Ezikiel 40:1-49
40 N’afọ nke iri abụọ na ise a dọọrọ anyị n’agha,+ ná mbido afọ ahụ, n’abalị iri n’ọnwa, n’afọ nke iri na anọ e bibiri obodo anyị,+ n’ụbọchị ahụ, Jehova nọnyeere m, kpọgakwa m ebe ọzọ.+
2 N’ọhụụ, Chineke kpọtara m n’ala Izrel kpọsa m n’elu otu ugwu dị nnọọ elu,+ ebe e nwere ihe yiri obodo n’ebe ndịda ya.
3 Mgbe ọ kpọtara m ebe ahụ, m hụrụ otu nwoke yiri ọla kọpa.+ O ji ụdọ ogho n’aka, jirikwa okporo ahịhịa amị e ji atụ̀ ihe.*+ O guzokwa n’ọnụ ụzọ ámá.
4 Nwoke ahụ gwara m, sị: “Nwa nke mmadụ, anya ruo gị ala, geekwa ntị nke ọma, obi gị dịrịkwa n’ihe niile m ga-egosi gị, n’ihi na m kpọtara gị ebe a ka m gosi gị ihe ndị a. Gwa ndị Izrel ihe niile ị ga-ahụ.”+
5 Ahụrụ m mgbidi gbara ụlọ nsọ* ahụ gburugburu. Nwoke ahụ jikwa okporo ahịhịa amị e ji atụ̀ ihe nke dị kubit isii n’ogologo (kubit nke ọ bụla bụ otu kubit na otu uhiè ọbụ aka).* Ọ malitekwara ịtụ otú ahụ́ ụlọ ahụ hà, tụta igbidi ya otu okporo ahịhịa amị, tụtakwa ogo ya otu okporo ahịhịa amị.
6 Ọ gakwara n’ọnụ ụzọ ámá chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ,+ si na steepụ ya rịgoo. Mgbe ọ tụrụ ụzọ e si abata n’ọnụ ụzọ ámá ahụ, obosara ya dị otu okporo ahịhịa amị, obosara ụzọ nke ọzọ e si abata dịkwa otu okporo ahịhịa amị.
7 Ụlọ nke ọ bụla ndị nche na-anọ dị otu okporo ahịhịa amị n’ogologo nakwa otu okporo ahịhịa amị n’obosara. Agbata otu ụlọ nche na ibe ya dị kubit ise.+ Mgbe ọ tụrụ ụzọ e si abata n’ọnụ ụzọ ámá ahụ, nke dị n’akụkụ ihe a rụnyere n’ọnụ ụzọ ámá ahụ, nke chere ihu n’ụlọ nsọ, ọ tụtara ya otu okporo ahịhịa amị.
8 Mgbe ọ tụrụ ihe ahụ a rụnyere n’ụzọ e si abata n’ọnụ ụzọ ámá ahụ, nke chere ihu n’ebe dị n’ime ime, ọ tụtara ya otu okporo ahịhịa amị.
9 Ọ tụkwara ihe a rụnyere n’ụzọ e si abata n’ọnụ ụzọ ámá, tụta ya kubit asatọ. Ọ tụkwara ogidi ndị dị n’akụkụ ya, tụta ha kubit abụọ. Ihe ahụ a rụnyere n’akụkụ ụzọ e si abata n’ọnụ ụzọ ámá ahụ chere ihu n’ụlọ nsọ.
10 Ụlọ ndị nche ndị dị n’ọnụ ụzọ ámá, n’ebe ọwụwa anyanwụ, dị atọ n’otu akụkụ, dịrịkwa atọ n’akụkụ nke ọzọ. Ha atọ enweghị nke ka ibe ya. Ogidi ndị dị n’akụkụ ha enweghịkwa nke ka ibe ya.
11 Ọ tụkwara obosara ebe e si abanye n’ọnụ ụzọ ámá ahụ, tụta ya kubit iri. Ọnụ ụzọ ámá ahụ dịkwa kubit iri na atọ n’ogologo.
12 Akụkụ abụọ nke ọ bụla n’ebe a gbara ogige n’ihu ụlọ ndị nche dị otu kubit. Ụlọ ndị nche ahụ dịkwa kubit isii n’otu akụkụ nakwa kubit isii n’akụkụ nke ọzọ.
