Jeremaya 46:1-28

  • E buru amụma ihe ga-eme Ijipt (1-26)

    • Nebukadneza ga-emeri Ijipt (13,26)

  • Nkwa ndị e kwere ndị Izrel (27, 28)

46  E nwere ihe Jehova gwara Jeremaya onye amụma banyere mba dị iche iche.+ 2  Ihe a ka o kwuru gbasara Ijipt,+ ya bụ, gbasara ndị agha Fero+ Niko bụ́ eze Ijipt, onye Nebukadneza* eze Babịlọn meriri na Kakemish, n’akụkụ Osimiri Yufretis, n’afọ nke anọ n’ọchịchị Jehoyakim+ nwa Josaya, bụ́ eze Juda:  3  “Hazienụ obere ọta unu na ọta ukwu unu. Pụtakwanụ maka ịlụ agha.  4  Ndị na-agba ịnyịnya, kwadebenụ ịnyịnya unu, nọrọkwanụ n’elu ha. Kpurunụ okpu agha unu ma jikere ịlụ agha. Meenụ ka ube unu na-egbu maramara, yirikwanụ uwe agha.  5  Jehova kwuru, sị, ‘Gịnị mere m ji ahụ ka ezigbo ụjọ ji ha? Ha na-alaghachi azụ, a na-emerikwa ndị dike ha. Ha agbaala ọsọ n’ihi ụjọ, ndị dike ha anaghịkwa ele anya n’azụ. Ụjọ jikwa mmadụ niile.  6  Ndị nwere ụkwụ ọsọ agaghị agbapụli. Ndị dike agaghịkwa erili mbọmbọ. Ike agwụla ha. Ha adaakwala n’ebe ugwu,N’akụkụ Osimiri Yufretis.’+  7  Ònye bụ onye a nke na-eto ka Osimiri Naịl,Na-etokwa ka osimiri ndị mmiri ha na-amali elu?  8  Ijipt na-eto ka Osimiri Naịl+Nakwa ka osimiri mmiri ya na-amali elu. Ọ na-asị, ‘M ga-eto kpuchie ụwa. M ga-ebibi obodo na ndị bi na ya.’  9  Ịnyịnya dị iche iche, gbagoonụ. Ụgbọ ịnyịnya dị iche iche, gbawanụ ara ara. Ka ndị dike n’agha pụta. Ka ndị Kush na ndị Pọt, bụ́ ndị na-eji ọta, pụtakwa.+ Ka ndị Ludim,+ bụ́ ndị na-ekwe ụta ma na-agba ya,+ pụtakwa. 10  “Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha. Ọ bụ ụbọchị ọ ga-egbu ndị iro ya n’ihi ihe ha mere. Mma agha ga-eri ha rijuo afọ, ṅụjuokwa ọbara ha afọ, n’ihi na Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, weere ozu ndị a ka àjà a chụụrụ ya n’ebe ugwu, n’akụkụ Osimiri Yufretis.+ 11  Ndị Ijipt,* gaanụ Gilied nweta mmanụ balsam.+ Ọtụtụ ihe ndị unu nwetaraIji gwọọ onwe unu ọrịa abaghị uru,N’ihi na unu enweghị ngwọta.+ 12  Mba dị iche iche anụla otú e si menye unu ihere.+ A na-anụkwa mkpu unu na-eti n’obodo a niile. Otu dike na-adagide dike ọzọ. Ha abụọ na-adarukwa ala.” 13  Jehova gwara Jeremaya onye amụma gbasara mgbe Nebukadneza* eze Babịlọn ga-abịa ịlụso ndị Ijipt agha.+ Ọ gwara ya, sị: 14  “Kọọnụ ya n’Ijipt, kwusaanụ ya na Migdọl.+ Kwusaakwanụ ya na Nọf* nakwa na Tapanhis.+ Sịnụ, ‘Nọrọnụ ebe unu kwesịrị ịnọ, jikerekwanụ,N’ihi na a ga-eji mma agha gbuo ndị niile gbara unu gburugburu. 15  Gịnị mere e ji kpochapụ ndị agha unu dị ike? Ha enweghị ike ịkwụrụ n’ụkwụ ha,N’ihi na Jehova akwatuola ha. 16  Ha na-akpọ ụkwụ n’ihe, na-adakwa n’ìgwè n’ìgwè. Ha na-agwakwa ibe ha, sị: “Bilienụ, ka anyị laghachikwuru ndị obodo anyị na ndị ikwu anyịN’ihi mma agha e ji na-egbu anyị n’eleghị anya n’azụ.”’ 17  Ndị agha unu ahụ dị ike kwusara ebe ahụ, sị,‘Ọ bụ naanị mkpọtụ ka Fero eze Ijipt na-eme. Ọ hapụla ohere* ọ gaara eji mee ihe, ya agafee.’