Jeremaya 15:1-21
15 Jehova wee sị m: “Ọ bụrụgodị na Mosis na Samuel dị ndụ taa na-arịọchitere ndị a arịrịọ,+ agaghị m emere ha ebere.* Ka a chụpụ ha n’ihu m. Ka a hapụkwa ha ka ha pụọ.
2 Ọ bụrụkwa na ha ajụọ gị ihe ga-eme ha, ị ga-asị ha, ‘Jehova kwuru, sị:
“Ọrịa ga-egbu ụfọdụ n’ime unu.
A ga-eji mma agha gbuo ụfọdụ n’ime unu.+
Ụnwụ ga-egbu ụfọdụ n’ime unu.
A ga-adọrọkwa ụfọdụ n’ime unu n’agha.”’+
3 “Jehova kwukwara, sị, ‘M ga-eme ka ọdachi anọ dakwasị ha.*+ A ga-eji mma agha gbuo ha. Nkịta ga-adọkpụrụ ozu ha. Nnụnụ na anụ ọhịa ga-adọri ha, laakwa ha n’iyi.+
4 Ihe m ga-eme ha ga-eme ka ụjọ tụwa alaeze niile dị n’ụwa.+ M ga-eme ha ihe a n’ihi ihe Manase nwa Hezekaya, bụ́ eze Juda, mere na Jeruselem.+
5 Jeruselem, ònye ga-enwere gị ọmịiko?
Ònye ga-emetere gị ebere?
Ònyekwa ga-abịa jụọ gị otú i mere?’
6 Jehova kwuru, sị, ‘Ị hapụla m.+
Ị na-agbakụta m azụ.*+
N’ihi ya, m ga-eweli aka m mee gị ihe, laakwa gị n’iyi.+
Ike imere gị ebere agwụla m.*
7 M ga-eji fọk e ji afụcha ọka fụchaa ha n’ọnụ ụzọ ámá obodo a.
M ga-agbawa ha aka ụmụ.+
M ga-ebibi ndị m,Ebe ọ bụ na ha ekweghị akwụsị àgwà ọjọọ ha na-akpa.+
8 Ụmụ nwaanyị isi mkpe ha ga-ehi nne karịa ájá dị n’oké osimiri.
M ga-eme ka onye na-ebibi ihe bịakwute ha n’etiti ehihie. Ọ ga-abịakwute ma ndị nne ma ụmụ okorobịa.
M ga-eme ka ụjọ tụwa ha, obi awụnyekwa ha n’afọ n’otu ntabi anya.
9 Ike agwụla nwaanyị mụrụ ụmụ asaa.
Ọ na-esiri ya* ike iku ume.
N’agbanyeghị na ugbu a bụ ehihie, ọ nọ n’ọchịchịrị.
E menyela ya ihere, mechuokwa ya ihu.’
‘M ga-enyefe mmadụ ole na ole n’ime ha fọrọ n’aka mma agha ndị iro ha.’+
Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.”
10 Nne m, efuola m, maka na ị mụrụ m.+
Mụ na ndị obodo m niile na-ese okwu, na-alụkwa ọgụ oge niile.
E nweghị onye m na-agbazinye ihe, e nweghịkwa onye na-agbazinye m.
Ha niile na-abụ m ọnụ.
11 Jehova kwuru, sị: “N’eziokwu, m ga-emere gị ihe ọma.
N’eziokwu, m ga-enyere gị aka n’oge ọdachi,Nyekwara gị aka n’oge ahụhụ ka onye iro ghara ime gị ihe ọ bụla.
12 Mmadụ ò nwere ike ịkụrisị ígwè,Ya bụ, ígwè si n’ebe ugwu, kụrisịakwa ọla kọpa?
13 M ga-eme ka ndị iro unu* bukọrọ akụ̀ unu na ihe ndị ọzọ unu nwere.+
Ha agaghị akwụ unu ụgwọ, kama, ha ga-ebukọro ha n’ihi mmehie niile unu mere n’ala unu niile.
14 M ga-ebunye ha ndị iro unuKa ha buru ha laa n’ala unu na-amaghị,+N’ihi na iwe m enwurula ọkụ.
Ọ bụkwa unu ka m na-ewesa iwe.”+
15 Jehova, ị ma ahụhụ m na-ata.
Biko cheta m. Uche gị dịrịkwa n’ebe m nọ.
Taa ndị na-akpagbu m ahụhụ.+
Ekwela ka m laa n’iyi maka na ị naghị ewe iwe ọsọ ọsọ.
Chetakwa na ọ bụ n’ihi gị ka m ji edi mkparị niile a na-akparị m.+
16 Jehova Chineke nke ụsụụ ndị agha, mgbe m hụrụ okwu gị, m riri ya.*+
Okwu gị meziri ka m na-aṅụrị ọṅụ, obi ana-atọkwa m ụtọ,N’ihi na m na-aza aha gị.
17 Anaghị m eso ndị na-eme oké oriri enwe aṅụrị.+
M na-anọrọ onwe m n’ihi na ị nọnyeere m.
I meela ka iwe ju m obi n’ihi mmehie ha na-eme.+
18 Gịnị mere ahụ́ na-egbu m mgbu anaghị akwụsị akwụsị,
Ahụ́ m merụrụ ekweghịkwa ngwọta? O kweghị ala ala.
Ị̀ ga-adị ka isi iyiNke mmiri na-anaghị adị na ya?
19 N’ihi ya, Jehova kwuru, sị:
“Ọ bụrụ na ị lọghachi, m ga-akpọrọghachi gị.
Ị ga na-ejekwara m ozi.*
Ọ bụrụ na i mee ka ihe bara ezigbo uru dịrị iche n’ihe na-abaghị uru,Ị ga-abụ ọnụ na-ekwuru m.
Ha ga-alọghachikwute gị,Ma gịnwa agaghị alaghachikwuru ha.
20 Jehova kwukwara, sị: “Emeela m ka ị ghọọrọ ndị a mgbidi ọla kọpa a rụsiri ike.+
Ha ga-alụso gị ọgụ,Ma ha agaghị emeri gị,+N’ihi na m nọnyeere gị. M ga-azọpụta gị, napụtakwa gị.
21 M ga-anapụta gị n’aka ndị ọjọọ,Napụtakwa gị n’aka ndị obi fere azụ.”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “obi m agaghị adị n’ebe ha nọ.”
^ O nwere ike ịbụ, “M ga-ekpe ha ụzọ ikpe anọ.” Na Hibru, “M ga-ahọpụtara ha ezinụlọ anọ.”
^ O nwere ike ịbụ, “Ị na-ala azụ azụ.”
^ Ma ọ bụ “Ike ịgbanwe obi m agwụla m.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
^ Ya bụ, ndị Juda.
^ Ma ọ bụ “m nụrụ okwu gị, m buuru ya n’obi.”
^ Na Hibru, “Ị ga na-eguzokwa n’ihu m.”

