Jenesis 34:1-31
34 Daịna, nwa nwaanyị Lia mụụrụ Jekọb,+ na-adị agakwuru ụmụ agbọghọ obodo ahụ ka ha na ya nọrịa.*+
2 Mgbe Shikem hụrụ Daịna, ọ kpọọrọ ya dinaa ya ma merụọ ya. Shikem bụ nwa Hemọ onye Haịvaịt.+ Hemọ bụ onyeisi n’obodo ahụ.
3 Obi Shikem ekweghị apụ apụ n’ebe Daịna nwa Jekọb nọ. Ọ hụrụ nwa agbọghọ ahụ n’anya ma na-agwa ya okwu ga-eru ya n’obi.
4 N’ikpeazụ, Shikem gwara Hemọ+ nna ya, sị: “Lụtara m nwa agbọghọ a ka ọ bụrụ nwunye m.”
5 Mgbe Jekọb nụrụ na Shikem emerụọla Daịna nwa ya nwaanyị, ụmụ ya ndị nwoke nọ n’ọhịa na-azụ ìgwè anụ ya. N’ihi ya, Jekọb gbara nkịtị ruo mgbe ha lọtara.
6 Mgbe e mechara, Hemọ, nna Shikem, gakwuuru Jekọb ka ya na ya kpaa.
7 Ma ụmụ Jekọb ndị nwoke nụrụ ihe merenụ, ha esi n’ọhịa lọta ozugbo. O wutere ha nke ukwuu, ha ewee ezigbo iwe, n’ihi na Shikem dinara ada Jekọb+ wee mechuo Izrel ihu, bụ́ ihe ọjọọ a na-ekwesịghị ime eme.+
8 Hemọ gwara ha, sị: “Obi Shikem nwa m dị n’ebe ada unu nọ. Biko, kpọnyenụ ya nwa agbọghọ ahụ ka ọ bụrụ nwunye ya.
9 Ka anyị na unu gọwa ọgọ. Anyị ga na-alụrụ ụmụ unu ndị nwaanyị, unu ana-alụrụkwa ụmụ anyị ndị nwaanyị.+
10 Unu nwere ike ibiri n’ala anyị, unu nwekwara ike ime ihe ọ bụla n’ala a. Birinụ na ya zụwa ahịa, werekwanụ ya ka ala unu.”
11 Shikem wee gwa nna nwa agbọghọ ahụ na ụmụnne ya ndị nwoke, sị: “Ka ihe m masị unu, m ga-enyekwa unu ihe ọ bụla unu ga-asị m weta.
12 Unu nwere ike ibuli ego isi ya ma gwa m ka m weta onyinye buru ibu.+ M ga-enye unu ihe ọ bụla unu ga-asị m weta. Naanị ihe m chọrọ bụ ka unu kpọnye m nwa agbọghọ ahụ ka ọ bụrụ nwunye m.”
13 Ụmụ Jekọb ndị nwoke wee jiri aghụghọ zaa Shikem na Hemọ nna ya maka na Shikem merụrụ Daịna nwanne ha nwaanyị.
14 Ụmụ Jekọb sịrị ha: “Anyị agaghị anwa anwa kpọrọ nwanne anyị nwaanyị kpọnye nwoke a na-ebighị úgwù,+ n’ihi na ime otú ahụ bụ imechu onwe anyị ihu.
15 Anyị ga-eme ihe unu kwuru naanị ma ọ bụrụ na a ga-ebi unu úgwù, unu adịrị ka anyị.+
16 Unu mee ya, unu ga na-alụrụ ụmụ anyị ndị nwaanyị, anyị ana-alụrụkwa ụmụ unu ndị nwaanyị. Anyị na unu ga-ebi, anyị abụrụzie otu ndị.
17 Ma ọ bụrụ na unu egeghị anyị ntị wee ghara ibi úgwù, anyị ga-akpọrọ ada anyị laa.”
18 Ihe ha kwuru dị Hemọ+ na Shikem, nwa Hemọ,+ mma.
19 Nwa okorobịa ahụ mere ihe ha gwara ya ozugbo+ n’ihi na ada Jekọb masịrị ya, ọ bụkwa onye a kacha akwanyere ùgwù n’ezinụlọ nna ya.
20 Hemọ na Shikem nwa ya wee gaa n’ọnụ ụzọ ámá obodo ha ma gwa ndị obodo ha,+ sị:
21 “Ndị a chọrọ ka anyị na ha dịrị n’udo. Kwetanụ ka ha biri n’obodo anyị zụwa ahịa ebe ọ bụ na obodo anyị buru ibu nke na ọ ga-aba ha. Anyị ga na-alụrụ ụmụ ha ndị nwaanyị, ha ga na-alụrụkwa ụmụ anyị ndị nwaanyị.+
22 Naanị ihe ga-eme ka ha kweta ka anyị na ha biri wee bụrụ otu ndị bụ ma ọ bụrụ na e bie nwoke ọ bụla n’ime anyị úgwù otú e biri ha.+
23 Anyị na ha bụrụ otu, ọ̀ bụ na ihe ndị ha nwere na akụnụba ha na anụ ụlọ ha niile agaghị abụ nke anyị? N’ihi ya, ka anyị kweta ihe ha kwuru ka anyị na ha wee biri.”
24 Ndị niile na-ezukọ n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ gere Hemọ na Shikem nwa ya ntị. E wee bie ụmụ nwoke obodo ahụ niile úgwù, ya bụ, ndị niile na-ezukọ n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ.
25 Ma n’ụbọchị nke atọ, mgbe úgwù ahụ ha biri ka na-afụ ha ụfụ, Simiọn na Livaị, bụ́ ụmụ Jekọb, ụmụnne Daịna,+ weere mma agha ha banye n’obodo ahụ otú a na-enweghị onye ga-amata ihe ha bu n’obi. Ha wee gbuo ụmụ nwoke obodo ahụ niile.+
26 Ha ji mma agha gbuo Hemọ na Shikem nwa ya, sizie n’ụlọ Shikem kpọrọ Daịna lawa.
27 Ụmụ Jekọb ndị ọzọ gara n’ebe ụmụ nwoke ndị ahụ e gburu egbu nọ bukọrọ ihe dị n’obodo ahụ, maka na ha merụrụ nwanne ha nwaanyị.+
28 Ha kpụụrụ ìgwè ewu na atụrụ ha, ìgwè ehi ha, na jakị ha, werekwa ihe niile dị n’obodo ahụ nakwa n’ubi ha.
29 Ha wekwaara ihe niile ha nwere, kpụrụkwa ụmụntakịrị ha na ndị nwunye ha ma bukọrọ ihe niile dị n’ụlọ ha.
30 Jekọb wee gwa Simiọn na Livaị,+ sị: “Unu ebuterela m nsogbu wee mee ka m siwe ndị bi n’ala a ísì, ya bụ, ndị Kenan na ndị Perizaịt. Ebe m dị ole na ole, ha ga-ezukọta lụso m ọgụ ma kpochapụ mụ na ndị ezinụlọ m.”
31 Ma ha sịrị: “Mmadụ ò kwesịrị imeso nwanne anyị nwaanyị ka à ga-asị na ọ bụ akwụna?”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “na-adị aga ahụ ụmụ agbọghọ obodo ahụ.”