Hosia 14:1-9

  • A gwara ndị Izrel ka ha lọghachikwute Jehova (1-3)

    • Ha ga-eji ọnụ ha too Chineke (2)

  • A ga-agwọ ndị Izrel, ha agaghịzi ahapụ Chineke (4-9)

14  “Izrel, lọghachikwutenụ Jehova Chineke unu,+N’ihi na mmehie unu emeela ka unu daa.  2  Lọghachikwutenụ Jehova. Sịkwanụ ya: ‘Gbaghara anyị mmehie anyị,+ nabatakwa ihe dị mma anyị na-enye gị. Anyị ga-ejikwa ọnụ anyị too gị+ otú ahụ anyị si eji ụmụ ehi achụrụ gị àjà.*  3  Asiria agaghị azọpụta anyị.+ Anyị agaghị agba ịnyịnya.+ Anyị agaghịzi asị aka ọrụ anyị, “Ị bụ Chi anyị.” N’ihi na ọ bụ gị na-emere nwa na-enweghị nna ebere.’+  4  M ga-agwọ ha.+ Ha agaghịzi ahapụ m. M ga-eji obi m niile hụ ha n’anya,+N’ihi na iwe m na-ewesa ha adajụọla.+  5  M ga-adịrị Izrel ka igirigi. Ọ ga-awa okooko dị ka lili,Gbanyesiekwa mgbọrọgwụ ike dị ka osisi Lebanọn.  6  Ọ ga-awa alaka. Ọ ga-adị ebube ka osisi oliv. Ọ ga na-esikwa ísì ọma dị ka osisi Lebanọn.  7  Ha ga-ebi ọzọ na ndò ya. Ha ga-akụ ọka,* ha ga-amakwa ifuru dị ka osisi vaịn.+ Ndị mmadụ ga-akọ gbasara ya otú ha si akọ gbasara mmanya Lebanọn.*  8  Ifrem ga-asị, ‘Gịnị ka gbasara mụ na arụsị?’+ M ga-anụ olu ya, lekọtakwa ya.+ M ga-adị ka osisi junipa nke akwụkwọ ndụ juru n’elu ya. Ọ bụ m ga-amịrị ya mkpụrụ.”  9  Ka onye ma ihe ghọta ihe ndị a. Ka onye nwere uche mata ha,N’ihi na ụzọ Jehova ziri ezi,+Ọ bụkwa ndị ezi omume ga na-eje ije na ya. Ma ndị na-emebi iwu ga na-adagharị, sikwa na ya kpafuo.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Anyị ga-enyekwa gị ụmụ ehi bụ́ mkpụrụ egbugbere ọnụ anyị.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Na Hibru, “ga-echeta ya otú ha si echeta mmanya Lebanọn.”