Ozi Ọma Matiu Dere 17:1-27
17 Mgbe ụbọchị isii gachara, Jizọs kpọọrọ Pita na Jems na Jọn nwanne ya gbagoo n’ugwu dị oké elu.+
2 O wee nwoghaa n’ihu ha, ihu ya achawa ka anyanwụ, uwe elu ya ana-enwukwa gbaa* dị ka ìhè.+
3 Ma, Mosis na Ịlaịja pụtara n’ihu ha, ha na ya ana-akparịta ụka.
4 Pita wee sị Jizọs: “Onyenwe anyị, ọ dị mma na anyị nọ ebe a. Ị chọọ, m ga-ama ụlọikwuu atọ ebe a, otu maka gị, otu maka Mosis, otu maka Ịlaịja.”
5 Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, ígwé ojii na-enwu gbaa kpuchiri ha, otu olu esikwa n’ígwé ojii ahụ, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya. Ihe ya masịrị m.+ Geenụ ya ntị.”+
6 Mgbe ha nụrụ ihe a, ndị na-eso ụzọ ya gburu ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala, ezigbo ụjọ wee jide ha.
7 Jizọs wee bịa, bitụ ha aka, sị: “Bilienụ. Unu atụla egwu.”
8 Mgbe ha leliri anya, e nweghịzi onye ha hụrụ ma e wepụ Jizọs.
9 Mgbe ha si n’ugwu ahụ na-agbadata, Jizọs gwara ha, sị: “Unu akọrọla onye ọ bụla ọhụụ a ruo mgbe a kpọlitere Nwa nke mmadụ n’ọnwụ.”+
10 Ma, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya, sị: “Gịnịzi mere ndị odeakwụkwọ ji ekwu na Ịlaịja ga-ebu ụzọ bịa?”+
11 Ọ gwara ha, sị: “N’eziokwu, Ịlaịja na-abịa. Ọ ga-emekwa ka ihe niile dị otú ha dị na mbụ.+
12 Ma, ana m agwa unu na Ịlaịja abịala n’eziokwu, ma ha amataghị ya, kama ha mere ya ihe masịrị ha.+ Otú a kwa ka ha ga-esi taa Nwa nke mmadụ ahụhụ.”+
13 Mgbe ahụ ka ndị na-eso ụzọ ya ghọtara na ọ na-agwa ha banyere Jọn Onye Na-eme Baptizim.
14 Mgbe ha bịara ebe ìgwè mmadụ nọ,+ otu nwoke bịakwutere ya, gbuoro ya ikpere n’ala, sị ya:
15 “Onyenwe anyị, meere nwa m nwoke ebere, n’ihi na ọ bụ onye akwụkwụ, ọnọdụ ya dịkwa njọ. Ọ na-adabakarị n’ọkụ, na-adabakwa na mmiri ọtụtụ mgbe.+
16 M kpọtaara ya ndị na-eso ụzọ gị, ma ha enweghị ike ịgwọ ya.”
17 Jizọs wee sị: “Unu ọgbọ na-enweghị okwukwe, nke rụkwara arụ,+ ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ tupu unu enwee okwukwe? Ruo ole mgbe ka m ga na-edi ihe unu na-eme? Kpọtara m ya ebe a.”
18 Jizọs wee baara mmụọ ọjọọ ahụ mba, ya esi n’ime nwatakịrị nwoke ahụ pụta. E wee gwọọ ya n’oge ahụ.+
19 Ndị na-eso ụzọ Jizọs wee bịakwute ya mgbe naanị ya nọ, sị: “Gịnị mere na anyị achụpụlighị ya?”
20 O wee sị ha: “Ọ bụ n’ihi na okwukwe unu dị ntakịrị. N’ihi na n’eziokwu, ana m asị unu, ọ bụrụ na unu enwee okwukwe há ka mkpụrụ osisi mọstad, unu ga-asị ugwu a, ‘Si ebe a gafee ebe nke ọzọ,’ ọ ga-agafe, ọ dịghịkwa ihe na-agaghị ekwe unu omume.”+
21 * ——
22 Ọ bụ mgbe ha zukọtara na Galili ka Jizọs sịrị ha: “A ga-arara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị mmadụ.+
23 Ha ga-egbu ya, a ga-akpọlitekwa ya n’ụbọchị nke atọ.”+ Ihe a wutere ndị na-eso ụzọ ya nke ukwuu.
24 Mgbe ha bịarutere Kapaniọm, ụmụ nwoke ndị na-anakọta ụtụ mkpụrụ ego drakma abụọ* bịakwutere Pita, sị ya: “Onye ozizi unu ọ̀ na-atụ ụtụ isi?”+
25 O wee sị: “Ee, ọ na-atụ.” Ma, mgbe ọ banyere n’ime ụlọ, Jizọs bu ụzọ sị ya: “Saịmọn, gịnị ka i chere? N’aka ole ndị ka ndị eze ụwa na-anata ụtụ ahịa ma ọ bụ ụtụ isi? Ọ̀ bụ n’aka ụmụ ha, ka ọ̀ bụ n’aka ndị bịara abịa?”
26 Mgbe ọ sịrị: “Ọ bụ n’aka ndị bịara abịa,” Jizọs asị ya: “Ọ bụrụ otú ahụ, ụmụ ha ekwesịghị ịtụ ụtụ.
27 Ma ka ha ghara ilewe anyị anya ọjọọ,+ gaa n’oké osimiri, tụnye nko azụ̀, werekwa azụ̀ mbụ i gbutere. Mgbe i meghere ọnụ ya, ị ga-ahụ otu mkpụrụ ego ọlaọcha.* Were ya nye ha maka mụ na gị.”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “ana-achakwa ọcha.”