Hosia 11:1-12

  • Malite mgbe Izrel bụ nwata, Chineke hụrụ ya n’anya (1-12)

    • “N’Ijipt ka m si kpọpụta nwa m” (1)

11  “Mgbe Izrel bụ nwata, m hụrụ ya n’anya.+ N’Ijipt ka m si kpọpụta nwa m.+   Ka ha* nọ na-akpọ ha,Ka ha na-agatekwu aka.+ Ha nọ na-achụrụ Bel àjà,+Na-achụkwara arụsị dị iche iche a pịrị apị.+   Ma, ọ bụ m kụziiri Ifrem otú e si aga ije,+ na-ekukwa ha n’aka.+ Ha amataghịkwa na mụ agwọọla ha.   M ji obiọma na ịhụnanya dọta ha n’ebe m nọ.*+ M dị ha ka onye na-ekopụ yok n’agba ha. M jikwa nwayọọ wetara onye nke ọ bụla ihe oriri.   Ha agaghị alaghachi Ijipt, ma Asiria ga-abụ eze ha,+N’ihi na ha jụrụ ịlọghachikwute m.+   Mma agha ga-agazu obodo ya niile+Wee bibie ihe ndị a tụchiri n’ụzọ ya, gbuokwa ha n’ihi atụmatụ ọjọọ ha.+   Ndị m ekpebiela na ha agaghị na-erubere m isi.+ N’agbanyeghị na a na-akpọ ha ịlaghachikwuru onye dị elu, o nweghị onye na-ebili.   Ifrem, olee otú m ga-esi gbahapụ gị?+ Izrel, olee otú m ga-esi rara gị nye? Olee otú m ga-esi mee ka ị dịrị ka Adma? Olee otú m ga-esi mee ka ị dịrị ka Zeboyim?+ Agbanweela m obi m. M na-emetekwara gị ebere.*+   Agaghị m ewesa unu iwe ọkụ. Agaghị m ebibi Ifrem ọzọ,+N’ihi na abụ m Chineke, abụghị m mmadụ. Abụ m Onye Nsọ nke nọnyeere unu. Agaghịkwa m eji iwe bịakwute unu. 10  Ha ga-eso Jehova. Ọ ga-ebigbọkwa ka ọdụm.+ Ya bigbọọ, ụmụ ya ga-esi n’ebe ọdịda anyanwụ mara jijiji bịa.+ 11  Ha ga-ama jijiji dị ka nnụnụ mgbe ha ga-esi n’Ijipt pụta. Ha ga-esikwa n’Asiria pụta dị ka nduru.+ M ga-emekwa ka ha biri n’ụlọ ha.” Ọ bụ mụnwa bụ́ Jehova na-ekwu ihe a.+ 12  “Ifrem ji ụgha gbaa m gburugburu,Ndị Izrel jikwa aghụghọ gbaa m gburugburu.+ Ma Juda ka so Chineke na-eje ije. Ọ na-erubekwara Onye Kacha Nsọ isi.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, ndị amụma na ndị ọzọ e zigara ka ha kụziere Izrel ihe.
Ma ọ bụ “M ji ịhụnanya mere ụdọ m ji dọta ha n’ebe m nọ.” Ihe a yiri otú nne ma ọ bụ nna nwere ike isi jiri ụdọ na-akụziri nwa ya ịga ije.
Na Hibru, “Ebere m na-emetere gị dị ọkụ.”