Jenesis 43:1-34

  • Ụmụnne Josef kpọ Benjamin gaghachi Ijipt (1-14)

  • Josef na ụmụnne ya hụrụ ọzọ (15-23)

  • Josef na ụmụnne ya riri nri (24-34)

43  Ụnwụ ahụ ji ndị mmadụ aka ọjọọ n’ala ahụ.+  Mgbe ha richara ọka* ha butere n’Ijipt,+ nna ha sịrị ha: “Gaghachinụ zụta obere ihe oriri anyị ga-eri.”  Juda wee sị ya: “Nwoke ahụ dọsiri anyị aka ná ntị ike, sị, ‘Unu abịakwala ịhụ m ọzọ ma ọ bụrụ na nwanne unu esoghị unu bịa.’+  Ọ bụrụ na i kwe ka nwanne anyị soro anyị, anyị ga-aga zụtara gị ihe oriri.  Ma ọ bụrụ na i kweghị ka o soro anyị, anyị agaghị aga, n’ihi na nwoke ahụ gwara anyị, sị, ‘Unu abịakwala ịhụ m ọzọ ma ọ bụrụ na nwanne unu esoghị unu bịa.’”+  Izrel+ wee jụọ ha, sị: “Gịnị mere unu ji gwa nwoke ahụ na unu nwere nwanne nwoke ọzọ wee kpatara m nsogbu a?”  Ha zara ya, sị: “Nwoke ahụ jụrụ ajụjụ kpọmkwem banyere anyị na ndị ezinụlọ anyị, sị, ‘Nna unu ọ̀ ka nọ ndụ? Ùnu nwere nwanne nwoke ọzọ?’ anyị wee gwa ya eziokwu.+ È nwere otú anyị ga-esi ama na ọ ga-asị anyị, ‘Kpọtanụ nwanne unu nwoke’?”+  Juda gwaziri Izrel nna ya, sị: “Kpọnye m nwa a ka anyị gawa,+ ka anyị wee dị ndụ ghara ịnwụ,+ ma anyịnwa ma gịnwa ma ụmụ anyị.+  M ga-ahụ na e nweghị ihe ga-eme ya.+ Ọ bụ m ga-aza ajụjụ maka ya. Ọ bụrụ na mụ akpọlataghị ya kpọnye gị, ọ pụtara na emehiela m gị ná ndụ m niile. 10  Ma a sị na ọ bụghị oge anyị nọ na-egbu, anyị gaarala aga ebe ahụ ugboro abụọ lọta.” 11  Izrel nna ha wee sị ha: “Ọ bụrụ na ọ ga-esorịrị unu, meenụ ihe a: Werenụ ihe ndị a kacha mma ala a mepụtara tinye n’akpa unu, burukwanụ ha bugara nwoke ahụ ka ọ bụrụ onyinye unu ga-enye ya:+ obere mmanụ balsam,+ obere mmanụ aṅụ, eso* labdanọm, azụ osisi,*+ mkpụrụ pistashio, na almọnd. 12  Werenụ ego ole unu jibu gaa okpukpu abụọ, nyeghachikwanụ ha ego ahụ e tinyere n’ọnụ akpa unu.+ O nwere ike ịbụ na e tinyere ha n’amaghị ụma. 13  Kpọrọnụ nwanne unu gawa. Gaghachikwurunụ nwoke ahụ. 14  Ka Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile mee ka nwoke ahụ metere unu ebere, ka o wee hapụrụ unu Simiọn ma ghara ịkpọchi Benjamin. Ma, ọ bụrụ na m ga-agbara aka ụmụ, mụ agbaranụ aka ụmụ.”+ 15  Ụmụ Izrel* wee buru onyinye ndị ahụ, were ego ole ha jibu gaa okpukpu abụọ ma kpọrọ Benjamin. Ha biliziri gawa Ijipt. Mgbe ha ruru, ha guzoro n’ihu Josef.+ 16  Mgbe Josef hụrụ Benjamin ka ha na ya so, ọ gwara onye na-elekọta ụlọ ya ozugbo, sị: “Kpọga ụmụ nwoke ndị a n’ụlọ m ma gbuo anụ, siekwa ihe oriri, n’ihi na mụ na ha ga-eri nri n’ehihie.” 17  Ozugbo ahụ, nwoke ahụ mere nnọọ ihe Josef kwuru,+ kpọga ha n’ụlọ Josef. 