịnụ ikpe ibe unu ikpe (1-12)

    • Emela ihe ga-eme ka ndị ọzọ mehie (13-18)

    • Na-eme ka gị na ndị ọzọ na-adị n’udo (19-23)

  • 15

    • Na-anabatanụ ibe unu otú Kraịst nabatara unu (1-13)

    • Pọl na-ejere mba dị iche iche ozi (14-21)

    • Ebe ndị Pọl chọrọ ịga (22-33)

  • 16

    • Pọl mere ka a mata Fibi, onye na-eje ozi (1, 2)

    • Pọl kelere Ndị Kraịst nọ na Rom (3-16)

    • Kpachara anya maka ndị na-akpata nkewa (17-20)

    • Ndị ha na Pọl na-arụkọ ọrụ kelere ụmụnna ha (21-24)

    • Ugbu a, a matala ihe dị nsọ e zoro ezo (25-27)