Jenesis 35:1-29

  • Jekọb tụfuru chi ndị mba ọzọ (1-4)

  • Jekọb rutere Betel (5-15)

  • A mụrụ Benjamin; Rechel nwụrụ (16-20)

  • Ụmụ iri na abụọ Izrel mụrụ (21-26)

  • Aịzik nwụrụ (27-29)

35  Mgbe e mechara, Chineke gwara Jekọb, sị: “Bilie, kwaga Betel+ ma biri n’ebe ahụ, rụọkwara mụnwa bụ́ ezi Chineke ebe ịchụàjà n’ebe ahụ m pụtara n’ihu gị mgbe ị na-agbara Ịsọ nwanne gị ọsọ.”+ 2  Jekọb wee gwa ndị ezinụlọ ya na ndị niile ya na ha nọ, sị: “Tụfuonụ chi ndị mba ọzọ unu ji.+ Dowenụ onwe unu ọcha. Gbanweenụ uwe unu, 3  biliekwanụ ka anyị kwaga Betel. Ọ bụ n’ebe ahụ ka m ga-arụrụ ezi Chineke ebe ịchụàjà, bụ́ onye zara m n’oge m nọ ná nsogbu, onye nọnyekwaara m n’ebe ọ bụla m gara.”+ 4  N’ihi ya, ha nyere Jekọb chi ndị mba ọzọ niile ha ji, ha chịnyekwara ya ọla ntị ha kwụ ná ntị. Jekọb wee lie* ha n’okpuru nnukwu osisi dị nso na Shikem. 5  N’oge ha kwapụrụ na-aga Betel, Chineke mere ka ụjọ jide ndị bi n’obodo ndị gbara ha gburugburu, nke mere na ha achụrụghị ụmụ Jekọb gawa. 6  Jekọb na ndị niile so ya mechara rute Lọz,+ ya bụ, Betel, nke dị na Kenan. 7  Ọ rụrụ ebe ịchụàjà n’ebe ahụ ma kpọọ ebe ahụ El-betel* maka na ọ bụ n’ebe ahụ ka ezi Chineke pụtara n’ihu ya mgbe ọ nọ na-agbara nwanne ya ọsọ.+ 8  Mgbe e mechara, Debora+ onye nyere Ribeka ara nwụrụ, e lie ya n’ebe dị nso na Betel, n’okpuru osisi ook. Jekọb wee kpọọ ebe ahụ Alọn-bakọt.* 9  Chineke pụtara n’ihu Jekọb ọzọ mgbe o si Padan-eram na-alọta ma gọzie ya. 10  Chineke sịrị ya: “Aha gị bụ Jekọb.+ A gaghịzi na-akpọ gị Jekọb, kama aha gị ga-abụzi Izrel.” Ọ maliteziri ịkpọ ya Izrel.+ 11  Chineke gwakwara ya, sị: “Abụ m Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+ Mụọ ọmụmụ, baakwa ụba. Ị ga-abụ nna mba dị iche iche na ọtụtụ ìgwè mmadụ,+ ndị eze ga-esikwa n’agbụrụ gị.*+ 12  Ọ bụ gị ka m ga-enye ala m nyere Ebreham na Aịzik, ọ bụkwa ụmụ* gị ka m ga-enye ala ahụ.”+ 13  Chineke wee hapụ Jekọb, si n’ebe ahụ ya na ya nọ kwuo okwu pụọ. 14  N’ihi ya, Jekọb kwụwara otu nkume n’ebe ahụ ya na Chineke nọ kwuo okwu ka ọ bụrụ ogidi. O wee wụsa àjà mmanya n’elu ya, wụsakwa mmanụ n’elu ya.+ 15  Jekọb kpọkwara ebe ahụ ya na Chineke nọ kwuo okwu Betel.+ 16  Ha wee si na Betel kwalie. Mgbe ha ka nọ n’ebe dịtụ anya n’Efrat, ime mewere Rechel, o sikwaara ya ezigbo ike ịmụ nwa ya. 17  Ma mgbe ọ nọ na-esiri ya ike ịmụpụta nwa ahụ, nwaanyị na-aghọ́ nwa sịrị ya: “Atụla egwu, maka na ị ga-amụkwa nwa nwoke a.”+ 18  Mgbe Rechel na-ekubi ume (maka na ọ nọzi n’ọnụ ọnwụ), ọ gụrụ nwa ahụ Ben-onaị,* ma nna ya gụrụ ya Benjamin.*+ 19  Rechel wee nwụọ, e lie ya n’akụkụ ụzọ gara Efrat, ya bụ, Betlehem.+ 20  Jekọb kwụwara otu nnukwu nkume n’elu ili ya. Ọ bụ ogidi ili Rechel ruo taa. 21  Mgbe e mechara, Izrel kwapụrụ gaa maa ụlọikwuu ya ma a gafetụ ụlọ elu Ịda. 22  N’oge Izrel bi n’ala ahụ, e nwere mgbe Ruben gara dinaa Bilha iko nna ya, Izrel nụkwara ya.+ Ụmụ nwoke Jekọb mụrụ dị iri na abụọ. 23  Ụmụ nwoke ndị Lia mụrụ bụ Ruben, ọkpara Jekọb,+ Simiọn, Livaị, Juda, Ịsaka, na Zebulọn. 24  Ụmụ Rechel mụrụ bụ Josef na Benjamin. 25  Ụmụ Bilha, nwaanyị na-ejere Rechel ozi, mụrụ bụ Dan na Naftalaị. 26  Ụmụ Zilpa, nwaanyị na-ejere Lia ozi, mụrụ bụ Gad na Asha. Ọ bụ ha bụ ụmụ Jekọb ndị nwoke, ndị a mụụrụ ya na Padan-eram. 27  Jekọb mechara lọta n’ebe Aịzik nna ya nọ na Mamri,+ na Kiriat-aba, ya bụ, Hebrọn, bụ́ ebe Ebreham bi mgbe ọ bụ onye mbịarambịa, bụrụkwa ebe Aịzik bụ onye mbịarambịa.+ 28  Aịzik dịrị ndụ otu narị afọ na iri asatọ (180).+ 29  Aịzik wee kubie ume nwụọ, e lie ya otú e liri ndị nna nna ya. O mere agadi, ndụ ya jukwara ya afọ. Ịsọ na Jekọb ụmụ ya wee lie ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “zoo.”
El-betel pụtara “Chineke Betel.”
Alọn-bakọt pụtara “Osisi Ook A Nọ n’Okpuru Ya Bee Ákwá.”
Na Hibru, “ndị eze ga-esi n’úkwù gị pụta.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Ben-onaị pụtara “Nwa Iru Uju M.”
Benjamin pụtara “Nwa Aka Nri.”