18  Ma egwu tụwara ụmụ nwoke ndị ahụ maka na a kpọgara ha n’ụlọ Josef. Ha malitere ịsị: “Ọ bụ n’ihi ego ahụ e tinyeghachiri n’akpa anyị mgbe mbụ anyị bịara mere e ji kpọta anyị ebe a. Ugbu a, ha ga-alụso anyị ọgụ ma jiri anyị mere ndị ohu, kpụrụkwa jakị anyị.”+ 19  N’ihi ya, ha gakwuuru nwoke ahụ na-elekọta ụlọ Josef ma gwa ya okwu n’ọnụ ụzọ ụlọ ahụ. 20  Ha sịrị ya: “Ewela iwe, onyenwe m. Anyị bịaburu ebe a zụọ ihe oriri.+ 21  Ma mgbe anyị ruru n’ebe anyị rahụrụ ma bido imeghe akpa anyị, onye nke ọ bụla n’ime anyị hụrụ ego ya n’ọnụ akpa ya. Ego anyị zuru nnọọ ezu.+ N’ihi ya, anyị chọrọ iji aka anyị nyeghachi ya unu. 22  Anyị amaghị onye tinyere ego anyị n’akpa anyị. Anyị wetakwuru ego anyị ga-eji zụrụ ihe oriri.”+ 23  Ọ sịrị ha: “Nsogbu adịghị. Unu atụla egwu. Ọ bụ Chineke unu na Chineke nna unu tinyere akụ̀ n’akpa unu. Ego unu bu ụzọ ruo m aka.” Ọ kpọpụtaziiri ha Simiọn.+ 24  Nwoke ahụ wee kpọbata ụmụ nwoke ndị ahụ n’ụlọ Josef, kunye ha mmiri ka ha saa ụkwụ ha, nyekwa jakị ha nri. 25  Ha kwadebekwara onyinye+ ha ga-enye Josef mgbe ọ ga-abịa n’ehihie, maka na ha nụrụ na ha ga-eri ihe oriri n’ebe ahụ.+ 26  Mgbe Josef banyere n’ụlọ ahụ, ha wetaara ya onyinye ha ji bịa ma kpọọrọ ya isiala.+ 27  Mgbe e mechara, ọ jụrụ ha otú ha mere ma sị ha: “Nna unu merela agadi unu gwaburu m maka ya, olee otú o mere? Ọ̀ ka nọkwa ndụ?”+ 28  Ha sịrị ya: “Ohu gị nna anyị dị mma. Ọ ka nọ ndụ.” Ha wee hulata kpọọrọ ya isiala.+ 29  Mgbe o lepụrụ anya hụ Benjamin nwanne ya, onye nne ji ya na ya,+ ọ sịrị: “Onye a ọ̀ bụ nwanne unu nke ọdụdụ, onye unu gwara m okwu ya?”+ Ọ sịkwara Benjamin: “Nwa m, ka Chineke meere gị amara.” 30  Josef meziri ọsọ ọsọ pụọ, gaa chọọ ebe ọ ga-anọ bee ákwá, n’ihi na obi nwanne mewere ya. N’ihi ya, ọ banyere n’ọnụ ụlọ ọzọ bee ákwá.+ 31  Mgbe o bechara ákwá, o jikọtara onwe ya, saa ihu ya ma pụta, sị: “Butewenụ nri.” 32  Ha bunyere ya nri nke ya iche, bunye ụmụnne ya nke ha iche. Ndị Ijipt ya na ha nọ riri nri nke ha iche n’ihi na ndị Ijipt enweghị ike iso ndị Hibru rie ihe, maka na ime otú ahụ bụ arụ n’anya ndị Ijipt.+ 33  Ụmụnne ya* nọ n’ebe chere ihu n’ebe yanwa nọ, malite n’onye bụ́ ọkpara, bụ́ onye nwe ihe ruuru ọkpara,+ ruo n’onye bụ́ ọdụdụ nwa. Ha nọ na-ele ibe ha n’anya n’anya maka na ihe na-emenụ riri ha ọnụ. 34  Josef si na tebụl ya na-ebunye ha nri. Ma ọ na-eme ka nke a na-ebunye Benjamin jiri okpukpu ise karịa nke ụmụnne ya niile.+ Ya na ha wee na-eri, na-aṅụ, ruo mgbe afọ juru ha.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ma ọ bụ “gọm.”
Ma ọ bụ “ụgbụgbọ osisi.” A na-eji eso si n’azụ osisi a eme ihe na-esi ísì ọma.
Ya bụ, ụmụ Jekọb.
Na Hibru, “Ha.”