Ezikiel 45:1-25

  • Ala dị nsọ na ala nke obodo (1-6)

  • Ala onyeisi ga-eketa (7, 8)

  • Ndị isi ga na-akwụwa aka ọtọ (9-12)

  • Onyinye ndị obodo na onyeisi ga-enye (13-25)

45  “‘Mgbe unu na-eke ala ahụ ka onye ọ bụla nweta nke ya,+ unu ga-ekepụta nke unu ga-enye Jehova. Nke ahụ unu ga-enye ya ga-adị nsọ.+ Ogologo ya ga-adị puku kubit* iri abụọ na puku ise (25,000). Obosara ya ga-adị puku kubit iri (10,000).+ Ebe ahụ niile ga-adị nsọ.  A ga-esi ebe ahụ tụpụta ebe ụlọ nsọ ga-adị. Akụkụ ọ bụla n’ime akụkụ ya anọ ga-adị narị kubit ise (500).+ A ga-esikwa n’akụkụ ya anọ ahụ tụpụta ebe ndị anụmanụ ga na-ata ahịhịa. Akụkụ ya nke ọ bụla ga-adị kubit iri ise.+  Ị ga-esi n’ala ahụ tụpụta ala nke ogologo ya dị puku kubit iri abụọ na puku ise (25,000), obosara ya adịrị puku kubit iri (10,000). Ọ bụ n’ebe ahụ ka ụlọ nsọ ga-adị. Ọ bụkwa ihe kacha nsọ.  Ọ ga-abụ ala dị nsọ a ga-enye ndị nchụàjà,+ ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ, ndị na-abịa n’ihu Jehova na-ejere ya ozi.+ Ọ ga-abụ ebe ha ga-arụ ụlọ, bụrụkwa ebe dị nsọ a ga-arụ ụlọ nsọ.  “‘Ogologo ya ga-adị puku kubit iri abụọ na puku ise (25,000), obosara ya adịrị puku kubit iri (10,000).+ Ọ ga-abụ nke ndị Livaị, ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ. A ga-ekenye ha ọnụ ụlọ iri abụọ a ga-anọ na-eri ihe.+  “‘Unu ga-atụpụta ala dị puku kubit iri abụọ na puku ise (25,000) n’ogologo (ya bụ, nke hà ka nke ahụ dị nsọ), nakwa puku kubit ise (5,000) n’obosara, ka ọ bụrụ nke obodo unu.+ Ọ ga-abụ nke ndị Izrel niile.  “‘Onyeisi ga-enwe ala n’otu akụkụ nakwa n’akụkụ nke ọzọ nke ala ahụ dị nsọ nakwa nke ala obodo unu. Ala a ọ ga-enweta ga-adị n’akụkụ ala ahụ dị nsọ nakwa n’akụkụ ala obodo unu. Ọ ga-adị n’ebe ọdịda anyanwụ nakwa n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ogologo ya ga-aha ka otu n’ime ala ahụ otu ebo ketara, malite n’ókè nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ ruo n’ókè nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ.+  Ala ahụ ga-abụ nke ya n’Izrel. Ndị m mere ndị isi agaghịzi na-emegbu ndị m.+ Ha ga-ekere ndị Izrel ala ahụ n’ebo n’ebo.’+  “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘Ndị isi Izrel, o zuolara unu!’ “‘Kwụsịnụ tigbuo zọgbuo na mmegbu. Kpewenụ ikpe ziri ezi, mewekwanụ ezi omume.+ Kwụsịnụ ịnara ndị m ihe ha.’+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a. 10  ‘Unu ga-enwe ihe zuru ezu e ji atụ̀ ihe na efa* zuru ezu nakwa bat* zuru ezu.+ 11  Efa na bat ga-aha otu. Otu ụzọ n’ụzọ iri nke homa* kwesịrị iju otu bat. Otu ụzọ n’ụzọ iri nke homa kwesịkwara iju otu efa. Ọ bụ homa ka a ga-eji na-atụ̀ ihe. 12  Otu shekel*+ ga-abụ gira* iri abụọ. Shekel iri isii ga-abụ otu mene.’