Ezikiel 37:1-28

  • Ọhụụ gbasara ndagwurugwu ọkpụkpụ kpọrọ nkụ juru (1-14)

  • A ga-ejikọta osisi abụọ ka ha bụrụ otu (15-28)

    • Otu mba nke otu eze ga na-achị (22)

    • Ọgbụgba ndụ udo nke ga-adịru mgbe ebighị ebi (26)

37  Jehova nyere m ike. Jehova jikwa mmụọ ya kpọrọ m kpọsa n’etiti ndagwurugwu+ ọkpụkpụ juru.  O mere ka m gagharịa gburugburu ha. M hụkwara na ha dị nnọọ ọtụtụ na ndagwurugwu ahụ, nakwa na ha kpọrọ ezigbo nkụ.+  Chineke jụkwara m, sị: “Nwa nke mmadụ, ọkpụkpụ ndị a hà ga-adịli ndụ ọzọ?” Mụ asị: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, ọ bụ gịnwa ma.”+  Ọ gwaziri m, sị: “Buo amụma banyere ọkpụkpụ ndị a. Sị ha, ‘Ọkpụkpụ kpọrọ nkụ, nụrụnụ ihe Jehova kwuru:  “‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova gwara ọkpụkpụ ndị a, sị: “M ga-eme ka ume ndụ baa n’ime unu. Unu ga-adịkwa ndụ ọzọ.+  M ga-eme ka unu nwee akwara, meekwa ka unu nwee anụ ahụ́. M ga-eji akpụkpọ ahụ́ kpuchie unu, meekwa ka ume ndụ baa n’ime unu. Unu ga-adịkwa ndụ ọzọ. Unu ga-amarakwa na m bụ Jehova.”’”  M buziri amụma otú a gwara m mee. Ozugbo m buchara amụma, m nụwara mkpọtụ ọkpụkpụ ndị na-akụkọta n’ibe ha. Ọkpụkpụ ndị ahụ bidoro ijikọta onwe ha ọnụ, otu ọkpụkpụ na ọkpụkpụ ibe ya.  M hụkwara ka akwara na anụ ahụ́ na-ekpuchi ha, akpụkpọ ahụ́ kpuchikwara ha. Ma, ume ndụ adịbeghị n’ime ha.  Chineke gwaziri m, sị: “Buo amụma ihe ifufe ga-eme. Nwa nke mmadụ, buo amụma, sị ifufe, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: “Ifufe,* si n’akụkụ anọ nke ụwa* bịa fee n’elu ndị a e gburu egbu ka ha dị ndụ ọzọ.”’” 10  M buru amụma otú a gwara m. Ume ndụ banyekwara n’ime ha, ha adịrị ndụ, jirikwa ụkwụ ha guzoro,+ bụrụ ndị agha hiri ezigbo nne. 11  Chineke gwaziri m, sị: “Nwa nke mmadụ, ọkpụkpụ ndị a bụ ndị Izrel niile.+ Ha na-asị, ‘Ọkpụkpụ anyị akpọọla nkụ. Anyị enweghịzi olileanya.+ E bibiela anyị kpamkpam.’ 12  N’ihi ya, buo amụma, sịkwa ha, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Ndị m, m ga-emeghe ili unu,+ si n’ime ya kpọpụta unu, kpọbatakwa unu n’ala Izrel.+ 13  Ununwa bụ́ ndị m ga-amarakwa na m bụ Jehova mgbe m meghere ili unu, sikwa n’ime ya kpọpụta unu.”’+ 14  ‘M ga-enye unu mmụọ nsọ m. Unu ga-adịkwa ndụ ọzọ.+ M ga-emekwa ka unu biri n’ala unu. Unu ga-amarakwa na ọ bụ mụnwa, bụ́ Jehova, kwuru ihe a, meekwa ya.’ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.” 15  Jehova gwara m okwu ọzọ, sị: 16  “Nwa nke mmadụ, were otu osisi, deekwa ihe a n’elu ya: ‘Nke a bụ nke Juda na ndị Izrel ha na ya nọ.’