Jeremaya 49:1-39

  • E buru amụma ihe ga-eme ndị Amọn (1-6)

  • E buru amụma ihe ga-eme ndị Ịdọm (7-22)

  • E buru amụma ihe ga-eme ndị Damaskọs (23-27)

  • E buru amụma ihe ga-eme ndị Kida na ndị Hezọ (28-33)

  • E buru amụma ihe ga-eme ndị Ịlam (34-39)

49  Jehova kwuru gbasara ndị Amọn,+ sị: “Ọ̀ bụ na Izrel amụghị ụmụ? Ka ọ̀ bụ na o nweghị onye ga-eketa ihe ya? Gịnị mere Malkam+ ji weghara ala Gad?+ Gịnịkwa mere ndị na-efe ya ji biri n’obodo ndị dị n’Izrel?”  2  “Jehova kwuru, sị, ‘Oge na-abịaMgbe m ga-eme ka a nụ ụda opi agha* ndị na-alụso Raba+ bụ́ obodo ndị Amọn+ agha. Obodo ahụ ga-aghọ ebe e bibiri ebibi,A ga-agbakwa ime obodo ndị dị ya nso* ọkụ.’ Jehova kwukwara, sị, ‘Izrel ga-eweghara ala a napụrụ ya.’+  3  ‘Heshbọn, besiwe ákwá ike, n’ihi na e bibiela E-aị. Ime obodo ndị dị Raba nso, tienụ mkpu ákwá. Yirinụ ákwà iru uju. Besienụ ákwá ike. Wagharịanụ n’ogige anụ ụlọ ndị e ji nkume gbaa,*N’ihi na a ga-adọrọ Malkam n’agha,Ya na ndị nchụàjà ya na ndị isi na-efe ya.+  4  Obodo ndị bi na ya na-anaghị erube isi,Gịnị mere unu ji jiri ndagwurugwu unu ndị mmiri na-asọ na-etu ọnụ? Unu tụkwasịrị akụ̀ unu obi,Na-asị, “Ònye ga-abịa lụso anyị agha?”’”  5  “Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kwuru, sị,‘M ga-eme ka ndị niile gbara unu gburugburu mee unu ihe dị egwu. A ga-achụsasị unu. E nweghịkwa onye ga-akpọkọta ndị gbara ọsọ.’”  6  “Jehova kwukwara, sị, ‘Ma e mechaa, m ga-akpọkọta ndị Amọn a dọọrọ n’agha.’” 7  Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru banyere Ịdọm, sị: “Ọ̀ bụ na amamihe adịghịzi na Timan?+ Ezigbo ndụmọdụ ọ̀ kọla ụkọ n’ọnụ ndị na-aghọta ihe? Amamihe ha ọ́ baghịzi uru?  8  Ndị bi na Didan,+ gbaanụ ọsọ, gbapụnụ. Gbaganụ ebe dị n’ime ime zoo,N’ihi na m ga-eme ka ọdachi dakwasị ỊsọN’oge m ga-ata ya ahụhụ.  9  Ọ bụrụ na ndị na-aghọ mkpụrụ vaịn abata n’ime gị,Ọ̀ bụ na ha agaghị aghọfọ mkpụrụ? Ọ bụrụ na ndị ohi abịa n’abalị,Ha ga-ewere naanị ihe ndị ha chọrọ.+ 10  Ma m ga-agba Ịsọ ọtọ. M ga-eme ka a mara ebe niile ọ na-ezo,Ka ọ ghara inwe ebe ọ ga-ezo. A ga-egbu ụmụ ya na ụmụnne ya na ndị agbata obi ya.+ Ha agaghịzi adị.+ 11  Hapụrụ m ụmụaka gị na-enweghị nna. M ga-echebe ha ndụ. Ụmụ nwaanyị isi mkpe nọ n’ime gị ga-atụkwasịkwa m obi.” 12  N’ihi na Jehova kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ndị a na-amaghị ikpe ga-aṅụrịrị ihe dị n’iko na-egosi na iwe ji m, è kwesịrị ịhapụ gịnwa kpamkpam n’ataghị gị ahụhụ? A gaghị ahapụ gị n’ataghị gị ahụhụ, n’ihi na ị ga-aṅụrịrị ihe dị n’iko ahụ.”