Ezikiel 46:1-24
46 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘Ọnụ ụzọ ámá nke ogige dị n’ime nke chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ+ ga-emechi emechi+ ruo ụbọchị isii a na-arụ ọrụ.+ Ma, a ga-emeghe ya n’Ụbọchị Izu Ike, megheekwa ya n’ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ.
2 Onyeisi ga-esi n’ogige dị ná mpụta bata.+ Ọ ga-esi n’ihe a rụnyere n’ụzọ e si abata n’ọnụ ụzọ ámá. Ya bata, ya eguzoro n’akụkụ awara ọnụ ụzọ ámá. Ndị nchụàjà ga-achụrụ ya àjà a na-esucha ọkụ na àjà udo, ọ ga-akpọkwa isiala n’ebe e si abata n’ọnụ ụzọ ámá. Ya kpọchaa, ya apụọ. Ma, ọnụ ụzọ ámá ahụ ga-eghere oghe ruo mgbede.
3 Ndị ala a ga-akpọ isiala n’ihu Jehova n’ọnụ ụzọ ámá ahụ n’Ụbọchị Izu Ike nakwa n’ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ.+
4 “‘Ihe onyeisi ga-eji chụọrọ Jehova àjà a na-esucha ọkụ n’Ụbọchị Izu Ike ga-abụ obere ebule isii ahụ́ dị mma na otu nnukwu ebule ahụ́ dị mma.+
5 Ihe ọ ga-eji achụrụ ya àjà ọka ga-abụ otu efa* ntụ ọka maka nnukwu ebule ahụ. Ma, ọ ga-eji ntụ ọka ole ọ ga-ewetali chụọ àjà ọka maka obere ebule ndị ahụ. Mmanụ ọ ga-eweta ga-abụ otu hin* maka otu efa ntụ ọka.+
6 N’ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ, ọ ga-esi n’ìgwè ehi weta obere oké ehi ahụ́ dị mma, obere ebule isii na otu nnukwu ebule. Ha ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+
7 Ọ ga-ewetakwa otu efa ntụ ọka maka obere oké ehi na otu efa ntụ ọka maka ebule nakwa ntụ ọka ole ọ ga-ewetali maka obere ebule ndị ahụ iji chụọ àjà ọka. Mmanụ ọ ga-eweta ga-abụ otu hin maka otu efa ntụ ọka.
8 “‘Onyeisi chọọ ịbata, ọ ga-esi n’ihe a rụnyere n’ụzọ e si abata n’ọnụ ụzọ ámá bata. Ọ ga-esikwa ebe ahụ pụọ.+
9 Mgbe ọ bụla ndị ala a batara n’ihu Jehova n’oge ememme,+ ndị si n’ọnụ ụzọ ámá dị n’ebe ugwu bata ife Chineke ga-esi n’ọnụ ụzọ ámá ndịda pụọ,+ ndị nke si n’ọnụ ụzọ ámá ndịda bata+ ga-esi n’ọnụ ụzọ ámá dị n’ebe ugwu pụọ. E nweghị onye ga-esi n’ụzọ o si bata pụọ. Ha ga-esi n’ọnụ ụzọ ámá ha chere ihu pụọ.
10 Onyeisi ha na ya so ga-abata mgbe ha batara, pụọkwa mgbe ha pụrụ.
11 N’oge ememme nakwa n’oge oriri, ihe ọ ga-eji chụọ àjà ọka bụ otu efa ntụ ọka maka obere oké ehi, otu efa ntụ ọka maka ebule, na ntụ ọka ole ọ ga-ewetali maka obere ebule ndị ahụ. Mmanụ ọ ga-eweta ga-abụ otu hin maka otu efa ntụ ọka.+
12 “‘Ọ bụrụ na onyeisi abịa ịchụrụ Jehova àjà a na-esucha ọkụ+ ma ọ bụ àjà udo ka ọ bụrụ onyinye si ya n’obi, a ga-emeghere ya ọnụ ụzọ ámá chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ọ ga-achụ àjà a na-esucha ọkụ na àjà udo ahụ otú ọ na-eme n’Ụbọchị Izu Ike.+ A ga-emechikwa ọnụ ụzọ ámá ahụ ma ọ pụọ.+
13 “‘Kwa ụbọchị, a ga na-eweta obere ebule ahụ́ dị mma, nke na-agafebeghị otu afọ, ka e jiri ya na-achụrụ Jehova àjà a na-esucha ọkụ.+ A ga na-eweta ya n’ụtụtụ ọ bụla.
