Jenesis 46:1-34

  • Jekọb na ndị ezinụlọ ya kwagara Ijipt (1-7)

  • Aha ndị kwagara Ijipt (8-27)

  • Josef gara Goshen ịhụ Jekọb (28-34)

46  Izrel wee kpọrọ ndị ezinụlọ ya niile, kwakọrọkwa ihe niile o nwere gawa. Mgbe o rutere Bia-shiba,+ ọ chụụrụ Chineke nna ya Aịzik àjà.+ 2  N’abalị, Chineke gwara Izrel okwu n’ọhụụ. Ọ kpọrọ ya, sị: “Jekọb, Jekọb!” ya azaa ya, sị: “Lee m!” 3  Chineke sịrị ya: “Abụ m ezi Chineke, Chineke nke nna gị.+ Atụla egwu ịga Ijipt, n’ihi na m ga-eme ka ị bụrụ nnukwu mba n’ebe ahụ.+ 4  M ga-eso gị gaa Ijipt, m ga-esikwa n’ebe ahụ kpọghachi gị.+ Ọ bụ Josef ga-emechi anya gị mgbe ị ga-anwụ.”*+ 5  Mgbe e mechara, Jekọb si na Bia-shiba pụọ, ụmụ Izrel* jikwa ụgbọala ndị ahụ Fero nyere ka e were bute Jekọb buru Jekọb nna ha na ụmụntakịrị ha na ndị nwunye ha. 6  Ha chịịrị ìgwè anụ ha, burukwa ngwongwo ha ndị ha nwetara na Kenan. Otú a ka Jekọb na ụmụ ya niile si bata n’Ijipt. 7  Jekọb kpọọrọ ụmụ ya niile bata n’Ijipt, ma ụmụ ya ndị nwoke ma ụmụ ụmụ ya ndị nwoke ma ụmụ ya ndị nwaanyị ma ụmụ ụmụ ya ndị nwaanyị. 8  Ihe a bụ aha ụmụ Izrel ndị nwoke, ndị batara n’Ijipt,+ ya bụ, ụmụ* Jekọb: ọkpara Jekọb bụ Ruben.+ 9  Ụmụ Ruben ndị nwoke bụ Henọk, Palu, Hezrọn, na Kamaị.+ 10  Ụmụ Simiọn+ ndị nwoke bụ Jemuel, Jemin, Ohad, Jekin, Zoha, na Sheọl.+ Ọ bụ nwaanyị Kenan mụrụ Sheọl. 11  Ụmụ Livaị+ ndị nwoke bụ Geshọn, Kohat, na Meraraị.+ 12  Ụmụ Juda+ ndị nwoke bụ Ea, Onan, Shila,+ Pirez,+ na Zira.+ Ma Ea na Onan nwụrụ na Kenan.+ Ụmụ nwoke Pirez mụrụ bụ Hezrọn na Hemọl.+ 13  Ụmụ Ịsaka ndị nwoke bụ Tola, Puva, Yọb, na Shimrọn.+ 14  Ụmụ Zebulọn+ ndị nwoke bụ Sired, Ịlọn, na Jaliel.+ 15  Ọ bụ ha bụ ụmụ ndị nwoke Lia mụụrụ Jekọb na Padan-eram. Ọ mụkwaara ya nwa nwaanyị aha ya bụ Daịna.+ Ụmụ nwoke niile na ụmụ nwaanyị niile ọ mụụrụ ya dị iri atọ na atọ. 16  Ụmụ Gad+ ndị nwoke bụ Zifiọn, Hagaị, Shunaị, Ezbọn, Iraị, Arodaị, na Arilaị.+ 17  Ụmụ Asha+ ndị nwoke bụ Imna, Ishva, Ishvaị, na Beraya. Aha nwanne ha nwaanyị bụ Sira. Ụmụ Beraya ndị nwoke bụ Hiba na Malkiel.+ 18  Ọ bụ ha bụ ụmụ ndị nwoke Zilpa+ mụrụ. Zilpa bụ onye Leban kpọnyere ada ya Lia. Ụmụ niile Zilpa mụụrụ Jekọb dị mmadụ* iri na isii. 19  Ụmụ Rechel, nwunye Jekọb, bụ Josef+ na Benjamin.