Ezikiel 41:1-26
41 O mechakwara kpọta m n’ọnụ ụlọ dị ná mpụta ụlọ nsọ,* tụọ ogidi ndị dị n’akụkụ ya. Obosara ha dị kubit* isii n’otu akụkụ, dịkwa kubit isii n’akụkụ nke ọzọ.
2 Ọnụ ụzọ e si abata ya dị kubit iri n’obosara. Akụkụ abụọ nke ọnụ ụzọ ahụ dị kubit ise n’otu akụkụ, dịkwa kubit ise n’akụkụ nke ọzọ. Ọ tụrụ ogologo ya, tụta ya kubit iri anọ. Ọ tụkwara obosara ya, tụta ya kubit iri abụọ.
3 Ọ banyeziri n’ọnụ ụlọ* ọzọ, tụọ igbidi ogidi dị n’akụkụ ọnụ ụzọ ya, tụta ya kubit abụọ. Ọ tụkwara obosara ọnụ ụzọ e si abanye ya, tụta ya kubit isii. Akụkụ abụọ ọnụ ụzọ ahụ* dịkwa kubit asaa.
4 Ebe ọzọ ọ tụrụ bụ ọnụ ụlọ chere ihu ná mpụta ebe nsọ. Ogologo ya dị kubit iri abụọ, obosara ya adịrị kubit iri abụọ.+ Ọ gwakwara m, sị: “Ebe a bụ Ebe Kacha Nsọ.”+
5 Ọ tụkwara ahụ́ ụlọ nsọ ahụ, igbidi ya adịrị kubit isii. Obosara ụlọ nke dị n’akụkụ ụlọ ahụ gbaa gburugburu dị kubit anọ.+
6 Ụlọ ndị ahụ dị n’akụkụ bụ ụlọ elu dị okpukpu atọ. Otu dị n’elu ibe ya. Nke ọ bụla n’ime ha nwere ọnụ ụlọ iri atọ. A rụnyekwara ihe ndị ji ọnụ ụlọ ndị ahụ dị n’akụkụ n’ahụ́ ụlọ nsọ ahụ gbaa gburugburu ka ha jikọta ahụ́ ụlọ nsọ ahụ na ọnụ ụlọ ndị ahụ, n’akpọpughị ahụ́ ụlọ nsọ ahụ akpọpu.+
7 Ọnụ ụlọ nke ọ bụla dị n’elu sara mbara karịa nke dị n’okpuru ya. Steepụ gbara okirikiri e si agbago n’elu ụlọ ahụ dịkwa n’akụkụ abụọ n’ụlọ nsọ ahụ.+ A na-esi na steepụ ahụ agbago n’okpukpu ụlọ nke mbụ, na-esi na ya agbago na nke abụọ, na-esikwa na ya agbago na nke atọ.
8 M hụkwara na e nwere ebe a kpụliri elu gburugburu ụlọ ahụ. Ntọala ọnụ ụlọ ndị ahụ dị n’akụkụ dị kubit isii n’ogo, ya bụ, otu okporo ahịhịa amị zuru ezu.
9 Obosara ahụ́ ọnụ ụlọ ndị ahụ dị n’akụkụ dị kubit ise ná mpụta. E nwekwara ebe a na-arụghị ihe ọ bụla* n’akụkụ ọnụ ụlọ ndị ahụ a gbakwụnyere n’ụlọ nsọ ahụ.
10 Ohere dị n’agbata ụlọ nsọ ahụ na ọnụ ụlọ ndị a na-anọ eri ihe+ dị kubit iri abụọ n’obosara n’akụkụ nke ọ bụla.
11 E nwere ụzọ abụọ dị n’agbata ọnụ ụlọ ndị ahụ dị n’akụkụ na ebe ahụ a na-arụghị ihe ọ bụla. Otu dị n’ebe ugwu, ọzọ adịrị n’ebe ndịda. Ebe ahụ a na-arụghị ihe ọ bụla dị kubit ise n’obosara gbaa gburugburu.
12 Ụlọ nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ, nke chere ihu n’ebe ahụ a na-arụghị ihe ọ bụla, dị kubit iri asaa n’obosara na kubit iri itoolu n’ogologo. Igbidi ahụ́ ụlọ ahụ dị kubit ise gbaa gburugburu.
13 Ọ tụkwara ụlọ nsọ ahụ, tụta ya otu narị (100) kubit n’ogologo. Ụlọ ahụ* na ahụ́ ya nakwa ebe ahụ a na-arụghị ihe ọ bụla dịkwa otu narị (100) kubit n’ogologo.
14 Ihu ụlọ nsọ ahụ, nke chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ, na ebe ahụ a na-arụghị ihe ọ bụla dị otu narị (100) kubit n’obosara.
