Jeremaya 27:1-22

  • Yok eze Babịlọn (1-11)

  • A gwara Zedekaya ka o jewere eze Babịlọn ozi (12-22)

27  Ná mmalite ọchịchị Jehoyakim nwa Josaya, bụ́ eze Juda, Jehova gwara Jeremaya okwu. 2  Jeremaya kwuziri, sị: “Jehova gwara m, sị, ‘Tụhịa eriri n’osisi yok dị iche iche, nyarakwa ha n’olu. 3  Were ha nye ndị ozi bịara Jeruselem ịhụ Zedekaya bụ́ eze Juda ka hanwa gaa nye ha eze Ịdọm,+ eze Moab,+ eze ndị Amọn,+ eze Taya,+ na eze Saịdọn.+ 4  Gwa ha ka ha gwa ndị eze ha, sị: “‘“E nwere ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru. Gwanụ ndị eze unu na o kwuru, sị, 5  ‘Ọ bụ mụnwa ji ike m na-enweghị atụ na aka m siri ike kee ụwa, keekwa mmadụ na anụmanụ ndị bi na ya. Enyekwala m ya onye ọ masịrị m inye ya.*+ 6  Ugbu a, enyela m ohu m bụ́ Nebukadneza,+ eze Babịlọn, ala a niile. Enyekwala m ya anụ ọhịa dị iche iche ka ha na-ejere ya ozi. 7  Mba niile ga na-ejere ya na nwa ya na nwa nwa ya ozi ruo mgbe alaeze ya na-agaghịzi adị,+ mgbe ọtụtụ mba na ndị eze ukwu ga-eji ya mere ohu.’+ 8  “‘“Jehova kwuru, sị, ‘Ọ bụrụkwa na mba ma ọ bụ alaeze ọ bụla ajụ ijere Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn ozi, jụkwa ịnyara yok eze Babịlọn n’olu, m ga-eji mma agha,+ ụnwụ, na ọrịa na-efe efe taa mba ahụ ahụhụ. M ga-esi n’aka Nebukadneza tagide ha ahụhụ ruo mgbe ha gwụchara.’ 9  “‘“‘N’ihi ya, unu egela ndị amụma unu ntị, ha na ndị na-agbara unu afa na ndị na-akọwara unu nrọ na ndị na-emere unu anwansi* nakwa ndị dibịa afa unu, bụ́ ndị na-agwa unu, sị: “Unu agaghị ejere eze Babịlọn ozi.” 10  Ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu, ọ bụrụkwa na unu egee ha ntị, a ga-esi n’ala unu kpọga unu ebe dị anya. M ga-achụsasị unu, unu alaakwa n’iyi. 11  “‘“Jehova kwuru, sị, ‘Ma mba nke ga-anyara yok eze Babịlọn n’olu wee na-ejere ya ozi, m ga-eme ka ọ nọgide* n’ala ya, na-akọ ihe na ya, birikwa na ya.’”’” 12  M gwakwara Zedekaya+ bụ́ eze Juda ihe a niile, sị: “Nyaranụ yok eze Babịlọn n’olu, na-ejekwaranụ ya na ndị ya ozi ka unu wee dịrị ndụ.+ 13  Gịnị mere gị na ndị gị ga-eji kwe ka mma agha,+ ụnwụ,+ na ọrịa na-efe efe+ gbuo unu otú Jehova kwuru na ha ga-egbu mba na-ejereghị eze Babịlọn ozi? 14  Unu egela ndị na-eburu unu amụma ntị. Ha na-asị unu, ‘Unu agaghị ejere eze Babịlọn ozi.’+ Ma, ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu.+ 15  “Jehova kwuru, sị, ‘Ọ bụghị m gwara ha ihe ha na-agwa unu. Ha na-ebu amụma ụgha n’aha m. Ọ bụrụkwa na unu egee ha ntị, m ga-achụsasị unu, unu alaakwa n’iyi, ma unu ma ndị amụma na-eburu unu amụma.’”+ 16  M gwara ndị nchụàjà na ndị a niile, sị: “Jehova kwuru, sị, ‘Unu egela ntị n’ihe ndị amụma na-eburu unu amụma na-ekwu, sị: “N’oge na-adịghị anya, a ga-esi Babịlọn bulata arịa ndị na-adị n’ụlọ Jehova.”+ Ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu.+ 17  Unu egela ha ntị. Na-ejerenụ eze Babịlọn ozi ka unu wee dịrị ndụ.+ Ma unu jụ ijere ya ozi, obodo a ga-abụzi ebe e bibiri ebibi. 18  Ma ọ bụrụ na ha bụ ndị amụma, ọ bụrụkwa na Jehova na-agwa ha okwu, biko, ka ha rịọ Jehova nke ụsụụ ndị agha ka a ghara iburu arịa ndị fọrọ n’ụlọ Jehova nakwa n’ụlọ* eze Juda nakwa na Jeruselem buga Babịlọn.’ 19  “E nwere ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru gbasara ogidi ndị dị n’ụlọ ahụ+ na nnukwu ite a na-akpọ Oké Osimiri*+ na ihe ndị e ji ebu ihe+ na arịa ndị ọzọ fọrọ n’obodo a, 20  bụ́ ndị Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn na-eburughị mgbe o si Jeruselem dọrọ Jekonaya nwa Jehoyakim, bụ́ eze Juda, n’agha laa Babịlọn, ya na ndị niile a ma ama na Juda nakwa na Jeruselem.+ 21  N’eziokwu, e nwere ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru gbasara arịa ndị fọrọ n’ụlọ Jehova nakwa n’ụlọ* eze Juda nakwa na Jeruselem. O kwuru, sị: 22  ‘“A ga-eburu ha laa Babịlọn.+ Ebe ahụkwa ka ha ga-adị ruo mgbe m ga-ebulata ha ebe a.”*+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “onye dị mma n’anya m inye ya.”
Ma ọ bụ “majik.”
Na Hibru, “o zuru ike.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
E ji ọla kọpa kpụọ efere a dị n’ụlọ nsọ.
Ma ọ bụ “n’obí.”
O nwere ike ịbụ, “ruo mgbe m ga-echeta ha.”