Ezikiel 38:1-23
38 Jehova gwara m okwu ọzọ, sị:
2 “Nwa nke mmadụ, chee Gọg bụ́ onye Megọg ihu,+ buokwa amụma ihe a ga-eme ya.+ Ọ bụ onyeisi Mishek na Tubal.+
3 Sị ya, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Gọg, onyeisi Mishek na Tubal, m ga-eme gị ihe.
4 M ga-eme ka ị tụgharịa. M ga-etinyekwa nko n’agba gị+ ma dọrọ gị na ndị agha gị niile,+ ya bụ, ma ịnyịnya gị niile ma ndị na-agba ha. Ha niile yi uwe mara mma, jiri ọta ukwu na ọta nta. Ha karịkwara akarị. Ha niile ji mma agha akpa ike.
5 Ndị Peshia, ndị Etiopia, na ndị Pọt+ sokwa ha. Ha niile jicha ọta, kpurukwa okpu agha.
6 Ndị ọzọ so ha bụ Goma na ndị agha ya niile, nakwa ndị si n’ezinụlọ Togama,+ ndị bi n’ime ime ebe ugwu, ha na ndị agha ha niile. Ndị so gịnwa bụ́ Gọg dị ọtụtụ.+
7 “‘“Jikere, kwadebekwa, gị na ndị agha gị niile, ndị gbakọrọ ebe ị nọ. Ị ga-abụkwa onyeisi* ha.
8 “‘“Ọtụtụ afọ gachaa, m ga-elebara gị anya. N’oge ikpeazụ, mgbe afọ ndị ahụ gachara, ị ga-eji ike banye n’obodo a napụtara ndị bi na ya n’aka ndị ji mma agha bịa igbu ha. E si ebe dị iche iche kpọkọta ha n’ugwu ndị dị n’Izrel, nke tọgbọ nkịtị kemgbe. E si ebe dị iche iche kpọlata ndị bi n’ala a. Obi rukwara ha niile ala n’ebe ha bi.+
9 Ị ga-abịa ka oké ifufe lụso ha agha. Ị ga-ekpuchikwa ala a ka ígwé ojii, gị na ndị agha gị niile na ọtụtụ ndị so gị.”’
10 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘N’ụbọchị ahụ, ọtụtụ ihe ga-abata gị n’obi. Ị ga-akpakwa nkata ọjọọ.
11 Ị ga-asịkwa: “M ga-aga lụso obodo a na-enweghị mgbidi agha.+ E nweghị onye na-enye ha nsogbu. Obi rukwara ha ala. Ma, m ga-aga mee ha ihe. Ha niile bi ebe na-enweghị mgbidi, ibo ụzọ, na ihe e ji atụchi ụzọ.”
12 Ị ga-aga ebe ahụ ka ị kwakọrọ ọtụtụ ihe, bukọrọkwa nnukwu ihe. Ị ga-aga ịlụso ndị bizi ebe tọgbọbu nkịtị agha.+ Ndị a bụ ndị e si ná mba dị iche iche kpọlata.+ Ha na-akpata akụ̀, nweekwa ọtụtụ ngwongwo.+ Ha bikwa n’etiti ụwa.
13 “‘Shiba+ na Didan,+ ndị ahịa Tashish+ na ndị agha* ya niile ga-asị gị: “Ị̀ bịara ịkwakọrọ ọtụtụ ihe na ibukọrọ nnukwu ihe? Ị̀ kpọkọtara ndị agha gị ka unu bịa bukọrọ ọtụtụ ihe anyị nwere, ma ọlaọcha ma ọlaedo, ma akụ̀ anyị ma ngwongwo anyị?”’
14 “N’ihi ya, nwa nke mmadụ, buo amụma, gwa Gọg, sị, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “N’ụbọchị ahụ, ị ga-ama n’eziokwu na obi ruru ndị Izrel bụ́ ndị m ala n’ebe ha bi.+
15 Ị ga-esi n’ala gị bịa, ya bụ, n’ime ime ebe ugwu,+ gị na ọtụtụ ndị so gị. Ha niile na-agba ịnyịnya. Ha bụ ìgwè mmadụ, imirikitiimi ndị agha.+
16 Ị ga-abịa ikpuchi ala ndị Izrel bụ́ ndị m ka ígwé ojii ma lụso ha agha. N’oge ikpeazụ, m ga-eme ka ị bịa lụso obodo m agha,+ ka mba niile mara m mgbe m ga-eji ihe m mere gịnwa, bụ́ Gọg, mee ka ha mara na m dị nsọ.”’+
17 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘Ọ̀ kwa gị ka m kwuru gbasara ya n’oge gara aga na ị ga-abịa lụso ha agha? Ndị m si n’ọnụ ha kwuo ihe a bụ ndị ohu m bụ́ ndị amụma Izrel, ndị buru amụma ọtụtụ afọ.’
18 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị, ‘N’ụbọchị ahụ, n’ụbọchị Gọg ga-eji ike bata n’ala Izrel, m ga-ewe ezigbo iwe.+
19 M ga-eji ịnụ ọkụ n’obi, jirikwa iwe na ọnụma, kwuo okwu. N’ụbọchị ahụ, oké ala ọma jijiji ga-eme n’ala Izrel.
20 M ga-eme ka azụ̀, nnụnụ, anụ ọhịa, ihe niile na-arị arị, na mmadụ niile nọ n’ụwa maa jijiji. A ga-akwada ugwu niile.+ Nkume niile dị elu ga-ada. Mgbidi niile ga-adarukwa ala.’
21 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘M ga-eme ka e jiri mma agha mee Gọg ihe n’ugwu m niile. Ndị agha ya ga-ejikwa mma agha na-egburịta ibe ha.+
22 M ga-ekpe ya ikpe. M ga-eme ka ya na ndị agha ya rịawa ọrịa na-efe efe.+ Ndị mmadụ ga-anwụkwa. M ga-emekwa ka nnukwu mmiri, akụ́ mmiri ígwé,+ ọkụ,+ na sọlfọ+ zokwasị ya na ndị agha ya na ọtụtụ ndị so ya.+
23 M ga-eme onwe m ka m dị ebube, mee ka a mara na m dị nsọ, meekwa ka ọtụtụ mba mara m. Ha ga-amarakwa na m bụ Jehova.’