+ 20  A mụụrụ Josef Manase+ na Ifrem+ n’Ijipt. Ọ bụ Asinat+ nwa Pọtifera, onye nchụàjà Ọn,* mụụrụ ya ụmụ ahụ. 21  Ụmụ Benjamin+ ndị nwoke bụ Bila, Bika, Ashbel, Gira,+ Neeman, Ihaị, Rọsh, Mọpim, Họpim,+ na Ad.+ 22  Ọ bụ ha bụ ụmụ nwoke Rechel mụụrụ Jekọb. Ha niile dị mmadụ* iri na anọ. 23  Nwa* nwoke Dan+ mụrụ bụ Hushim.+ 24  Ụmụ Naftalaị+ ndị nwoke bụ Jaziel, Gunaị, Jiza, na Shilem.+ 25  Ọ bụ ha bụ ụmụ nwoke Bilha mụrụ. Bilha bụ onye Leban kpọnyere Rechel nwa ya nwaanyị. Ụmụ niile Bilha mụụrụ Jekọb dị mmadụ* asaa. 26  Ndị ezinụlọ Jekọb niile ndị so ya bata n’Ijipt dị mmadụ* iri isii na isii,+ ma e wepụ ndị nwunye ụmụ Jekọb. 27  Ụmụ nwoke a mụụrụ Josef n’Ijipt dị mmadụ* abụọ. Ndị ezinụlọ Jekọb niile ndị batara n’Ijipt dị mmadụ* iri asaa.+ 28  Jekọb dunyere Juda+ ka ọ gaa gwa Josef na ya abịawala Goshen. Mgbe ha batara na Goshen,+ 29  a kwadebeere Josef ụgbọ ịnyịnya ya, ya agbara ya gaa Goshen ịhụ Izrel nna ya. Mgbe Josef bịakwutere ya, Izrel makụrụ ya ozugbo bewe ákwá. 30  Izrel wee gwa Josef, sị: “Ọnwụ nweziri ike ịbịa gburu m ugbu a. Ahụla m gị wee mata na ị ka nọ ndụ.” 31  Josef gwaziri ụmụnne ya na ndị ezinụlọ nna ya, sị: “Ka m gaa hụ Fero ma gwa ya,+ sị, ‘Ụmụnne m na ndị ezinụlọ nna m, ndị bibu na Kenan, abịakwutela m n’ebe a.+ 32  Ha bụ ndị na-azụ atụrụ+ na ndị na-akpa anụ.+ Ha chị ìgwè ewu na atụrụ ha na ìgwè ehi ha bịa, ha bukwa ihe niile ha nwere bịa.’+ 33  Ọ bụrụ na Fero akpọọ unu ma jụọ unu, sị, ‘Gịnị ka unu na-arụ?’ 34  unu ga-asị ya, ‘Ndị ohu gị bụ ndị na-akpa anụ malite n’oge anyị bụ ụmụaka ruo ugbu a, ma anyịnwa ma nna nna anyị hà.’+ Ọ ga-ahapụzi unu ka unu biri na Goshen,+ n’ihi na ndị Ijipt kpọrọ onye ọ bụla na-azụ atụrụ asị.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ga-ebikwasị aka ya n’anya gị.”
Ya bụ, ụmụ Jekọb.
Okwu Hibru a sụgharịrị “ụmụ” nwere ike ịbụ ma ụmụ ma ụmụ ụmụ ma ụmụ ụmụ ụmụ.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ya bụ, Heliopolis.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Hibru, “Ụmụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”