Jeremaya 50:1-46

  • E buru amụma ihe ga-eme ndị Babịlọn (1-46)

    • Sinụ na Babịlọn gbapụ (8)

    • A ga-akpọghachite ndị Izrel (17-19)

    • Mmiri ndị dị na Babịlọn ga-ata (38)

    • Babịlọn agaghịzi abụ ebe a ga-ebi ebi (39, 40)

50  E nwere ihe Jehova si n’ọnụ Jeremaya onye amụma kwuo banyere Babịlọn,+ ya bụ, ndị Kaldia. Ọ sịrị:  2  “Kọọnụ ya ná mba dị iche iche, kọsaakwanụ ya. Gwunyenụ ihe ndị mmadụ ga-ahụ gbakọta. Kọsaakwanụ ya. Unu ezola ihe ọ bụla ezo. Sịnụ, ‘E wegharala Babịlọn.+ E menyela Bel ihere.+ Ụjọ ejidela Merodak. E menyela arụsị niile dị na Babịlọn ihere. Ụjọ ejidekwala arụsị ya niile na-asọ oyi.’*  3  N’ihi na otu mba esila n’ebe ugwu bịa lụso ya agha.+ Mba ahụ mere ala ya ihe na-eju ndị mmadụ anya. E nweghịzi onye bi na ya. Ma mmadụ ma anụ ụlọ agbapụchaala. Ha agbafuola.” 4  Jehova kwuru, sị, “N’oge ahụ, ndị Izrel na ndị Juda ga-abụ otu.+ Ha ga-ebere ákwá na-aga.+ Ha ga-ejikọkwa aka na-arịọ Jehova bụ́ Chineke ha ka ọ na-edu ha.+ 5  Ha ga na-ajụ ajụjụ ụzọ e si aga Zayọn. Ha ga-eche ihu n’ụzọ ahụ,+ na-asị, ‘Bịanụ ka anyị na Jehova gbaa ndụ nke ga-adịru mgbe ebighị ebi, nke a na-agaghịkwa echefu echefu.’+ 6  Ndị m aghọọla ìgwè atụrụ furu efu.+ Ndị na-azụ ha mere ka ha kpafuo.+ Ha du ha na-agagharị n’ugwu dị iche iche. Ha si n’otu ugwu ha agaa n’ugwu ọzọ. Ha echefuola ebe ha na-anọ ezu ike. 7  Mgbe ndị iro ha hụrụ ha, ha bibiri ha,+ kwuokwa, sị, ‘Ikpe amaghị anyị, n’ihi na ha emehiela Jehova, onye ezi omume si n’aka ya, ya bụ, Jehova, onye ndị nna nna ha ji nwee olileanya.’”  8  “Sinụ na Babịlọn gbapụ,Sikwanụ n’ala ndị Kaldia pụọ.+ Dịrịnụ ka mkpi ma ọ bụ ebule nke na-ebutere ìgwè ewu ma ọ bụ ìgwè atụrụ ụzọ.  9  M ga-eme ka ọtụtụ mba ukwu ndị si n’ala dị n’ebe ugwuBịa lụso Babịlọn agha.+ Ha ga-ahazi onwe ha n’usoro lụso ya agha. Ha ga-esi ebe ahụ weghara ya. Akụ́ ha yiri nke onye aghaNke na-agbawa ndị mụrụ ụmụ aka ụmụ,+Nke na-anaghị alọta n’emeghị ihe ọ gara. 10  Kaldia ga-abụ ihe a kwatara n’agha.+ Afọ ga-eju ndị niile ga-akwakọrọ ihe dị n’ime ya.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. 11  “N’ihi na mgbe unu nọ na-ebukọrọ ngwongwo ndị m,+Unu na-aṅụrị ọṅụ,+ na-enwekwa obi ụtọ. N’ihi na unu nọ na-awụgharị ka nwa ehi nke nọ n’ebe ahịhịa dị. Unu nọkwa na-ebe ubé ka oké ịnyịnya. 12  E menyere nne unu ihere.+ E mechuru nwaanyị mụrụ unu ihu. Mba niile kacha ya. Ọ bụ ala ịkpa mmiri na-adịghị, bụrụkwa ọzara.+ 13  Mmadụ agaghị ebi n’ime ya n’ihi iwe Jehova.+ Ọ ga-atọgbọrọ nkịtị.+ Onye ọ bụla na-agafe Babịlọn ga-ekporopụ anya na-ele ya Ma fụọ mkpọrọhịhị n’ihi ọdachi niile dakwasịrị ya.+ 14  Ndị niile na-ekwe ụta,Hazienụ onwe unu n’usoro, si n’akụkụ niile lụso Babịlọn agha. Gbaanụ ya ụta. Unu agbafọkwala akụ́ ọ bụla,+N’ihi na ọ bụ Jehova ka o mehiere.+ 15  Sinụ n’akụkụ niile tie mkpu agha ka a lụso ya agha. Ọ chịliela aka elu. Ogidi ya niile adaala. A kwatuola mgbidi ya niile.