* 13  “‘Ọ bụ onyinye ndị a ka unu ga na-enye: n’ime ọka wit ọ bụla dị otu homa, unu ga-enye otu ụzọ n’ụzọ isii nke otu efa. N’ime ọka bali ọ bụla dị otu homa, unu ga-enye otu ụzọ n’ụzọ isii nke otu efa. 14  Mmanụ unu ga-enye ga-abụ mmanụ juru otu bat. E kee otu kọọ* ụzọ iri, otu ụzọ bụ otu bat. E kee otu homa ụzọ iri, otu ụzọ bụ otu bat, n’ihi na bat iri bụ otu homa. 15  A ga-esikwa na narị atụrụ abụọ (200) ọ bụla n’Izrel were otu atụrụ nye onyinye. Ihe ndị a ka a ga-enye maka àjà ọka,+ àjà a na-esucha ọkụ,+ nakwa àjà udo,+ iji kpuchiere ndị ala a mmehie ha.’+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a. 16  “‘Ndị ala a niile ga-enye onyeisi Izrel onyinye a.+ 17  Ma, ọ bụ onyeisi ahụ ga-eweta ihe a ga-eji chụọ àjà a na-esucha ọkụ,+ àjà ọka,+ na àjà mmanya n’oge ememme,+ n’ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ, n’Ụbọchị Izu Ike,+ ya bụ, n’oge ememme niile ndị Izrel na-eme.+ Ọ bụ yanwa ga-eweta ihe a ga-eji chụọ àjà mmehie, àjà ọka, àjà a na-esucha ọkụ, na àjà udo, iji kpuchiere ndị Izrel mmehie ha.’ 18  “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘N’abalị mbụ n’ọnwa mbụ, ị ga-esi n’ìgwè ehi were obere oké ehi ahụ́ dị mma. Ị ga-ejikwa ya mee ka ụlọ nsọ m dị ọcha.+ 19  Onye nchụàjà ga-ewere ọbara anụ ahụ e ji chụọ àjà mmehie ahụ tee n’awara ụzọ ụlọ nsọ,+ n’akụkụ anọ nke nnukwu pevment gbara ebe ịchụàjà gburugburu, nakwa n’awara ụzọ ọnụ ụzọ ámá nke ogige dị n’ime. 20  Otú ahụkwa ka ị ga-eme n’abalị asaa n’ọnwa ahụ n’ihi onye ọ bụla mehiere n’amaghị ụma ma ọ bụkwanụ n’ihi onye na-akpachaghị anya mee mmehie.+ Unu ga-esi otú a mee ka ụlọ nsọ dị ọcha.+ 21  “‘N’abalị iri na anọ n’ọnwa mbụ, unu ga-eme Ememme Ngabiga.+ Malite n’ụbọchị ahụ ruo abalị asaa, ihe unu ga na-eri bụ achịcha na-ekoghị eko.+ 22  N’ụbọchị ahụ, onyeisi ga-eweta obere oké ehi ọ ga-eji chụọ àjà mmehie maka onwe ya na ndị ala a niile.+ 23  N’ime abalị asaa a ga-eme ememme ahụ, ọ ga na-eweta ihe a ga-eji chụọrọ Jehova àjà a na-esucha ọkụ. Kwa ụbọchị, ọ ga-eweta obere oké ehi asaa ahụ́ dị mma na ebule asaa ahụ́ dị mma.+ Ọ ga na-ewetakwa mkpi a ga-eji chụọ àjà mmehie n’ụbọchị nke ọ bụla. 24  Ọ ga-ewetakwa otu efa ntụ ọka maka obere oké ehi nke ọ bụla iji chụọ àjà ọka, wetakwa otu efa ntụ ọka maka ebule nke ọ bụla. Mmanụ ọ ga-eweta ga-abụ otu hin* maka otu efa ntụ ọka. 25  “‘Malite n’abalị iri na ise n’ọnwa nke asaa, n’ime ụbọchị asaa a ga-eme ememme ahụ,+ ọ ga na-eweta ihe ndị ahụ o wetara e ji chụọ àjà mmehie, àjà a na-esucha ọkụ, na àjà ọka, wetakwa mmanụ hà ka nke mbụ o wetara.’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Otu kubit nke a na-adị ogologo karịa otú otu kubit na-aha. Gụọ B14.
Efa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Gụọ B14.
Bat bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Gụọ B14.
Homa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “maịna.” Gụọ B14.
Gira bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Gụọ B14.
Gụọ B14.
Kọọ bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Gụọ B14.
Hin bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Gụọ B14.