Joel 2:1-32
2 “Fụọnụ opi na Zayọn.+
Tienụ mkpu agha n’ugwu nsọ m.
Ka ndị niile bi n’ala a* maa jijijiMaka na ụbọchị Jehova na-abịa.+ Ọ dị nso.
2 Ọ bụ ụbọchị ọchịchịrị na itiri,+Ụbọchị ígwé ojii na oké ọchịchịrị.+
Ọ dị ka ìhè nke na-enwu n’ugwu mgbe chi na-abọ.
E nwere mba nke ndị ya dị ọtụtụ ma dị ike.+
E nwetụbeghị mba dị ka ya,E nweghịkwa mgbe a ga-enwe ọzọ dị ka yaN’afọ niile nke ọgbọ niile.
3 Ọkụ na-erepịa ihe niile dị n’ihu ya,Ire ọkụ na-erepịakwa ihe niile dị n’azụ ya.+
Ala dị n’ihu ya dị ka ogige Iden,+Ma ihe dị n’azụ ya bụ ala ịkpa nke a na-enweghị ihe dị na ya,E nweghịkwa ihe na-afọ ndụ.
4 Ọ dị ka ịnyịnya,Ha na-agbakwa ọsọ ka ịnyịnya agha.+
5 Mkpọtụ ha na-eme mgbe ha na-awụgharị n’elu ugwu dị ka nke ụgbọ ịnyịnya.+
Ọ dị ka mkpọtụ ọkụ nke na-erepịa ahịhịa ọka.
Ọ dị ka mba dị ike, nke a haziri ahazi maka ịlụ agha.+
6 Ndị mmadụ ga-ahụsi anya n’ihi ha.
Ihu niile ga-achagharị.
7 Ha na-ebu agha ka ndị dike.
Ha na-arịfere mgbidi ka ndị agha.
Onye nke ọ bụla na-anọ n’ebe o kwesịrị ịnọ,Ha anaghịkwa ahapụ ụzọ ha.
8 Ha anaghị enupụ ibe ha.
Onye nke ọ bụla na-aga n’ebe o kwesịrị ịga.
Ọ bụrụgodị na akụ́* atụta ụfọdụ, ha adaa,Ndị nke ọzọ anaghị akwụsị ịga ebe ha na-aga.
9 Ha ji ọsọ abanye n’ime obodo. Ha na-agba ọsọ ná mgbidi.
Ha na-arịgo n’elu ụlọ. Ha na-esi na windo abanye ka ndị ohi.
10 Ha bịawa, ala na-ama jijiji, eluigwe na-amakwa jijiji.
Anyanwụ na ọnwa agbaala ọchịchịrị.+
Kpakpando anaghịzi enye ìhè ha.
11 Jehova ga-ekwu okwu n’ihu ndị agha ya+ n’ihi na ndị agha ya dị nnọọ ọtụtụ.+
N’ihi na Chineke na-emezu ihe o kwuru, ọ dịkwa ike;*
N’ihi na ụbọchị Jehova bụ ụbọchị ukwu, ndị mmadụ ga-atụkwa egwu n’ụbọchị ahụ.+
Ònye ga-edili ya?”+
12 Ihe a bụ ihe Jehova kwuru: “Ma ugbu a, jirinụ obi unu niile+Lọghachikwute m. Buonụ ọnụ,+ beenụ ákwá, beekwanụ ákwá arịrị.
13 Dọwaanụ obi unu,+ ọ bụghị uwe unu.+
Lọghachikwutenụ Jehova bụ́ Chineke unu,N’ihi na o nwere ọmịiko,* na-emekwa ebere. Ọ naghị ewe iwe ọsọ ọsọ,+ ịhụnanya ya dịkwa ukwuu.+
Ọ ga-agbanwe obi ya, hapụzie iweta ọdachi ahụ.*
14 Ònye manụ ma ọdachi ahụ ọ̀ ga-ewute ya, ya agbanwee obi ya+
Ma gọzie unu,Ka unu wee chụọrọ Jehova bụ́ Chineke unu àjà ọka na àjà mmanya?
15 Fụọnụ opi na Zayọn.
Kwuonụ ka e buo ọnụ. Maanụ ọkwa ka e nwee nzukọ pụrụ iche.+
16 Kpọkọtanụ mmadụ niile. Doonụ ọgbakọ ahụ nsọ.+
Kpọkọtanụ ndị agadi.* Kpọkọtanụ ụmụaka na ụmụ na-aṅụ ara.+
Ka nwoke lụrụ nwaanyị ọhụrụ si n’ọnụ ụlọ ya dị n’ime pụta, ka nwaanyị a lụrụ ọhụrụ sikwa n’ọnụ ụlọ ya pụta.
17 Ka ndị nchụàjà, bụ́ ndị na-ejere Jehova ozi, bee ákwáN’agbata ebe e si abanye n’ụlọ nsọ na ebe ịchụàjà+ ma sị:
‘Jehova, meere ndị gị ebere.
Emela ka ndị i ketara bụrụ ihe e ji eme ihe ọchị.
Ekwela ka ndị mba ọzọ chịwa ha.
