Mkpughe E Kpugheere Jọn 18:1-24
18 Mgbe ihe ndị a gachara, ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ si n’eluigwe na-agbadata. O nwere ikike dị ukwuu. Ebube ya mekwara ka ìhè dị n’ụwa.
2 O wee jiri oké olu tie mkpu, sị: “Babịlọn Ukwu ahụ adaala! Ọ daala!+ Ọ ghọọla ebe ndị mmụọ ọjọọ bi nakwa ebe ndị mmụọ ọjọọ* na nnụnụ niile na-adịghị ọcha, nke rụkwara arụ, na-ezo!+
3 N’ihi na o meela ka mba niile ṅụọ mmanya ya nke na-eme ka ịkwa iko* gụsiwe ha agụụ ike.+ Ya na ndị eze nke ụwa kwakwara iko.+ Ndụ okomoko ọ na-ebi emeekwala ka ndị ahịa nke ụwa baa ọgaranya.”
4 Anụkwara m ka olu ọzọ si n’eluigwe sị: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta,+ ma ọ bụrụ na unu achọghị iso ya mehie, ọ bụrụkwa na unu achọghị ka a taa unu ahụhụ a ga-ata ya.+
5 Mmehie ya karịrị akarị,*+ Chineke ga-ekpekwa ya ikpe maka ihe ọjọọ ndị o mere.+
6 Mee ya ihe ndị o mere ndị ọzọ,+ meekwa ha ya okpukpu abụọ.+ Jiri iko ahụ+ ọ gbanyere mmanya a gwara agwa gbanyere ya ụdị mmanya ahụ okpukpu abụọ.+
7 Otú ahụ o toro onwe ya, biekwa ndụ okomoko, ị ga-esi otú ahụ mekpaa ya ahụ́, meekwa ka o ruo uju. N’ihi na ọ na-asị n’obi ya: ‘Abụ m eze nwaanyị nọ n’ocheeze. Abụghị m nwaanyị isi mkpe. E nweghịkwa mgbe m ga-eru uju.’+
8 Ọ bụ ya mere a ga-eji taa ya ahụhụ niile a ga-ata ya n’otu ụbọchị. Ọ ga-eru uju. Ọ ga-anọ n’ụkọ nri. Ọ ga-anwụ, a ga-akpọkwa ya ọkụ kpamkpam,+ n’ihi na Jehova* Chineke, bụ́ onye mara ya ikpe, dị ike.+
9 “Ndị eze ụwa, ndị ha na ya kwara iko,* ndị nwetakwara ihe ná ndụ okomoko o biri, ga-ebere ya ákwá, tie aka n’obi, ruokwara ya uju, mgbe ha ga na-ele anwụrụ ọkụ nke si n’ọkụ a na-akpọ ya.
10 Ha ga-eguzo n’ebe dị anya n’ihi ụjọ ha na-atụ maka ahụ́ a na-emekpa ya. Ha ga-asịkwa: ‘Babịlọn, obodo ukwu,+ obodo dị ike, ihe nke a mere gị ajọgbuola onwe ya. Chineke ekpeela gị ikpe n’otu awa.’
11 “Ndị ahịa ụwa na-ebere ya ákwá, na-erukwara ya uju, n’ihi na e nweghịzi onye ga-azụ ngwá ahịa ha.
12 Ngwá ahịa ha bụ ọlaedo, ọlaọcha, nkume dị oké ọnụ,* nkume pel, ezigbo ákwà linin, ákwà na-acha pọpụl, ákwà silk, ákwà na-acha uhie uhie,* osisi ọ bụla na-esi ísì ọma, ụdị ihe ọ bụla e ji ọdụ́ mee, ụdị ihe ọ bụla e ji osisi dị oké ọnụ mee, ihe e ji ọla kọpa mee, na nke e ji ígwè mee, nakwa nke e ji nkume mabụl mee.