13 Ọ tụkwara obosara ọnụ ụzọ ámá ahụ malite n’elu ụlọ nke otu ụlọ ndị nche* ruo n’elu nke ọzọ, tụta ya kubit iri abụọ na ise. Ọnụ ụzọ e si abanye n’otu chere ọnụ ụzọ nke ọzọ ihu.+
14 Ọ tụkwara ogologo ogidi ndị dị n’akụkụ ogige ọnụ ụzọ ámá ndị ahụ gbaa gburugburu, tụta ha kubit iri isii.
15 Malite n’ihu ọnụ ụzọ ámá e si abanye ya ruo n’ihu ihe a rụnyere n’ụzọ e si abata n’ọnụ ụzọ ámá nke dị n’ime ime dị kubit iri ise.
16 E nwekwara windo ndị dị warara ná mpụta karịa otú ha dị n’ime+ n’ụlọ ndị nche ahụ nakwa n’ogidi ha ndị dị n’akụkụ nke ọ bụla n’ọnụ ụzọ ámá ahụ. Windo dịkwa n’akụkụ nke ọ bụla n’ihe ahụ a rụnyere n’ụzọ e si abata. E sekwara nkwụ+ n’ogidi ndị ahụ dị n’akụkụ.
17 Ọ kpọbataziri m n’ogige dị ná mpụta, mụ ahụ ọnụ ụlọ ndị a na-anọ eri ihe*+ nakwa pevment a rụrụ gburugburu ogige ahụ. N’elu pevment a, a rụrụ ọnụ ụlọ iri atọ a na-anọ eri ihe.
18 Pevment nke dị n’akụkụ ọnụ ụzọ ámá ahụ hà nnọọ ka ọnụ ụzọ ámá ndị ahụ n’ogologo. Pevment nke a dị ala karịa nke dị n’ogige ahụ.
19 Ọ tụkwara malite n’ihu ọnụ ụzọ ámá ndịda ruo n’ihu ogige nke dị n’ime. Obosara ya dị otu narị (100) kubit n’ebe ọwụwa anyanwụ nakwa n’ebe ugwu.
20 Ogige nke dị ná mpụta nwere otu ọnụ ụzọ ámá nke chere ihu n’ebe ugwu. Ọ tụrụ ma ogologo ya ma obosara ya.
21 Ụlọ ndị nche dị na ya dị atọ n’otu akụkụ, dịkwa atọ n’akụkụ nke ọzọ. Ogidi ndị dị n’akụkụ ya nakwa ihe a rụnyere n’ụzọ e si abata ya hà ka ọnụ ụzọ ámá mbụ ahụ. Ogologo ya dị kubit iri ise, obosara ya adịrị kubit iri abụọ na ise.
22 Windo ya niile na ihe a rụnyere n’ụzọ e si abata ya nakwa nkwụ ndị e sere na ya+ hà ka ndị ahụ dị n’ọnụ ụzọ ámá nke chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ndị mmadụ na-esi na steepụ nwere nzọụkwụ asaa arịgo na ya. Ihe a rụnyere n’ụzọ e si abata ya dịkwa ha n’ihu.
23 E nwere ọnụ ụzọ ámá dị n’ogige dị n’ime nke chere ihu n’ọnụ ụzọ ámá dị n’ebe ugwu, nweekwa nke chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ. Mgbe ọ tụrụ malite n’otu ọnụ ụzọ ámá ruo n’ọnụ ụzọ ámá ọzọ, ọ tụtara ya otu narị (100) kubit.
24 Ọ kpọtakwara m n’ebe ndịda, mụ ahụ otu ọnụ ụzọ ámá n’ebe ndịda.+ Ọ tụrụ ogidi ndị dị n’akụkụ ya nakwa ihe a rụnyere n’ụzọ e si abata ya, ya abụrụ na ha na ndị nke ọzọ hà.
25 Ya na ihe a rụnyere n’ụzọ e si abata ya nwere windo dị ka windo ndị ọzọ n’akụkụ ya niile. Ogologo ya dị kubit iri ise, obosara ya adịrị kubit iri abụọ na ise.