Gịnị mere ndị mmadụ ga-eji kwuo, sị: “Ebee ka Chineke ha nọ?”’+
18 Jehova ga-anụrụ ala ya ọkụ n’obi,Ọ ga-emetekwara ndị ya ebere.*+
19 Jehova ga-aza ndị ya, sị ha:
‘Lee, ana m ezitere unu ọka* na mmanya ọhụrụ na mmanụ,Unu ga-erijukwa afọ.+
Agaghịzi m eme ka mba dị iche iche kparịa unu.+
20 M ga-achụpụ ndị si n’ebe ugwu ka ha nọrọ n’ebe dị anya n’ebe ị nọ;M ga-achụsasị ha, chụga ha n’ala kpọrọ nkụ ọ na-enweghị ihe dị na ya,Chụga ndị nọ n’ihu* n’oké osimiri dị n’ebe ọwụwa anyanwụ*Ma chụga ndị nọ n’azụ n’oké osimiri dị n’ebe ọdịda anyanwụ.*
Ísì ọjọọ ha ga-esi n’ala ahụ.
Ísì ha nke jọgburu onwe ya ga na-esi n’ala ahụ,+N’ihi na Chineke ga-eme oké ihe.’
21 Ala, atụla egwu.
Nwee obi ụtọ, ṅụrịakwa ọṅụ n’ihi na Jehova ga-eme oké ihe.
22 Anụ ọhịa, atụla egwu,N’ihi na ahịhịa ndụ ga-eju n’ebe anụmanụ na-ata ahịhịa n’ala ịkpa,+Osisi ga-amịkwa mkpụrụ.+
Osisi fig na osisi vaịn ga-amịzucha mkpụrụ ha.+
23 Unu ụmụ Zayọn, nweenụ obi ụtọ, ṅụrịakwanụ ọṅụ n’ihi ihe Jehova bụ́ Chineke unu ga-eme;+N’ihi na ọ ga-eme ka ụbịa mmiri zooro unu otú o kwesịrị,Ọ ga-emekwa ka oké mmiri ozuzo zooro unu,Ma ụbịa mmiri ma ụla mmiri, otú ha na-ezobu.+
24 Ezigbo ọka* ga-eju n’ebe a na-azọcha ọka,
Mmanya ọhụrụ na mmanụ ga-ejukwa n’ebe a na-azọchapụta mmanya.+
25 M ga-enyeghachi unu ihe ndị funahụrụ unu n’afọ ndị ahụIgurube ndị na-abịa n’ìgwè richapụrụ ihe unu, ha na igurube ndị na-enweghị nku, igurube ndị na-erichapụ ihe ọ bụla ha hụrụ nakwa igurube ndị na-eri ihe ọsọ ọsọ,Bụ́ ìgwè ndị agha m m zitere ka ha mesie unu ike.+
26 N’eziokwu, unu ga-eri ihe, rijuo afọ.+
Unu ga-etokwa aha Jehova bụ́ Chineke unu,+Onye meere unu ihe ndị dị ebube.
A gaghị eme ka ihere mee ndị m ọzọ.+
27 Unu ga-amarakwa na m nọnyeere Izrel*+Nakwa na m bụ Jehova bụ́ Chineke unu,+ e nweghị Chineke ọzọ.
A gaghị eme ka ihere mee ndị m ọzọ.
28 Mgbe e mechara, m ga-awụkwasị mmụọ m+ n’ahụ́ ụdị mmadụ ọ bụla.
Ụmụ unu ndị nwoke na ụmụ unu ndị nwaanyị ga-ebukwa amụma,Ndị agadi nwoke unu ga-arọ nrọ,Ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụụ.+
29 N’oge ahụ, m ga-awụkwasịkwa mmụọ mN’ahụ́ ndị ohu m ndị nwoke nakwa n’ahụ́ ndị ohu m ndị nwaanyị.
30 M ga-emekwa ihe ndị dị ịtụnanya* n’eluigwe na n’ụwa,Meekwa ka e nwee ọbara na ọkụ na ogidi anwụrụ ọkụ.+
31 A ga-eme ka anyanwụ ghọọ ọchịchịrị, meekwa ka ọnwa ghọọ ọbara+Tupu oké ụbọchị Jehova, bụ́ ụbọchị dị egwu, abịa.+
32 A ga-azọpụta onye ọ bụla na-akpọku aha Jehova.+
N’ihi na a ga-enwe ndị a ga-echebe n’Ugwu Zayọn nakwa na Jeruselem,+ otú Jehova kwuru,Bụ́ ndị lanahụrụnụ, ndị Jehova na-akpọ.”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “n’ụwa.”
^ Ma ọ bụ “ngwá ọgụ.”
^ O nwere ike ịbụ, “N’ihi na onye na-emezu okwu Chineke dị ike.”
^ Ma ọ bụ “Ọdachi ahụ ga-ewute ya.”
^ “Ma ọ bụ “ọ na-eme amara.”
^ Ma ọ bụ “ndị okenye.”
^ Ma ọ bụ “ga-enwekwara ndị ya ọmịiko.”
^ Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
^ Na Hibru, “Chụga ihu ya.”
^ Ya bụ, Oké Osimiri Nnu.
^ Ya bụ, Oké Osimiri Mediterenian.
^ Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
^ Ma ọ bụ “m nọ n’etiti Izrel.”
^ Ma ọ bụ “ihe àmà.”