+ Ọ bụ otú Jehova si kwụọ ya ụgwọ ihe o mere.+ Megwaranụ ya. Meenụ ya ihe o mere ndị ọzọ.+ 16  Gbuonụ onye na-agha mkpụrụ na BabịlọnNakwa onye ji mma na-ewe ihe ubi.+ Onye ọ bụla ga-alakwuru ndị ya, onye ọ bụla ga-agbalakwa n’ala ya,N’ihi na onye iro ji mma agha na-egbu ndị mmadụ n’emeghị ebere.+ 17  “Ndị Izrel bụ ìgwè atụrụ a chụsasịrị achụsasị.+ Ọ bụ ọdụm chụsasịrị ha.+ Eze Asiria bu ụzọ rie anụ ha,+ Nebukadneza* eze Babịlọn atazie ọkpụkpụ ha.+ 18  N’ihi ya, Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị: ‘M ga-emesi eze Babịlọn na ndị obodo ya ike, otú ahụ m mere eze Asiria.+ 19  M ga-akpọghachite Izrel n’ala ya ebe anụmanụ na-ata ahịhịa.+ Izrel ga-atakwa ahịhịa n’ugwu Kamel nakwa na Beshan.+ Afọ ga-ejukwa ya* n’ugwu ndị dị n’Ifrem+ nakwa n’ugwu ndị dị na Gilied.’”+ 20  Jehova kwuru, sị, “N’oge ahụ,A ga-achọ ebe Izrel si mehie,Ma a gaghị ahụ. A gaghịkwa ahụ ebe Juda si mehie,N’ihi na m ga-agbaghara ndị m hapụrụ ka ha dịrị ndụ.”+ 21  Jehova kwuru, sị, “Lụso ndị bi na Merateyim na ndị bi na Pikọd agha.+ Ka e gbuchapụ ha, laakwa ha n’iyi. Mee ihe niile m gwara gị mee. 22  A na-anụ mkpọtụ agha n’ala a,Ya bụ, mkpọtụ ọdachi dị egwu. 23  A gbajiela hama na-akụri mba dị iche iche n’ụwa, laakwa ya n’iyi.+ Ihe e mere Babịlọn na-eju mba dị iche iche anya.+ 24  Babịlọn, m siiri gị ọnyà, ya ama gị. Ma ị maghị. A chọtara gị ma jide gị,+N’ihi na ọ bụ Jehova ka ị lụsoro ọgụ. 25  Jehova emegheela ebe ọ na-akwasa ngwá agha. O bupụtakwala ngwá agha o ji egosi na iwe ji ya.+ N’ihi na Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha,Nwere ọrụ ọ ga-arụ n’ala ndị Kaldia. 26  Sinụ ebe dị anya bịa lụso ya agha.+ Megheenụ ebe ọ na-echekwa mkpụrụ.+ Chịkọtanụ ihe ya ndị unu chịịrị otú e si achịkọta ọka. Bibienụ ya kpamkpam.+ Ya enwekwala onye ga-afọdụ n’obodo ya. 27  Gbuonụ oké ehi ya niile.+ Ka e gbuo ha niile. Ha ga-ata ahụhụ n’ihi na ụbọchị ha ga-aza ajụjụ eruola,Ya bụ, oge a ga-elebara ha anya. 28  A na-anụ mkpọtụ ndị na-agba ọsọ,Ya bụ, ndị si n’ala Babịlọn na-agbapụ,Na-agbaga Zayọn ka ha kọsaa na Jehova bụ́ Chineke anyị atawala ndị iro ya ahụhụ. Ọ na-ata ha ahụhụ n’ihi ụlọ nsọ ya.+ 29  Kpọkọọnụ ndị na-agba ụtaNa ndị niile na-ekwe ụta ka ha lụso Babịlọn agha.+ Maanụ ụlọikwuu gburugburu ya. Unu ekwekwala ka onye ọ bụla si na ya gbapụ. Kwụọnụ ya ụgwọ ihe o mere.+ Meenụ ya ihe niile o mere ndị ọzọ.+ N’ihi na ọ bụ Jehova, bụ́ Onye Nsọ Izrel,Ka ọ na-egosi na ya dị mpako.+ 30  N’ụbọchị ahụ, ụmụ okorobịa ya ga-ada n’ámá ya dị iche iche.+ A ga-egbukwa ndị agha ya niile.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. 31  Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kwukwara, sị, “Onye mpako,+ m ga-ata gị ahụhụ,+N’ihi na ụbọchị m ga-elebara gị anya ga-abịa, ya bụ, oge m ga-eme ka ị zaa ajụjụ ihe i metara. 32  Onye mpako, ị ga-ada, daruo ala. E nweghịkwa onye ga-ekulite gị.