26 Ebe e si arịgo ya nwere steepụ dị nzọụkwụ asaa.+ Ihe a rụnyere n’ụzọ e si abata ya dịkwa n’ihu ha. E sekwara nkwụ n’ogidi ndị dị ya n’akụkụ, otu dị n’otu akụkụ, ọzọ adịrị n’akụkụ nke ọzọ.
27 Ogige nke dị n’ime nwere otu ọnụ ụzọ ámá chere ebe ndịda ihu. Ọ tụkwara malite n’otu ọnụ ụzọ ámá ruo n’ọnụ ụzọ ámá ọzọ n’ebe ndịda, tụta ya otu narị (100) kubit.
28 O sikwa n’ọnụ ụzọ ámá dị n’ebe ndịda kpọbata m n’ogige dị n’ime. Ọ tụkwara ọnụ ụzọ ámá dị n’ebe ndịda, ya abụrụ na ya na ndị nke ọzọ hà.
29 Ụlọ ndị nche ndị dị na ya, ogidi ndị dị ya n’akụkụ, nakwa ihe a rụnyere n’ụzọ e si abata ya hà ka ndị nke ọzọ. E nwere windo n’akụkụ nke ọ bụla n’ihe ahụ a rụnyere n’ụzọ e si abata ya. Ogologo ya dị kubit iri ise, obosara ya adịrị kubit iri abụọ na ise.+
30 A rụnyere ihe gburugburu ụzọ e si abata ya. Ogologo ya dị kubit iri abụọ na ise, obosara ya adịrị kubit ise.
31 Ihe a rụnyere n’ụzọ e si abata ya chere ihu n’ogige dị ná mpụta. E sekwara nkwụ n’ogidi ndị dị n’akụkụ ya.+ A na-esi na steepụ nwere nzọụkwụ asatọ arịgo ya.+
32 Mgbe o si n’ebe ọwụwa anyanwụ kpọbata m n’ogige dị n’ime, ọ tụrụ ọnụ ụzọ ámá ahụ, ya abụrụ na ya na ndị nke ọzọ hà.
33 Ụlọ ndị nche ndị dị na ya, ogidi ndị dị n’akụkụ ya, na ihe a rụnyere n’ụzọ e si abata ya hà ka ndị nke ọzọ. Ya na ihe a rụnyere n’ụzọ e si abata ya nwere windo n’akụkụ ha nke ọ bụla. Ogologo ya dị kubit iri ise, obosara ya adịrị kubit iri abụọ na ise.
34 Ihe a rụnyere n’ụzọ e si abata ya chere ihu n’ogige dị ná mpụta. E sekwara nkwụ n’ogidi ndị dị n’akụkụ ya abụọ. A na-esi na steepụ nwere nzọụkwụ asatọ arịgo ya.
35 Ọ kpọbataziri m n’ọnụ ụzọ ámá nke dị n’ebe ugwu,+ ma tụọ ya, ya abụrụ na ya na ndị nke ọzọ hà.
36 Ụlọ ndị nche ndị dị na ya, ogidi ndị dị n’akụkụ ya, na ihe a rụnyere n’ụzọ e si abata ya hà ka ndị nke ọzọ. Windo dị n’akụkụ ya nke ọ bụla. Ogologo ya dị kubit iri ise, obosara ya adịrị kubit iri abụọ na ise.
37 Ogidi ndị dị n’akụkụ ya chere ihu n’ogige dị ná mpụta. E sekwara nkwụ n’ogidi ndị ahụ dị n’akụkụ ya abụọ. A na-esi na steepụ nwere nzọụkwụ asatọ arịgo ya.
38 Ụlọ a na-anọ eri ihe na ọnụ ụzọ ya dị nso n’ogidi ndị dị n’akụkụ ọnụ ụzọ ámá ya. Ọ bụ n’ebe ahụ ka a na-asa ihe e ji chụọ àjà a na-esucha ọkụ.+
39 N’akụkụ ihe ahụ a rụnyere n’ụzọ e si abata n’ọnụ ụzọ ámá, e nwere tebụl abụọ n’otu akụkụ nakwa tebụl abụọ n’akụkụ nke ọzọ. N’elu ha ka a na-egbu anụ e ji achụ àjà a na-esucha ọkụ,+ àjà mmehie,+ na àjà ikpe ọmụma.+
40 Tebụl abụọ dị n’ebe mpụta ya ma a gawa ebe e si abanye n’ọnụ ụzọ ámá nke dị n’ebe ugwu. Tebụl abụọ dịkwa n’akụkụ nke ọzọ nke ebe a rụnyere ihe n’ụzọ e si abata n’ọnụ ụzọ ámá ahụ.
