Ozi Ọma Matiu Dere 8:1-34

  • Jizọs gwọrọ onye ekpenta (1-4)

  • Onyeisi ndị agha nke nwere okwukwe (5-13)

  • Jizọs gwọrọ ọtụtụ ndị na Kapaniọm (14-17)

  • Otú e si eso ụzọ Jizọs (18-22)

  • Jizọs mere ka ebili mmiri dajụọ (23-27)

  • Jizọs gwara ndị mmụọ ọjọọ ka ha banye n’ime ìgwè ézì (28-34)

8  Mgbe o si n’ugwu ahụ rịdata, oké ìgwè mmadụ sooro ya.  Ma, otu onye ekpenta bịara kpọọrọ ya isiala, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị ga-emeli ka m dị ọcha.”+  O wee matịa aka bitụ ya aka, sị: “Achọrọ m. Dị ọcha.”+ Ozugbo ahụ, a gwọrọ ya ekpenta ya.+  Jizọs wee sị ya: “Ya enwekwala onye ị ga-akọrọ ya,+ kama gaa gosi onye nchụàjà onwe gị,+ nyekwa onyinye Mosis kwuru ka a na-enye,+ ka e wee mara na a gwọọla gị.”  Mgbe ọ banyere Kapaniọm, otu onyeisi ndị agha bịakwutere ya, na-arịọ ya,+  sị: “Nna anyị ukwu, onye na-ejere m ozi dina n’ụlọ. Ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ na-atakwa ezigbo ahụhụ.”  Ọ sịrị ya: “M rute ebe ahụ, m ga-agwọ ya.”  Onyeisi ndị agha ahụ asị ya: “Nna anyị ukwu, ekwesịghị m ka ị bata n’ụlọ m, kama kwuo naanị okwu, ahụ́ ga-adị onye na-ejere m ozi mma.  N’ihi na n’agbanyeghị na m nọ n’okpuru ndị ọzọ, e nwekwara ndị agha nọ n’okpuru m. M na-asị onye agha nke a, ‘Gawa!’ ya agawa. M na-asịkwa onye nke ọzọ, ‘Bịa!’ ya abịa. M na-asịkwa ohu m, ‘Mee nke a!’ ya emee ya.” 10  Mgbe Jizọs nụrụ ihe a, o juru ya anya, ya asị ndị so ya: “Ana m agwa unu eziokwu, ahụtụbeghị m onye okwukwe ya siri ike otú a n’Izrel.+ 11  Ma ana m asị unu na ọtụtụ ndị si n’ebe ọwụwa anyanwụ nakwa n’ebe ọdịda anyanwụ ga-abịa soro Ebreham na Aịzik na Jekọb nọdụ na-eri ihe na tebụl n’Alaeze eluigwe,+ 12  ma, a ga-achụpụ ụmụ Alaeze n’ọchịchịrị dị n’èzí. N’ebe ahụ ka ha ga-anọ na-ebe ákwá, na-atakwa ikikere ezé.”+ 13  Jizọs wee sị onyeisi ndị agha ahụ: “Lawa. Ka e meere gị ihe ị rịọrọ n’ihi na i nwere okwukwe.”+ E wee gwọọ onye ahụ na-ejere ya ozi mgbe ahụ.+ 14  Mgbe Jizọs batara n’ụlọ Pita, ọ hụrụ nne nwunye Pita+ ka o dina ala n’ihi na ahụ́ ọkụ ji ya.+ 15  O wee bitụ ya aka n’aka,+ ahụ́ ọkụ ahụ akwụsị. Nwaanyị ahụ bilikwara jewere ya ozi. 16  Ma mgbe o ruru ná mgbede, ndị mmadụ kpọtaara ya ọtụtụ ndị ndị mmụọ ọjọọ ji. O wee gwa ndị mmụọ ọjọọ ahụ okwu, ha ahapụ ndị ahụ ha ji. Ọ gwọkwara ndị niile ahụ́ na-adịghị mma, 17  ka ihe Chineke si n’ọnụ Aịzaya onye amụma kwuo wee mezuo. Ọ sịrị: “O buuru ọrịa anyị niile, burukwa nrịanrịa anyị.”+ 18  Mgbe Jizọs hụrụ ìgwè mmadụ gburugburu ya, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na ya banye n’ụgbọ mmiri gaa n’ofe nke ọzọ.+ 19  Otu onye odeakwụkwọ bịara sị ya: “Onye Ozizi, m ga-eso gị jee ebe ọ bụla ị na-eje.”+ 20  Ma Jizọs sịrị ya: “Nkịta ọhịa nwere ọgba, nnụnụ nwekwara akwụ́, ma Nwa nke mmadụ enweghị ebe ọ na-atọgbọ isi ya.”+ 21  Onye ọzọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya wee sị ya: “Onyenwe anyị, hapụ m ka m buru ụzọ gaa lie nna m.”+ 22  Ma, Jizọs sịrị ya: “Na-eso m. Hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie ndị ha nwụrụ anwụ.”+ 23  Mgbe ọ banyere n’ụgbọ mmiri, ndị na-eso ụzọ ya sooro ya.+ 24  Ma, oké ifufe malitere ife n’oké osimiri ahụ, nke mere ka ebili mmiri na-ekpuchi ụgbọ ahụ, ma, ọ na-ehi ụra.+ 25  Ha wee bịa kpọtee ya, sị: “Onyenwe anyị, zọpụta anyị, mmiri na-achọ iri anyị!” 26  Ma ọ sịrị ha: “Gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu,* unu ndị okwukwe nta?”+ O wee bilie baara ifufe ahụ na oké osimiri ahụ mba, ebe niile wee daa jụụ.+ 27  O wee ju ha anya, ha asị: “Olee ụdị mmadụ onye a bụ? Ifufe na oké osimiri na-erubedịrị ya isi.” 28  Mgbe o ruru n’ofe nke ọzọ, n’obodo ndị Gadara, ya na mmadụ abụọ mmụọ ọjọọ ji, ndị si n’ebe a na-eli ozu na-apụta,+ zuru n’ụzọ. Ha na-akpa ajọ ike, nke na ọ dịghị onye egwu na-ekwe ịgafe n’ụzọ ahụ. 29  Ma, ha tiri mkpu, sị: “Ọkpara Chineke,+ gịnị jikọrọ anyị na gị? Ị̀ bịara ebe a imekpa anyị ahụ́+ tupu oge a kara aka eruo?”+ 30  Ma ìgwè ézì nọ na-ata ahịhịa n’ebe dị anya n’ebe ha nọ.+ 31  Ndị mmụọ ọjọọ ahụ wee malite ịrịọ ya, sị: “Ọ bụrụ na ị chụpụ anyị, hapụ anyị ka anyị banye n’ime ìgwè ézì ndị ahụ.”+ 32  O wee sị ha: “Banyenụ!” Ha wee pụta banye n’ime ézì ndị ahụ. Ìgwè ézì ahụ niile nuuru daba n’oké osimiri ma nwụọ n’ime mmiri. 33  Ma ndị na-azụ ézì ndị ahụ gbara ọsọ. Mgbe ha banyere n’obodo, ha kọrọ ihe niile mere, kọọkwa gbasara ndị ahụ mmụọ ọjọọ ji. 34  Obodo ahụ niile wee pụta ka ha hụ Jizọs. Mgbe ha hụrụ ya, ha rịọrọ ya ka o si n’ógbè ha pụọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “obi ji na-amapụ unu.”