+ 13  Jehova sịrị, “Ejirila m onwe m ṅụọ iyi na a ga-akọcha Bọzra, laa ya n’iyi, jiri ya na-abụ ọnụ. Ihe a a ga-eme ya ga-ejukwa ndị mmadụ anya.+ A ga-alakwa obodo ya niile n’iyi ruo mgbe ebighị ebi.”+ 14  E nwere ozi m nụrụ Jehova ziri. E nwekwara onye ozi e zigara ná mba dị iche iche, ya ana-asị: “Zukọtanụ, lụso Ịdọm agha. Jikerenụ ịlụso ya agha.”+ 15  “Lee, emeela m ka ị ghara ịbụ ihe ọ bụla n’anya mba dị iche iche, Meekwa ka ndị mmadụ na-eleda gị anya.+ 16  Onye bi n’ebe mgbaba nke dị na nkume dị elu,Onye bi n’elu elu ugwu,Ụjọ i mere ka a na-atụ gịNa mpako nke juru gị obi eduhiela gị. Ọ bụ eziokwu na ị kpara akwụ́ gị n’ebe dị elu ka ugo,M ga-akwatu gị ebe ahụ.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. 17  “Ihe a ga-eme Ịdọm ga-eju ndị mmadụ anya.+ Onye ọ bụla nke na-agafe n’obodo a ga-ekporopụ anya na-ele ya, na-afụkwa mkpọrọhịhị n’ihi ahụhụ niile a tara ya. 18  Otú ahụ a na-enweghị onye bi na Sọdọm na Gọmọra na obodo ndị dị ha nso+ mgbe e bibichara ha, ka a na-agaghị enwe onye ọbịa ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ ga-ebi n’Ịdọm.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. 19  “Otú ahụ ọdụm si esi n’oké ọhịa dị n’akụkụ Osimiri Jọdan apụta,+ ka a ga-enwe onye ga-abịa ibibi ebe a rụsiri ike anụmanụ na-ata ahịhịa n’Ịdọm. Ma, m ga-eme ka onye ahụ si ebe ahụ gbaa ọsọ n’otu ntabi anya. M ga-ahọpụtakwa onye ga na-achị ya. Ònye dị ka m? Ònye ga-amakwa m aka? Olee onye ọzụzụ atụrụ ga-emeli ka m ghara ime ihe m chọrọ ime?+ 20  N’ihi ya, nụrụnụ ihe Jehova kpebiri ime Ịdọm na ihe o bu n’obi ime ndị bi na Timan:+ N’eziokwu, a ga na-akpụrụ ụmụ atụrụ si n’ìgwè atụrụ ha. Ọ ga-eme ka ebe ha na-ata ahịhịa tọgbọrọ nkịtị n’ihi ihe ndị bi na ha mere.+ 21  Mgbe ha ga-ada, ụwa ga-ama jijiji n’ihi ụda ọdịda ha. A ga-eti mkpu ákwá. Ụda ya ga-eruchadị n’Oké Osimiri Uhie.+ 22  Onye iro ga-efeli ma fedata n’ike buru ihe otú ugo si eburu.+ Ọ ga-agbasakwa nku ya ka o buru Bọzra.+ N’ụbọchị ahụ, obi ga na-akụ ndị agha Ịdọm kpum kpumOtú ọ na-akụ nwaanyị ime na-eme.” 23  Ihe a ka e kwuru banyere Damaskọs:+ “Ihere emeela Hemat+ na Apad,N’ihi na ha anụla akụkọ ọjọọ. Obi awụnyela ha n’afọ. Oké osimiri na-eme mkpọtụ. O nweghịkwa ike ịda jii. 24  Obi esighịzi Damaskọs ike. Ọ tụgharịala ka ọ gbalaga. Ezigbo ụjọ ejidela ya. Ọ nọ n’ahụhụ. Ahụ́ na-egbukwa ya mgbuOtú ọ na-egbu nwaanyị na-amụ nwa. 25  Gịnị mere na ndị mmadụ agbapụbeghị n’obodo a na-aja mma,Bụ́ obodo ndị bi na ya na-enwe aṅụrị? 