13 Ngwá ahịa ha ndị ọzọ bụ sinamọn, ihe na-esi ísì ọma nke si India, insens,* mmanụ na-esi ísì ọma, frankinsens, mmanya, mmanụ oliv, ntụ ọka e gwere nke ọma, ọka wit, ehi, atụrụ, ịnyịnya, ụgbọ ịnyịnya, ndị ohu, na ndị ọzọ.*
14 Ihe ọma* ndị gụrụ gị* agụụ anaghịzi eru gị aka. Ihe niile dị ụtọ na ihe ndị mara ezigbo mma i nwere alaala n’iyi. A gaghịkwa ahụ ha ọzọ.
15 “Ndị na-ere ihe ndị a, ndị nwaanyị ahụ mere ka ha baa ọgaranya, ga-eguzo ebe dị anya n’ihi egwu ha na-atụ ahụ́ a na-emekpa ya. Ha ga-ebe ákwá, ruokwa uju,
16 sị: ‘Obodo ukwu, ihe nke a mere gị ajọgbuola onwe ya. Ị na-eyi ezigbo ákwà linin na nke na-acha pọpụl na ákwà na-acha uhie uhie. Ị na-ejikwa ihe ndị e ji ọlaedo mee na nkume dị oké ọnụ* na nkume pel achọ onwe gị mma.+
17 Akụnụba a niile ị kpakọtara alaala n’iyi n’otu awa.’
“Ndị isi ụgbọ niile, ndị niile na-eji ụgbọ mmiri aga ebe ha na-aga, ndị na-akwọ ụgbọ mmiri nakwa ndị niile na-anọ n’oké osimiri akpa afọ ha, guzokwa n’ebe dị anya
18 tie mkpu ka ha nọ na-ele anwụrụ ọkụ nke si n’ọkụ na-agba ya. Ha sịrị: ‘Olee obodo yiri obodo ukwu a?’
19 Ha wụkwasịkwara ájá n’isi ha, tiekwa mkpu, na-ebe ákwá, na-erukwa uju, na-asị: ‘Obodo ukwu, ihe nke a mere gị ajọgbuola onwe ya. Ndị niile nwere ụgbọ mmiri n’oké osimiri si n’akụnụba gị baa ọgaranya. A laala gị n’iyi n’otu awa.’+
20 “Unu ndị nọ n’eluigwe+ na unu ndị nsọ+ na ndịozi na ndị amụma, ṅụrịanụ ọṅụ n’ihi ihe e mere ya, maka na Chineke amaala ya ikpe maka ihe ndị o mere unu!”+
21 Otu mmụọ ozi dị ike wee buru otu nkume yiri nnukwu nkume e ji egwe nri tụba ya n’oké osimiri, sị: “Otú a ka a ga-esi atụda obodo ukwu a bụ́ Babịlọn ngwa ngwa. A gaghịzi ahụ ya ọzọ.+
22 A gaghịkwa anụ ụda egwú nke ndị na-akpọ ụbọ, na-agụkwa egwú, na ụda egwú nke ndị na-akụ egwú na nke ndị na-egbu ọjà na nke ndị na-afụ opi n’ime gị ọzọ. A gaghịkwa ahụ omenkà nke na-arụ ụdị ọrụ ọ bụla n’ime gị ọzọ. A gaghịkwa anụ ụda nkume e ji egwe nri n’ime gị ọzọ.
23 Ọkụ* agaghịkwa enwu n’ime gị ọzọ. A gaghịkwa anụ olu nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ na nke nwaanyị a na-alụ ọhụrụ n’ime gị ọzọ. N’ihi na ndị ahịa gị bụ ndị nọ n’ọkwá ukwu n’ụwa. I jikwa mgbaasị ị na-eme+ duhie mba niile.
24 A hụkwara ọbara ndị amụma na nke ndị nsọ+ na nke ndị niile e gburu n’ụwa n’ime gị.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “mmụọ na-adịghị ọcha.” O nwere ike ịbụ, “ume; ikuku ọjọọ; okwu ndị mmụọ ọjọọ.”
^ Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ma ọ bụ “kpụkọtara ọnụ ruo eluigwe.”
^ Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”
^ Ma ọ bụ “nkume pụrụ iche.”
^ Ma ọ bụ “na-acha ọbara ọbara.”
^ Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
^ Na Grik, “Mkpụrụ osisi ọma.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”
^ Ma ọ bụ “nkume pụrụ iche.”
^ Ma ọ bụ “Ìhè oriọna.”