Ezikiel 43:1-27
43 O mechara duru m gaa n’ọnụ ụzọ ámá chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ.+
2 M nọ ebe ahụ hụ ka ebube Chineke Izrel si n’ebe ọwụwa anyanwụ na-abịa.+ Olu Chineke na-adakwa ka ebe mmiri na-asọsi ike.+ Ebube ya nọkwa na-enye ìhè n’ụwa.+
3 Ihe a m hụrụ yiri ihe m hụrụ n’ọhụụ mgbe m* bịara ịla obodo a n’iyi. O yikwara ihe m hụrụ n’ọhụụ n’akụkụ osimiri Kiba.+ M gbukwara ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala.
4 Ebube Jehova sikwa n’ọnụ ụzọ ámá chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ bata n’ụlọ nsọ.*+
5 Otu mmụọ* bukwaara m bubata n’ogige dị n’ime, mụ ahụ na ebube Jehova ejupụtala n’ụlọ nsọ.+
6 M nụkwara ka otu onye si n’ụlọ nsọ na-agwa m okwu. Onye ahụ bịakwara guzoro m n’akụkụ.+
7 Ọ gwara m, sị:
“Nwa nke mmadụ, ebe a bụ ebe ocheeze m dị.+ Ọ bụkwa ebe m na-azọkwasị ụkwụ.+ Ọ bụ ebe m ga-ebi n’Izrel ruo mgbe ebighị ebi.+ Ndị Izrel agaghịzi emebi aha nsọ m ọzọ,+ ma ha ma ndị eze ha. Otú ha si na-emebi ya bụ na ha na-akpa àgwà ka ndị akwụna, n’ihi na ha hapụrụ m na-efe arụsị ndị ha weere ka ndị eze ha.
8 Ha rụnyere ụzọ ha si abata n’akụkụ ụzọ m si abata, rụnyekwa awara ụzọ ha n’akụkụ awara ụzọ m, nke na ọ bụ naanị ahụ́ ụlọ dị n’agbata mụ na ha.+ Ha ji arụ niile ha kpara mebie aha nsọ m, nke mere m ji jiri iwe kpochapụ ha.+
9 Ugbu a, ọ bụrụ na ha akwụsị ịna-akpa àgwà ka ndị akwụna, ya bụ, ghara ịhapụ m na-efe arụsị ndị ha weere ka ndị eze ha, mụ na ha ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.+
10 “Nwa nke mmadụ, kọọrọ ndị Izrel otú ụlọ nsọ a dị,+ ka ihere mee ha n’ihi mmehie ha.+ Ha kwesịkwara ileru otú e si see ya anya.*
11 Ọ bụrụkwa na ihere emee ha n’ihi ihe niile ha mere, gwa ha otú ụlọ nsọ a dị, otú e si rụọ ya, ụzọ niile e si apụ na ya, na ụzọ niile e si abata na ya.+ Gosi ha otú ụlọ a dị. Gwa ha iwu na ntụziaka niile gbasara ya, nọrọkwa n’ihu ha dee ha, ka ha nwee ike ịma ihe niile gbasara otú e si rụọ ụlọ a, nweekwa ike ịna-eso ntụziaka niile gbasara ya.+
12 Iwu gbasara ụlọ nsọ a bụ: Ebe niile dị gburugburu elu ugwu ebe ụlọ nsọ a dị bụ ebe kacha nsọ.+ Ọ bụ iwu gbasara ụlọ nsọ a.
13 “Otú a ka ebe ịchụàjà ahụ hà ma a tụọ ya na kubit na kubit,+ (otu kubit nke a bụ otu kubit na otu uhiè ọbụ aka).* Ala ala ya dị otu kubit. Obosara ya dị otu kubit. Gburugburu ọnụ ya dị otu ntụ ọbụ aka.* Otú a ka ala ala ebe ịchụàjà ahụ hà.
14 Malite n’ala ala ya ruo n’obere pevment gbara ya gburugburu dị kubit abụọ, ma obosara ya dị otu kubit. Malite n’obere pevment ahụ gbara ya gburugburu ruo ná nnukwu pevment gbara ya gburugburu dị kubit anọ, ma obosara ya dị otu kubit.
