Ezra 4:1-24

  • Ndị iro gbalịrị ime ka a kwụsị ịrụ ụlọ nsọ (1-6)

  • Ndị iro degaara Eze Atazaksis akwụkwọ ozi (7-16)

  • Atazaksis zaghachiri ha (17-22)

  • Ọrụ a na-arụ n’ụlọ nsọ kwụsịrị (23, 24)

4  Mgbe ndị iro Juda na Benjamin+ nụrụ na ndị ahụ si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta+ na-arụrụ Jehova bụ́ Chineke Izrel ụlọ nsọ, 2  ha bịakwutere Zerubabel na ndị isi ọnụmara dị iche iche ozugbo ma sị ha: “Ka anyị soro unu rụọ ụlọ a n’ihi na anyị so unu efe* Chineke unu.+ Anyị na-achụkwara ya àjà kemgbe oge Eze Isa-hadọn+ nke Asiria, bụ́ onye kpọtara anyị n’ebe a.”+ 3  Ma, Zerubabel na Jeshụa na ndị ọzọ bụ́ ndị isi ọnụmara n’Izrel sịrị ha: “E nweghị ihe jikọrọ anyị na unu n’ụlọ a anyị na-arụrụ Chineke anyị+ n’ihi na ọ bụ naanị anyị ga-arụrụ ya Jehova bụ́ Chineke Izrel, otú Eze Saịrọs bụ́ eze Peshia nyere anyị n’iwu.”+ 4  Ndị ala ahụ wee na-eme ka obi ghara isi ndị Juda ike,* na-emekwa ka ike ịrụ ụlọ ahụ gwụ ha.+ 5  Ha goro ndị ndụmọdụ ka ha ghasaa atụmatụ ha+ n’oge niile Eze Saịrọs nke Peshia na-achị ruo n’oge Eze Darayọs+ chịwara Peshia. 6  Mgbe Ahazuirọs malitere ịchị, ha dere akwụkwọ ozi. N’akwụkwọ ozi ahụ, ha boro ndị bi na Juda na Jeruselem ebubo. 7  N’oge ọchịchị Eze Atazaksis nke Peshia, Bishlam, Mitridat, Tabiel, na ndị òtù ya ndị ọzọ, degaara Atazaksis bụ́ eze akwụkwọ ozi. Ha sụgharịrị ya n’asụsụ Arameik,+ jiri mkpụrụ akwụkwọ Arameik dee ya.* 8  * Rihọm, onye ọkwá ya gbagotere n’ọchịchị, na Shimshaị bụ́ odeakwụkwọ degaara Eze Atazaksis akwụkwọ ozi ma bo ndị bi na Jeruselem ebubo, sị: 9  (O si n’aka Rihọm, onye ọkwá ya gbagotere n’ọchịchị, na Shimshaị bụ́ odeakwụkwọ na ndị ọzọ ha na ha na-arụkọ ọrụ, ndị ikpe na ndị osote gọvanọ, ndị odeakwụkwọ, ndị Irek,+ ndị Babịlọn, ndị bi na Susa,+ ya bụ, ndị Ịlam,+ 10  na mba ndị ọzọ Asenapa onye ukwu a na-akwanyere ùgwù dọọrọ n’agha ma kpọta n’obodo ndị dị na Sameria,+ nakwa ndị ọzọ bi n’ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis.* Ugbu a, 11  ihe a bụ ihe e dere n’akwụkwọ ozi ha zigaara ya.) “Eze Atazaksis, ndị na-ejere gị ozi, ndị bi n’ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis, na-edetara gị akwụkwọ ozi: Ugbu a, 12  ka eze mara na ndị Juu si n’ebe ị nọ bịakwute anyị erutela Jeruselem. Ha na-arụghachi obodo ọjọọ ahụ na-enupụ isi, ha na-achọkwa ịrụcha mgbidi ya+ na ịrụzi ntọala ya. 13  Ugbu a, ka eze mara na ọ bụrụ na a rụghachi obodo a, rụchaakwa mgbidi ya, ha agaghị atụ ụtụ isi, ụtụ ahịa,+ ma ọ bụ ụtụ ụzọ. Ọ ga-eme ka ndị eze ghara inweta ego ole ha kwesịrị ịna-enweta. 14  Ebe ọ bụ na anyị na-eri nnu si n’obí eze,* ọ dịghị mma ka anyị kwe ka e mebiere eze ihe. Ọ bụ ya mere anyị ji zite akwụkwọ ozi a ka anyị kọọrọ ya eze, 15  ka e wee nyochaa n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge nna nna gị hà.+ Ị ga-ahụ n’akwụkwọ ahụ, matakwa na obodo a bụ obodo na-enupụ isi ma na-akpatara ndị eze na ógbè* dị iche iche nsogbu. Malite n’oge gboo, e nwere ụfọdụ n’ime ha na-emegide ndị ọchịchị. Ọ bụ ya mere e ji bibie obodo a.+ 16  Anyị na-eme ka eze mara na ọ bụrụ na a rụghachi obodo a ma rụchaa mgbidi ya, ị gakwaghị na-achị ógbè* dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis.”+ 17  Eze wee zigara Rihọm, onye ọkwá ya gbagotere n’ọchịchị, ozi, ya na Shimshaị bụ́ odeakwụkwọ na ndị ọzọ ha na ha na-arụkọ ọrụ, bụ́ ndị bi na Sameria na ndị ọzọ bi n’ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis. Ọ sịrị ha: “Ana m ekele unu! Ugbu a, 18  a gụọrọla m* akwụkwọ ozi unu ziteere anyị nke ọma. 19  M nyere iwu, e mee nchọnchọ ma chọpụta na malite n’oge gboo, obodo ahụ na-emegide ndị eze. Ha na-enupụkwa isi ma na-akpata ọgba aghara.+ 20  E nwekwara ndị eze dị ike chịrị Jeruselem, ndị chịkwara ndị niile bi n’ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis. A kwụkwara ha ụtụ isi, ụtụ ahịa, na ụtụ ụzọ. 21  Nyenụ iwu ka ụmụ nwoke ndị a kwụsị ọrụ, ka a ghara ịrụghachi obodo ahụ ruo mgbe m nyere iwu. 22  Hụnụ na unu mere ihe a, ka a ghara imebikwuru eze ihe.”+ 23  Mgbe a gụchaara Rihọm na Shimshaị bụ́ odeakwụkwọ na ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ akwụkwọ ozi Eze Atazaksis, ha gawara Jeruselem ozugbo, gakwuru ndị Juu ma manye ha ka ha kwụsị ọrụ ahụ. 24  Ọ bụ mgbe ahụ ka ọrụ a na-arụ n’ụlọ Chineke dị na Jeruselem kwụsịrị. Ọrụ ahụ kwụsịrị ruo n’afọ nke abụọ n’ọchịchị Eze Darayọs nke Peshia.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “achọ.”
Na Hibru, “na-eme ka aka ndị Juda ghara isi ike.”
O nwere ike ịbụ, “E dere ya n’asụsụ Arameik ma sụgharịa ya.”
Ọ bụ asụsụ Arameik ka e ji dee Ezra 4:8 ruo 6:18.
Ma ọ bụ “n’ógbè dị n’Ofe Osimiri.”
Ma ọ bụ “e si n’obí eze akwụ anyị ụgwọ ọnwa.”
Ma ọ bụ “ná mpaghara.”
N’Arameik, “enwe òkè n’ógbè.”
O nwere ike ịbụ, “a sụgharịala ma gụọrọ m.”