*+ Werekwa osisi ọzọ dee ihe a n’elu ya: ‘Osisi nke Josef, nke na-anọchi anya Ifrem, na ndị Izrel niile ha na ya nọ.’*+ 17  Jikọtazie ha abụọ ka ha bụrụ otu osisi n’aka gị.+ 18  Ọ bụrụ na ndị obodo gị* asị gị, ‘Ọ̀ bụ na ị gaghị agwa anyị ihe ihe ndị a pụtara?’ 19  sị ha, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “M ga-ewere osisi Josef, nke dị n’aka Ifrem, na ebo Izrel niile ha na ya nọ. M ga-ejikọta ya na osisi Juda. M ga-emekwa ka ha bụrụ otu osisi.+ Ha ga-abụkwa otu n’aka m.”’ 20  Ị ga-ejide osisi ndị ahụ i dere ihe n’elu ha n’aka gị ka ha hụ ya. 21  “Gwazie ha, sị, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: “M ga-esi ná mba dị iche iche ndị Izrel gara kpọpụta ha. M ga-esikwa ebe niile ha nọ kpọkọta ha ma kpọlata ha n’ala ha.+ 22  M ga-eme ka ha bụrụ otu mba n’ala a+ nakwa n’ugwu ndị dị n’Izrel. Otu eze ga na-achị ha niile.+ Ha agaghịzi abụ mba abụọ. A gaghịkwa ekewa ha ọzọ ka ha bụrụ alaeze abụọ.+ 23  Ha agaghịzi eji arụsị ha dị iche iche na-asọ oyi* na arụ ndị ha na-akpa nakwa mmehie ha niile merụọ onwe ha.+ M ga-enyere ha aka ka ha kwụsị mmehie niile ha nọ na-eme mgbe ha kwụsịrị irubere m isi. M ga-emekwa ka ha dị ọcha. Ha ga-abụ ndị m, mụnwa ga-abụkwa Chineke ha.+ 24  “‘“Devid bụ́ ohu m ga-abụ eze ha.+ Ha niile ga-enwe otu onye ga na-azụ ha ka atụrụ.+ Ha ga na-eme ihe m kpebiri ka ha na-eme, leziekwa anya na-edebe iwu m.+ 25  Ha ga-ebikwa n’ala m nyere Jekọb, bụ́ ohu m, ebe nna nna unu hà biri.+ Ha na ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha+ ga-ebikwa na ya ruo mgbe ebighị ebi.+ Devid bụ́ ohu m ga-abụkwa onyeisi ha ruo mgbe ebighị ebi.+ 26  “‘“Mụ na ha ga-agba ọgbụgba ndụ udo.+ Ọ ga-abụ ọgbụgba ndụ ga-adịru mgbe ebighị ebi. M ga-enyekwa ha ala ha, mee ka ha mụbaa,+ hụkwa na ụlọ nsọ m dị ebe ha nọ ruo mgbe ebighị ebi. 27  Ụlọikwuu m* ga-adị ebe ha nọ.* M ga-abụ Chineke ha, hanwa ga-abụkwa ndị m.+ 28  Mba niile ga-amarakwa na mụnwa, bụ́ Jehova, na-edo Izrel nsọ mgbe ụlọ nsọ m ga-adị ebe ha nọ ruo mgbe ebighị ebi.”’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Ume ndụ.”
Na Hibru, “si n’ifufe anọ.”
Ma ọ bụ “ha na ya dị ná mma.”
Ma ọ bụ “ha na ya dị ná mma.”
Na Hibru, “ụmụ ndị gị.”
Ọ ga-abụ na ihe a kpọrọ arụsị ndị ahụ n’asụsụ Hibru bụ nwanne okwu Hibru ọzọ nke pụtara “nsị.” E ji ya egosi na ihe na-asọ oyi.
Ma ọ bụ “Ebe m bi; Ụlọ m.”
Ma ọ bụ “ga-ekpuchi ha.”