41 Tebụl anọ dị n’otu akụkụ ọnụ ụzọ ámá ahụ, tebụl anọ ọzọ adịrịkwa n’akụkụ ya nke ọzọ. Ha niile dị tebụl asatọ. N’elu ha ka a na-egbu anụ ndị e ji achụ àjà.
42 E ji nkume a wara awa rụọ tebụl anọ ahụ a na-anọ n’elu ha egbu anụ e ji achụ àjà a na-esucha ọkụ. Ha dị otu kubit na ọkara n’ogologo, otu kubit na ọkara n’obosara, dịkwa otu kubit n’ogo. E dosachara ihe ndị e ji egbu anụ e ji achụ àjà a na-esucha ọkụ na àjà ndị ọzọ n’elu ha.
43 A kụnyere ihe ndị a na-adọkwasị ihe n’ahụ́ ụlọ ndị dị n’ime gbaa gburugburu. Obosara ha hà ka uhiè ọbụ aka. N’elu tebụl ndị ahụ ka a na-ebusa anụ ndị e ji nye onyinye.
44 Ọnụ ụlọ dị iche iche ndị na-abụ abụ na-anọ eri ihe dị ná mpụga ọnụ ụzọ ámá nke dị n’ime.+ Ha dị n’ogige dị n’ime, nke dị nso n’ọnụ ụzọ ámá dị n’ebe ugwu. Ha chere ihu n’ebe ndịda. Ọnụ ụlọ ọzọ a na-anọ eri nri dị nso n’ọnụ ụzọ ámá dị n’ebe ọwụwa anyanwụ. O chere ihu n’ebe ugwu.
45 Ọ gwara m, sị: “Ọnụ ụlọ a na-anọ eri ihe, nke chere ihu n’ebe ndịda, bụ maka ndị nchụàjà na-arụ ọrụ a na-arụ n’ụlọ nsọ.+
46 Ọnụ ụlọ a na-anọ eri ihe, nke chere ihu n’ebe ugwu, bụ maka ndị nchụàjà na-arụ ọrụ a na-arụ n’ebe ịchụàjà.+ Ha bụ ụmụ Zedọk,+ ndị si n’agbụrụ Livaị, ndị ọrụ ha bụ ijere Jehova ozi.”+
47 Ọ tụkwara ogige dị n’ime. Ogologo ya dị otu narị (100) kubit, obosara ya adịrị otu narị (100) kubit, akụkụ anọ ya hakwa otu. Ebe ịchụàjà dịkwa n’ihu ụlọ nsọ ahụ.
48 Ọ kpọbataziri m n’ime ihe ahụ a rụnyere n’ụzọ e si abata n’ụlọ nsọ.+ Ọ tụkwara ogidi dị n’akụkụ ihe ahụ, tụta ya kubit ise n’otu akụkụ nakwa kubit ise n’akụkụ nke ọzọ. Obosara ọnụ ụzọ ámá ahụ dị kubit atọ n’otu akụkụ nakwa kubit atọ n’akụkụ nke ọzọ.
49 Ogologo ihe ahụ a rụnyere n’ụzọ e si abata n’ụlọ nsọ ahụ dị kubit iri abụọ, obosara ya adịrị kubit iri na otu.* Ndị mmadụ na-esikwa na steepụ arịgo na ya. E nwekwara ogidi ndị dị n’akụkụ idé ndị dị n’akụkụ ya. Otu dị n’akụkụ nke ọ bụla.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “ụlọ.” N’isi nke 40-48, e dere “ụlọ nsọ” mgbe “ụlọ” a na-ekwu gbasara ya bụ ogige ụlọ nsọ ma ọ bụ ụlọ nsọ n’onwe ya.
^ O nwere ike ịbụ elu mgbidi ụlọ ndị nche.
^ Ma ọ bụ “mụ ahụ ọnụ ụlọ dị iche iche.”
^ O nwere ike ịbụ, “iri na abụọ.”