14 Ihe ọzọ a ga na-eweta ka e jiri na-achụ àjà ọka kwa ụtụtụ bụ otu ụzọ n’ụzọ isii nke otu efa ntụ ọka, otu ụzọ n’ụzọ atọ nke otu hin mmanụ nke a ga na-efesa ná ntụ ọka e gwere nke ọma. A ga-eji ya na-achụrụ Jehova àjà ọka. Ihe a bụ iwu ga-adịgide adịgide.
15 Kwa ụtụtụ, a ga na-eweta obere ebule, ntụ ọka a ga-eji na-achụ àjà ọka, nakwa mmanụ ka e jiri ha na-achụ àjà a na-esucha ọkụ mgbe niile.’
16 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘Ọ bụrụ na onyeisi enye ụmụ ya ala ka ọ bụrụ ihe ha ketara, ala ahụ ga-abụ nke ụmụ ya. Ọ bụ ala ha ketara eketa.
17 Ma, ọ bụrụ na o nye otu n’ime ndị na-ejere ya ozi ala ya, ọ ga-abụ nke onye ahụ ruo afọ nnwere onwe.+ Afọ ahụ ruo, ala ahụ ga-abụrụghachi nke onyeisi ahụ. Ọ bụ naanị ụmụ ya ga-eketa ala ya, ya abụrụ nke ha mgbe niile.
18 Onyeisi ekwesịghị ịnara ndị m ala ha. O kwesịrị isi n’ala ya nye ụmụ ya ala, ka a ghara inwe onye ọ bụla n’ime ndị m a ga-anara ala ya.’”
19 Onye ahụ na-akpọgharị m mechara si n’ụzọ dị n’akụkụ ọnụ ụzọ ámá kpọbata m+ n’ụlọ dị nsọ ndị nchụàjà na-anọ eri ihe. Ụlọ a chere ihu n’ebe ugwu.+ M nọkwa ebe ahụ hụ ebe dị n’azụ azụ n’ebe ọdịda anyanwụ.
20 Ọ sịrị m: “Ebe a ka ndị nchụàjà ga na-esi anụ e ji chụọ àjà ikpe ọmụma na àjà mmehie, na-eghekwa ọka e ji chụọ àjà ọka,+ ka e wee ghara ibupụ ihe ọ bụla n’ogige dị ná mpụta, gharakwa ime ka ndị ọzọ dị nsọ.”+
21 O sikwa n’ogige dị ná mpụta kpọpụta m ma duru m gaa n’akụkụ anọ nke ogige ahụ. M nọkwa ebe ahụ hụ na e nwere ogige dị n’akụkụ nke ọ bụla n’ogige ahụ dị ná mpụta.
22 E nwere obere ogige anọ ndị dị n’akụkụ anọ nke ogige ahụ. Ha dị kubit* iri anọ n’ogologo, dịrịkwa kubit iri atọ n’obosara. Ha anọ hà otu.
23 A rụrụ pevment* gburugburu ha anọ. N’okpuru pevment ndị ahụ, e nwere ebe dị iche iche a rụrụ ka a nọrọ na ha na-esi ihe ndị e ji chụọ àjà.
24 Ọ gwaziri m, sị: “Ụlọ ndị a bụ ụlọ ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ na-anọ esi anụ ndị mmadụ ji chụọ àjà.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “E doro okwute.”