Ezikiel 7:1-27

  • Ọgwụgwụ eruola (1-27)

    • Ọdachi a na-enwetụbeghị ụdị ya (5)

    • Ndị mmadụ ga-atụfu ego ha n’okporo ámá (19)

    • A ga-emerụ ụlọ nsọ (22)

7  Jehova gwara m ọzọ, sị:  “Nwa nke mmadụ, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru gbasara ala Izrel, sị, ‘Ọgwụgwụ eruola! M ga-ebibi ala a niile.  Ọgwụgwụ unu eruola. M ga-ewesa unu iwe, kpee unu ikpe ihe niile unu mere, kwụọkwa unu ụgwọ arụ niile unu kpara.  Agaghị m emere unu ebere,* agaghịkwa m enwere unu ọmịiko,+ n’ihi na m ga-akwụ unu ụgwọ ihe niile unu mere. Unu ga-atakwa ahụhụ arụ unu kpara.+ Unu ga-amarakwa na m bụ Jehova.’+  “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: ‘E nwere ọdachi na-abịanụ. Ọ bụ ọdachi a na-enwetụbeghị ụdị ya.+  Ọgwụgwụ na-abịa. Ọgwụgwụ ga-abịa. Ọ ga-abịa mee unu ihe na mberede. Ọ na-abịa.  Ndị bi n’ala a, oge unu eruola. Oge unu na-abịa. Ụbọchị unu dị nso.+ E nwere ọgba aghara. Ọ bụghịkwa mkpu ọṅụ a na-eti n’ugwu.  “‘N’oge na-adịghị anya, m ga-ewesa unu iwe.+ M ga-ewesa unu ezigbo iwe.+ M ga-ekpe unu ikpe maka ihe niile unu mere, kwụọkwa unu ụgwọ arụ niile unu kpara.  Agaghị m emere unu ebere. Agaghịkwa m enwere unu ọmịiko.+ M ga-akwụ unu ụgwọ ihe niile unu mere. Unu ga-atakwa ahụhụ arụ unu kpara. Unu ga-amarakwa na m bụ Jehova, nakwa na ọ bụ m na-ata unu ahụhụ.+ 10  “‘Ụbọchị ahụ na-abịa.+ Ọ dị nso. Oge unu eruola. Mkpanaka m ga-eji taa unu ahụhụ adịla.* Onye iro adịkwuola mpako.* 11  Tigbuo zọgbuo aghọọla mkpanaka e ji ata ndị ajọ omume ahụhụ.+ Ihe niile gbasara ha ga-ala n’iyi, ma hanwa ma akụ̀ ha ma otú ha si bụrụ ndị a ma ama. 12  Ụbọchị na oge ihe a ga-eme ga-eru. Ka onye na-azụ ihe ghara ịṅụrị ọṅụ, ka onye na-ere ihe ghara iruwe uju, n’ihi na m ga-ewesa ha niile ezigbo iwe.*+ 13  N’ihi na onye rere ala agaghị alaghachi n’ala o rere, ọ bụrụgodị na ọ ka nọ ndụ, maka na ọhụụ a bụ gbasara ihe ga-eme mmadụ niile. E nweghị onye ga-alọghachi. E nweghịkwa onye ga-azọli onwe ya ndụ n’ihi mmehie o mere. 14  “‘Ha afụọla opi.+ Mmadụ niile ejikerekwala, ma e nweghị onye na-aga agha, n’ihi na m na-ewesa mmadụ niile ezigbo iwe.+ 15  Mma agha dị n’èzí.+ Ọrịa na-efe efe na ụnwụ dị n’ime ụlọ. A ga-eji mma agha gbuo onye ọ bụla nọ n’ubi. Ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-egbukwa ndị nọ n’ime obodo.+ 16  Ndị jisiri ike gbapụ ga-agbaga n’ugwu. Ha niile ga-adị ka nduru nọ na ndagwurugwu. Onye nke ọ bụla n’ime ha ga na-ebe ákwá n’ihi mmehie ya.