+ M ga-esunye obodo gị ọkụ. Ọ ga-erepịakwa obodo niile ị na-achị.” 33  Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị: “A na-emegbu ndị Izrel na ndị Juda. Ndị niile dọọrọ ha n’agha ekweghị ahapụ ha.+ Ha ekweghị ahapụ ha ka ha laa.+ 34  Ma, Onye Mgbapụta ha dị ike.+ Jehova nke ụsụụ ndị agha bụ aha ya.+ Ọ ga-ekpechite ọnụ ha,+Iji mee ka udo dị n’ala ha,+Meekwa ka ndị bi na Babịlọn maa jijiji.”+ 35  Jehova kwukwara, sị, “A ga-eji mma agha gbuo ndị KaldiaNa ndị bi na Babịlọn, ndị isi ha, na ndị ha ma ihe.+ 36  A ga-eji mma agha gbuo ndị na-etu ọnụ.* Ha agaghịkwa ama ihe ha na-eme eme. A ga-eji mma agha gbuo ndị agha Babịlọn, ụjọ ga-ejidekwa ha.+ 37  A ga-eji mma agha gbuo ịnyịnya ha, bibiekwa ụgbọ ịnyịnya agha ha,Gbuokwa ndị niile si ebe dị iche iche nọ n’ime ya. Ha ga-adịkwa ka ụmụ nwaanyị.+ A ga-eji mma agha bibie akụ̀ ya, bukọrọkwa ya.+ 38  A ga-ala mmiri niile dị na Babịlọn n’iyi, ha ataa.+ N’ihi na ọ bụ ala arụsị a pịrị apị juru.+ Ha na-emekwa ara ara n’ihi ọhụụ na-emenye ụjọ ha na-ahụ. 39  N’ihi ya, anụ ọhịa ndị na-ebi n’ọzara na anụ ndị na-agbọ ụja ga-ebikọ. Enyí nnụnụ ga-ebikwa na Babịlọn.+ Mmadụ agaghịzi ebi na ya. Ọ gaghịkwa abụ ebe a ga-ebi ebi n’ọgbọ niile.”+ 40  Jehova kwuru, sị, “Otú ahụ a na-enweghị onye bi na Sọdọm na Gọmọra+ na obodo ndị dị ha nso+ mgbe e bibichara ha, ka a na-agaghị enwe onye ọbịa ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ ga-ebi na Babịlọn.+ 41  E nwere ndị si n’ebe ugwu na-abịa. A ga-emekwa ka otu nnukwu mba na ndị eze ndị dị ebube+Si n’ime ime ụwa kpara ike na-apụta.+ 42  Ha ma otú e si agba ụta na otú e si atụ árọ̀.+ Obi tara ha mmiri. Ha agaghịkwa eme ebere.+ Ha gbara ịnyịnya ha na-aga,Ha na-eme mkpọtụ ka ebili mmiri na-eme n’oké osimiri.+ Babịlọn,* ha agbakọọla aka, haziekwa onwe ha n’usoro ịlụso gị agha.+ 43  Eze Babịlọn anụla akụkọ ha,+Obi awụnye ya n’afọ.+ Ezigbo ụjọ ejidela ya. Ahụ́ na-egbukwa ya mgbu ka nwaanyị na-amụ nwa. 44  “Otú ahụ ọdụm si esi n’oké ọhịa dị n’akụkụ Osimiri Jọdan apụta, ka a ga-enwe onye ga-abịa ibibi ebe a rụsiri ike anụmanụ na-ata ahịhịa na Babịlọn. Ma, m ga-eme ka onye ahụ si ebe ahụ gbaa ọsọ n’otu ntabi anya. M ga-ahọpụtakwa onye ga na-achị ya.+ Ònye dị ka m? Ònye ga-amakwa m aka? Olee onye ọzụzụ atụrụ ga-emeli ka m ghara ime ihe m chọrọ ime?+ 45  N’ihi ya, nụrụnụ ihe Jehova kpebiri ime Babịlọn,+ na ihe o bu n’obi ime ala ndị Kaldia. N’eziokwu, a ga na-akpụrụ ụmụ atụrụ si n’ìgwè atụrụ ha. Ọ ga-eme ka ebe ha na-ata ahịhịa tọgbọrọ nkịtị n’ihi ihe ndị bi na ha mere.+ 46  Mgbe a ga-eweghara Babịlọn, ụwa ga-ama jijiji. A ga na-anụkwa mkpu ákwá ndị mmadụ na-eti ná mba dị iche iche.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọ ga-abụ na ihe a kpọrọ arụsị ndị ahụ n’asụsụ Hibru bụ nwanne okwu Hibru ọzọ nke pụtara “nsị.” E ji ya egosi na ihe na-asọ oyi.
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
Ma ọ bụ “ndị amụma ụgha.”
Na Hibru, “Ada bụ́ Babịlọn.”