Jenesis 33:1-20
33 Jekọb lepụrụ anya hụ ka Ịsọ na-abịa, ya na narị ụmụ nwoke anọ (400) ndị so ya.+ N’ihi ya, Jekọb kpọọrọ ụmụ ya ụfọdụ kpọnye Lia, kpọrọ ụfọdụ kpọnye Rechel, kpọrọkwa ụfọdụ kpọnye ụmụ nwaanyị abụọ na-ejere ya ozi.+
2 O dowere ụmụ nwaanyị na-ejere ya ozi na ụmụ ha n’ihu,+ Lia na ụmụ ya anọrọ ha n’azụ,+ Rechel+ na Josef anọrọzie n’azụ azụ.
3 Jekọb gaziri nọrọ n’ihu ha niile. Ọ kpọrọ isiala ugboro asaa ruo mgbe o rutere n’ebe nwanne ya nọ.
4 Ma Ịsọ gbaara ọsọ gakwuru ya, makụọ ya ma susuo ya ọnụ,* ha abụọ amalite ibe ákwá.
5 Mgbe Ịsọ leliri anya hụ ụmụ nwaanyị ahụ na ụmụ ha, ọ jụrụ Jekọb, sị: “Ole ndị bụ ndị a so gị?” ya azaa ya, sị: “Ha bụ ụmụ Chineke ji meere ohu gị amara.”+
6 Ụmụ nwaanyị ahụ na-eje ozi na ụmụ ha wee bịarute, kpọọrọ Ịsọ isiala.
7 Lia na ụmụ ya bịarutere kpọọrọ ya isiala. Josef na Rechel bịarutekwara kpọọrọ ya isiala.+
8 Ịsọ jụrụ Jekọb, sị: “Gịnị mere i ji zite ndị ozi ahụ na ìgwè anụ niile ahụ m hụrụ?”+ Ọ zara ya, sị: “Ọ bụ ka ihe m wee masị onyenwe m.”+
9 Ịsọ sịrị ya: “Nwanne m, enwere m nnọọ ọtụtụ ihe.+ Jidewe ihe gị.”
10 Ma Jekọb sịrị ya: “Mba, biko. Ọ bụrụ na ihe m masịrị gị, nara m onyinye ndị a m na-enye gị, n’ihi na m wetara ha ka m nwee ike ịhụ ihu gị. Ahụkwala m ihu gị ka à ga-asị na m hụrụ ihu Chineke, i jikwa obi ụtọ nabata m.+
11 Biko, nara onyinye m wetara iji gọzie gị, n’ihi na Chineke emeerela m amara,+ enwekwara m ihe niile dị mụ mkpa.”+ O wee na-arịọsi ya ike ka ọ nara ya onyinye ndị ahụ, ya anara ya ha.
12 Mgbe e mechara, Ịsọ sịrị ya: “Ka anyị kwalie lawa, ka m butere gị ụzọ.”
13 Ma Jekọb sịrị ya: “Onyenwe m ma na ụmụaka a esighị ike,+ marakwa na m na-elekọta atụrụ na ehi ndị na-enye ụmụ ha ara. Ọ bụrụ na a chịa ha n’ike otu ụbọchị, ìgwè anụ a niile ga-anwụ.
14 Biko, ka onyenwe m buru ohu ya ụzọ gawa, ma m ga na-abịa nwayọọ nwayọọ otú ike kwere anụ ụlọ ndị a na ụmụaka m ruo mgbe m ga-abịakwute onyenwe m n’obodo Sia.”+
15 Ịsọ wee sị ya: “Biko, ka m hapụrụ gị ụfọdụ n’ime ndị so m.” Jekọb sịrị ya: “Ọ̀ bakwaranụ uru ịhapụ ha? Naanị ihe m chọrọ bụ ka ihe m masị onyenwe m.”
16 N’ihi ya, Ịsọ lawara Sia n’ụbọchị ahụ.
17 Jekọb wee gawa Sọkọt.+ N’ebe ahụ, ọ rụụrụ onwe ya ụlọ, rụọkwara ìgwè anụ ya ụlọ ndò. Ọ bụ ya mere o ji kpọọ ebe ahụ Sọkọt.*
18 Mgbe Jekọb si Padan-eram+ na-alọta, o rutere n’obodo Shikem,+ nke dị na Kenan,+ n’enweghị nsogbu ọ bụla. O wee maa ụlọikwuu n’akụkụ obodo ahụ.
19 Ọ zụrụ ibé ala ahụ ọ mara ụlọikwuu ya n’aka ụmụ Hemọ, nna Shikem. Ọ zụrụ ya otu narị (100) mkpụrụ ego.+
20 Ọ rụrụ ebe ịchụàjà n’ebe ahụ ma kpọọ ya Chineke bụ Chineke Izrel.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Otú e si ekele mmadụ n’oge ahụ bụ isusu ya ọnụ, dị ka isusu ya ọnụ na ntì.
^ Sọkọt pụtara “Ụlọ Ndò.”