Jenesis 40:1-23
40 Mgbe ihe ndị a mechara, onyeisi ndị na-ebunye eze Ijipt mmanya+ na onyeisi ndị na-emere ya achịcha mejọrọ onyenwe ha, bụ́ eze Ijipt.
2 N’ihi ya, Fero wesara mmadụ abụọ ahụ na-ejere ya ozi iwe, ya bụ, onyeisi ndị na-ebunye ya mmanya na onyeisi ndị na-emere ya achịcha.+
3 O wee tụba ha n’ụlọ nga dị n’ụlọ onyeisi ndị nche,+ bụ́ ebe a tụrụ Josef mkpọrọ.+
4 Onyeisi ndị nche nyefeziri ha n’aka Josef ka o lekọtawa ha.+ Ha wee nọrọ n’ụlọ nga ruo oge* ụfọdụ.
5 Onye na-ebunye eze Ijipt mmanya na onye na-emere ya achịcha, bụ́ ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ, rọrọ nrọ n’otu abalị. Nrọ onye nke ọ bụla n’ime ha nwere ihe ọ pụtara.
6 Mgbe chi bọrọ, Josef batara hụ ha, ma ihu ha gbarụrụ agbarụ.
7 N’ihi ya, Josef jụrụ ndị ahụ na-ejere Fero ozi, bụ́ ndị ya na ha nọ n’ụlọ nga dị n’ụlọ nna ya ukwu, sị: “Gịnị mere ihu unu ji gbarụọ taa?”
8 Ha wee sị ya: “Anyị abụọ n’otu n’otu rọrọ nrọ, ma e nweghị onye na-akọwa nrọ anyị na ya nọ.” Josef sịziri ha: “Ọ̀ bụ na ọ bụghị Chineke na-akọwa nrọ?+ Biko, kọọrọnụ m ya.”
9 Onyeisi ndị na-ebunye eze mmanya wee kọọrọ Josef nrọ ya, sị: “Ná nrọ m, e nwere osisi vaịn dị n’ihu m.
10 Osisi vaịn ahụ nwekwara alaka atọ. Mgbe ọ na-epu akwụkwọ ọhụrụ, ọ mara ifuru, mkpụrụ ọ mịrị n’ụyọkọ n’ụyọkọ chakwara.
11 Eji m iko Fero n’aka, m wee were mkpụrụ vaịn ndị ahụ pịnye mmiri ha n’iko Fero. Mgbe m pịnyechara ha, m bunyere Fero iko ahụ.”
12 Josef sịziri ya: “Lee ihe nrọ gị pụtara: Alaka atọ ahụ bụ ụbọchị atọ.
13 N’ụbọchị atọ taa, Fero ga-akpọpụta gị, nyeghachi gị ọrụ gị.+ Ị ga-ebunyekwa Fero iko ya otú ị na-emebu mgbe ị bụ onye na-ebunye ya mmanya.+
14 Ma, chetakwa m mgbe ihe gaziiri gị. Biko, meere m ebere* ma kọọrọ Fero banyere m, ka e wee kpọpụta m n’ebe a.
15 N’eziokwu, e si n’ala ndị Hibru tọrọ m,+ emeghịkwa m ihe ọ bụla n’ebe a mere ha ga-eji tụba m n’ụlọ mkpọrọ.”*+
16 Mgbe onyeisi ndị na-emere eze achịcha hụrụ na ihe Josef kọwara dị mma, ọ gwara Josef, sị: “Ná nrọ nke m, ebu m nkata atọ n’isi, achịcha na-acha ọcha dịkwa n’ime nkata ndị ahụ.
17 Ụdị achịcha dị iche iche e meere Fero dịkwa n’ime nkata nke dị n’elu elu. E nwekwara nnụnụ ndị nọ na-eri achịcha ndị ahụ dị na nkata ahụ m bu n’isi.”
18 Josef gwaziri ya, sị: “Lee ihe nrọ gị pụtara: Nkata atọ ahụ bụ ụbọchị atọ.
19 N’ụbọchị atọ taa, Fero ga-egbupụ gị isi ma kwụwa gị n’osisi, nnụnụ ga-erikwa anụ gị.”+
20 Ụbọchị nke atọ ahụ bụ ụbọchị Fero na-echeta ụbọchị a mụrụ ya.+ O wee meere ndị niile na-ejere ya ozi oriri. Ọ kpọpụtara onyeisi ndị na-ebunye ya mmanya na onyeisi ndị na-emere ya achịcha n’ihu ndị na-ejere ya ozi.
21 Fero nyeghachiri onyeisi ndị na-ebunye ya mmanya ọrụ ọ na-arụbu, ya ebunyewekwa ya mmanya.
22 Ma ọ kwụwara onyeisi ndị na-emere ya achịcha n’osisi, otú Josef kwuru mgbe ọ na-akọwara ha nrọ.+
23 Ma, onyeisi ndị na-ebunye eze mmanya echetaghị Josef. O chefuru ya.+