26  Ụmụ okorobịa ya ga-ada n’ámá ya dị iche iche. A ga-egbukwa ndị agha ya niile n’ụbọchị ahụ.” Ọ bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru ihe a. 27  “M ga-esunye mgbidi Damaskọs ọkụ. Ọkụ ahụ ga-erepịakwa ụlọ elu Ben-hedad.”+ 28  E nwere ihe Jehova kwuru banyere Kida+ na alaeze Hezọ, bụ́ ndị Nebukadneza* eze Babịlọn meriri. Ọ sịrị: “Bilienụ gaa Kida. Gbuokwanụ ndị bi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ. 29  A ga-anara ha ụlọikwuu ha, ìgwè ewu na atụrụ ha,Ákwà ụlọikwuu ha na ngwongwo ha niile. A ga-anapụkwa ha kamel ha. Ndị mmadụ ga na-etikwa mkpu, sị, ‘Ụjọ dị ebe niile!’” 30  Jehova kwuru, sị, “Ndị bi na Hezọ,Gbaanụ ọsọ. Gbaganụ ebe dị anya. Gbaganụ ebe dị n’ime ime. N’ihi na Nebukadneza* eze Babịlọn akpaala nkata ihe ọ ga-eme unu. O chepụtakwala ihe ọ ga-eme unu.” 31  Jehova kwukwara, sị, “Bilienụ lụso mba bi n’udo,Ndị obi rukwara ala, agha.” Ha enweghị ibo ụzọ na ihe e ji atụchi ụzọ. Ha bi naanị ha. 32  A ga-achịkọrọ kamel ha,Chịkọrọkwa ìgwè anụ ụlọ ha. M ga-achụsasị ha ebe niile,Ya bụ, ndị kpụrụ ajị ndị dị n’akụkụ ntị ha abụọ akpụ.+ M ga-emekwa ka ọdachi si ebe niile dakwasị ha.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. 33  “Hezọ ga-aghọ ọgba nkịta ọhịa. Ọ ga-atọgbọrọkwa nkịtị ruo mgbe ebighị ebi. A gaghị enwe onye ọbịa ga-ebi na ya. A gaghịkwa enwe onye ọ bụla ọzọ ga-ebi na ya.” 34  E nwere ihe Jehova gwara Jeremaya onye amụma gbasara Ịlam+ n’oge Zedekaya malitere ịchị+ Juda. Ọ sịrị: 35  “Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, ‘M ga-agbaji ụta ndị Ịlam,+ bụ́ ebe ike ha dị.* 36  M ga-eme ka ifufe si n’akụkụ anọ nke ụwa fee* n’Ịlam. M ga-ejikwa ifufe ndị a chụsasịa ha. Ọ dịghị mba ndị Ịlam a chụsasịrị achụsasị na-agaghị aga.’” 37  Jehova kwukwara, sị, “M ga-eme ka ụjọ jide ndị Ịlam n’ihu ndị iro ha nakwa n’ihu ndị na-achọ igbu ha.* M ga-ewesa ha ezigbo iwe, mee ka ọdachi dakwasị ha. M ga-emekwa ka mma agha na-achụ ha ruo mgbe m bibichara ha.” 38  Jehova sịrị, “M ga-ebusa ocheeze m n’Ịlam.+ M ga-egbukwa eze ya na ndị isi ya.” 39  “Ma n’oge ikpeazụ, m ga-akpọkọta ndị Ịlam a dọọrọ n’agha.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “olu ákwá ndị agha.”
Ma ọ bụ “obodo ndị gbara ya gburugburu.”
Ma ọ bụ “n’ogige atụrụ.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Na Hibru, “malitere.”
Na Hibru, “M ga-eme ka ifufe anọ ndị si na nsọtụ anọ nke eluigwe fee.”
Ma ọ bụ “ndị na-achọ mkpụrụ obi ha.”