+ 17  Aka ha niile ga-akụda. Ikpere ha niile ga na-agụsịkwa mmiri.*+ 18  Ha eyirila ákwà iru uju,+ na-amakwa jijiji. Ihere ga-eme onye ọ bụla. Isi ọ bụla ga-akwọchakwa akwọcha.*+ 19  “‘Ha ga-atụfu ọlaọcha ha n’okporo ámá. Ọlaedo ha ga na-asọkwa ha oyi. Ma ọlaọcha ha ma ọlaedo ha agaghị azọpụtali ha n’ụbọchị oké iwe Jehova.+ Afọ agaghị eju ha.* Ha agaghịkwa enyeju onwe ha afọ, n’ihi na ọ* ghọọla ihe na-eme ka ha mehie.* 20  Ha ji mma ọla ha ji achọ mma mara na-eme ọnụ. Ha jikwa ha* kpụọ arụsị ha niile rụrụ arụ.+ Ọ bụ ya mere m ga-eji mee ka ọ na-asọ ha oyi. 21  M ga-enyefe ya* n’aka ndị mba ọzọ ka ha bukọrọ ya, nyefeekwa ya n’aka ndị ajọ omume nọ n’ụwa ka ha buru ya. Ha ga-emerụkwa akụ̀ ndị a. 22  “‘M ga-agbakụta ha azụ.+ Ha ga-emerụkwa ebe m ji kpọrọ ihe.* Ndị ohi ga-abatakwa n’ime ya merụọ ya.+ 23  “‘Rụọ agbụ ígwè,*+ n’ihi na a na-ekpe ndị mmadụ ikpe mkpegbu n’obodo a niile, na-egbukwa ha.+ Tigbuo zọgbuo jukwara n’obodo a.+ 24  M ga-akpọbata ndị kacha njọ ná mba niile.+ Ha ga-ebichikwa n’ụlọ ndị obodo a.+ M ga-emekwa ka ndị dị ike kwụsị nganga ha na-akpa. A ga-emerụkwa ebe nsọ ha.+ 25  Mgbe ha ga-ahụsi anya, ha ga-achọ udo, ma ọ gaghị adị.+ 26  Ọdachi ga-esochi ọdachi, akụkọ esochiekwa akụkọ. Ndị mmadụ agaghị anụ ihe ọ bụla n’ọnụ onye amụma ha chọrọ ka ọ kọọrọ ha ọhụụ.+ Ihe ndị nchụàjà na-akụzi na ndụmọdụ ndị okenye na-enye agaghịkwa aba uru ọ bụla.+ 27  Eze ga na-eru uju.+ Obi ga-agbawa onyeisi. Ụjọ ji ndị obodo a ga-emekwa ka aka ha na-ama jijiji. M ga-akwụ ha ụgwọ ihe ha mere, kpeekwa ha ikpe otú ha kpere ndị ọzọ. Ha ga-amarakwa na m bụ Jehova.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Anya m agaghị emere unu ebere.”
Na Hibru, “Mpako epuola ome.”
Na Hibru, “Mkpanaka awaala okooko.”
Ya bụ, ma ndị na-azụ ala ma ndị na-ere ala agaghị erite uru ọ bụla, n’ihi na a ga-ebibi ha niile.
Ya bụ, ha ga-aba mamịrị ọkụ.
Ya bụ, onye ọ bụla ga-akpụ isi o ji eru uju.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ha.”
Ya bụ, ọlaọcha ha na ọlaedo ha.
Ma ọ bụ “ihe nwere ike ime ka ha daa ma mehie.”
Ya bụ, ihe ndị ha ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ.
Ya bụ, ọlaọcha ha na ọlaedo ha ndị ha ji kpụọ arụsị.
Ma ọ bụ “ebe m nke zoro ezo.” Ọ ga-abụ ebe dị n’ime ime ụlọ nsọ Jehova.
Ya bụ, agbụ ígwè a na-eke ndị a dọọrọ n’agha.