15 Ogo ekwú ebe ịchụàjà ya dị kubit anọ. E nwekwara mpi anọ si n’ekwú ebe ịchụàjà ahụ pịpụta ọnụ.+
16 Ekwú ebe ịchụàjà ya dị kubit iri na abụọ n’ogologo, kubit iri na abụọ n’obosara, akụkụ ya anọ hà otu.+
17 Akụkụ anọ nke nnukwu pevment ahụ gbara ya gburugburu dị kubit iri na anọ n’ogologo na kubit iri na anọ n’obosara. Gburugburu ọnụ ya dị ọkara kubit. Ala ala ya dị otu kubit gbaa gburugburu.
“Steepụ e si arịgo ya chere ebe ọwụwa anyanwụ ihu.”
18 Ọ gwaziri m, sị: “Nwa nke mmadụ, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘N’ụbọchị a ga-arụ ebe ịchụàjà ahụ, a ga-eso ntụziaka ndị a mgbe a na-achụ àjà a na-esucha ọkụ n’elu ya, nakwa mgbe a na-efesa ọbara n’elu ya.’+
19 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘Ị ga-enye ndị Livaị bụ́ ndị nchụàjà, ndị si n’agbụrụ Zedọk,+ ndị na-abịakwute m ma na-ejere m ozi, obere oké ehi si n’ìgwè ehi, ka ọ bụrụ àjà mmehie.+
20 Werekwa ọbara ya tee na mpi anọ ahụ dị n’ebe ịchụàjà, teekwa ya n’akụkụ anọ nke nnukwu pevment gbara ya gburugburu nakwa gburugburu ọnụ ya. Ọbara ahụ ga-eme ka ebe ịchụàjà ahụ dị ọcha.+
21 Ị ga-akpụrụkwa obere oké ehi ahụ a ga-eji chụọ àjà mmehie, suo ya ọkụ n’ebe e kwuru ka a nọrọ suo ya ọkụ n’ụlọ nsọ ahụ, ya bụ, ná mpụga ụlọ nsọ ahụ.+
22 N’ụbọchị nke abụọ, ị ga-akpụta mkpi ahụ́ dị mma ka ọ bụrụ àjà mmehie. A ga-eme ka ebe ịchụàjà ahụ dị ọcha otú ahụ e si jiri obere oké ehi mee ka ọ dị ọcha.’
23 “‘I mechaa ka ebe ịchụàjà ahụ dị ọcha, ị ga-esi n’ìgwè ehi kpụta obere oké ehi ahụ́ dị mma, sikwa n’ìgwè atụrụ kpụta ebule ahụ́ dị mma.
24 Ị ga-akpụta ha n’ihu Jehova. Ndị nchụàjà ga-efesakwa ha nnu+ ma were ha chụọrọ Jehova àjà a na-esucha ọkụ.
25 N’ụbọchị ọ bụla, ị ga-akpụta otu mkpi, si n’ìgwè ehi kpụta obere oké ehi, sikwa n’ìgwè atụrụ kpụta otu ebule, ma jiri ha chụọ àjà mmehie. Ị ga-achụgide ya otú ahụ ruo ụbọchị asaa.+ Ha ga-abụ ndị nke na-enweghị ntụpọ.*
26 A ga-eji ụbọchị asaa chụọ àjà maka ebe ịchụàjà ahụ, meekwa ka ọ dị ọcha, ka a malite ịnọ na ya na-achụ àjà.
27 Ụbọchị asaa ahụ zuo, malite n’ụbọchị nke asatọ+ gawa, ndị nchụàjà ga na-achụrụ unu* àjà a na-esucha ọkụ na àjà udo n’elu ebe ịchụàjà ahụ. Ihe unu ga-amasịkwa m.’+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ O nwere ike ịbụ, “ọ.”
^ Na Hibru, “n’ụlọ.”
^ N’asụsụ Hibru, mmụọ e dere ebe a nwere ike ịbụ mmụọ nsọ ma ọ bụkwanụ mmụọ ozi.
^ Na Hibru, “ịtụ otú ọ dị atụ̀.”
^ Ya bụ, malite ná mkpịsị aka ukwu ruo na nke nta ma a gbasaa aka, ihe dị ka sentimita 22.2 (inch 8.75). Gụọ B14.
^ Ma ọ bụ “ahụ́ zuru okè.”
^ Ya bụ, ndị Izrel.