15 Ọ tụkwara ụlọ ahụ chere ihu n’ebe ahụ a na-arụghị ihe ọ bụla, nke dị n’azụ ụlọ nsọ ahụ, tụọkwa varanda ya n’otu akụkụ, nakwa n’akụkụ nke ọzọ, tụta ogologo ha otu narị (100) kubit.
Ọ tụkwara ọnụ ụlọ dị ná mpụta ebe nsọ ahụ na nke dị n’ime+ nakwa ihe a rụnyere n’ụzọ e si abata n’ogige ahụ.
16 Ọ tụkwara ụzọ ndị e si abata na ha, tụọkwa windo ndị dị warara ná mpụta karịa otú ha dị n’ime,+ nakwa varanda ndị dị n’ụzọ ebe atọ ndị ahụ. E ji osisi machie ahụ́ ụlọ ahụ,+ malite n’ala ya ruo na windo ya. A kụchikwara windo ndị ahụ akụchi.
17 A tụrụ elu ọnụ ụzọ ahụ, tụọkwa ọnụ ụlọ nke dị n’ime ụlọ nsọ na nke dị ná mpụta ya. A tụkwara ahụ́ ụlọ nsọ ahụ niile gbaa gburugburu.
18 A tụrụ ọtụtụ cherob+ na nkwụ+ n’ahụ́ ụlọ ahụ. N’agbata otu cherob na cherob ọzọ, a tụrụ otu nkwụ. Cherob nke ọ bụla nwekwara ihu abụọ.
19 Ihu nke yiri ihu mmadụ chere nkwụ a tụrụ n’otu akụkụ cherob ihu. Ihu nke yiri ihu ọdụm chere nkwụ a tụrụ n’akụkụ ya nke ọzọ ihu.+ Otú a ka e si tụọ ha ebe niile n’ụlọ nsọ ahụ.
20 A tụrụ ọtụtụ cherob na nkwụ n’ahụ́ ụlọ nsọ ahụ, malite n’ala ya ruo n’elu ọnụ ụzọ e si abata na ya.
21 Awara ụzọ* ndị dị n’ụlọ nsọ ahụ nwere akụkụ anọ há nhata.+ N’ihu ebe nsọ ahụ,* e nwere ihe yiri
22 ebe ịchụàjà e ji osisi rụọ+ nke ogo ya dị kubit atọ, ogologo ya adịrị kubit abụọ. O nwere ogidi ndị dị n’isi isi ya. E ji osisi rụọ ala* ya nakwa akụkụ ya. Ọ gwaziri m, sị: “Ihe a bụ tebụl nke dị n’ihu Jehova.”+
23 Ọnụ ụlọ dị ná mpụta ụlọ nsọ ahụ nwere ọnụ ụzọ abụọ. Ebe kacha nsọ nwekwara ọnụ ụzọ abụọ.+
24 Ọnụ ụzọ nke ọ bụla nwere ibo abụọ. Ha abụọ nwekwara ike ịga ihu na azụ.
25 A tụrụ cherob na nkwụ n’ahụ́ ibo ụzọ nke dị n’ụlọ nsọ ahụ, dị ka ndị ahụ a tụrụ n’ahụ́ ụlọ ahụ.+ E jikwa osisi kụchie ihu ihe ahụ a rụnyere n’ụzọ e si abata n’ụlọ ahụ.
26 E tinyere windo ndị dị warara ná mpụta karịa otú ha dị n’ime,+ tụọkwa nkwụ n’akụkụ abụọ nke ihe a rụnyere n’ụzọ e si abata n’ụlọ ahụ nakwa n’ọnụ ụlọ ndị dị n’akụkụ ụlọ nsọ ahụ nakwa n’ihe e ji kụchie ihu ha.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “kpọta m n’ụlọ nsọ.” N’isi 41 na 42, okwu a nwere ike ịbụ mpụta ebe nsọ ma ọ bụ ebe nsọ niile (ụlọ nsọ, ma Ebe Nsọ ma Ebe Kacha Nsọ).
^ Ya bụ, n’ọnụ ụlọ dị n’ime ime ụlọ nsọ, ma ọ bụ Ebe Kacha Nsọ.
^ Na Hibru, “Obosara ọnụ ụzọ ahụ.”
^ O nwere ike ịbụ ụzọ dị warara dị gburugburu ụlọ nsọ ahụ.
^ Ya bụ, ụlọ dị n’ebe ọdịda anyanwụ ụlọ nsọ.
^ O nwere ike ịbụ ụzọ e si abanye n’Ebe Nsọ.
^ O nwere ike ịbụ Ebe Kacha Nsọ.
^ Na Hibru, “ogologo.”