+ 18  Eze, onye aha ya bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kwuru, sị,‘Ebe ọ bụ na m na-adị ndụ, ọ* ga-abata, dịrị otú ugwu Tebọ+ dị n’etiti ugwu ndị ọzọ,Dịrịkwa otú ugwu Kamel+ dị n’akụkụ oké osimiri. 19  Ndị bi n’Ijipt,Kwakọtanụ ngwongwo unu ga-ebu mgbe a ga-adọrọ unu n’agha. N’ihi na Nọf* ga-aghọ ihe na-awụ akpata oyi. A ga-agba ya ọkụ.* E nweghịkwa onye ga-ebi na ya.+ 20  Ijipt yiri nwa ehi ahụ́ dị mma. Ma, anwụnta ga-esi n’ebe ugwu bịa taa ya. 21  Ndị agha o goro ọrụ, bụ́ ndị nọ n’ime ya, yikwara ụmụ ehi gbara agba. Ma ha niile atụgharịala gbaa ọsọ. Ha enwelighị ike ịkwụrụ n’ụkwụ ha,+N’ihi na ọdachi adakwasịla haN’oge m na-ekpe ha ikpe.’ 22  ‘Ọ na-eti mkpu, olu ya ana-ada ka agwọ na-agba ọsọ,N’ihi na ha ji anyụike bịakwute ya n’ike,Dị ka ndị na-egbutu osisi.’* 23  Jehova kwuru, sị, ‘Ha ga-asụ oké ọhịa ya, n’agbanyeghị na o yiri ebe a na-agaghị abanyeli abanye. Ha dị ọtụtụ karịa igurube. E nweghịkwa ike ịgụta ha ọnụ. 24  A ga-emenye ndị bi n’Ijipt* ihere. A ga-enyefe ha n’aka ndị si n’ebe ugwu.’+ 25  “Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, sịrị: ‘Ugbu a, m ga-ata Emọn+ bụ́ chi ndị Noo* ahụhụ,+ taakwa Fero, ndị Ijipt, chi ha dị iche iche,+ na ndị eze ha. M ga-ata Fero na ndị niile tụkwasịrị ya obi ahụhụ.’+ 26  “Jehova kwuru, sị, ‘M ga-enyefe ha n’aka ndị na-achọ igbu ha,* ya bụ, n’aka Nebukadneza* eze Babịlọn+ na ndị na-ejere ya ozi. Ma, ndị mmadụ ga-emecha biri n’Ijipt otú ha bi ya n’oge gara aga.’+ 27  ‘Ma gịnwa bụ́ Jekọb ohu m, atụla egwu. Izrel, atụkwala ụjọ.+ N’ihi na m ga-esi ebe dị anya zọpụta gị,Zọpụtakwa ụmụ* gị n’ala a dọọrọ ha n’agha laa.+ Jekọb ga-alọta. Ahụ́ ga-erukwa ya ala. E nweghị ihe ga-enye ya nsogbu. E nweghịkwa onye ga-emenye ya ụjọ.’+ 28  Jehova kwuru, sị, ‘Jekọb ohu m, atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị. M ga-ebibi mba niile m chụgara gị n’ala ha.+ Ma agaghị m ebibi gị.+ Kama, m ga-adọ gị aka ná ntị* otú kwesịrị ekwesị.+ M ga-atarịrị gị ahụhụ.’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Na Hibru, “Ada na-amaghị nwoke bụ́ Ijipt.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “Memfis.”
Na Hibru, “oge a kara aka.”
Ya bụ, onye ga-emeri Ijipt.
Ma ọ bụ “Memfis.”
O nwere ike ịbụ, “Ọ ga-abụ ala na-abaghị uru.”
Ma ọ bụ “ndị na-akpa nkụ.”
Na Hibru, “ada bụ́ Ijipt.”
Ya bụ, Tibs.
Ma ọ bụ “na-achọ mkpụrụ obi ha.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Ma ọ bụ “m ga-agbazi gị.”