Ezikiel 35:1-15
-
Ihe e buru n’amụma na a ga-eme Sia bụ́ ugwu ugwu (1-15)
35 Jehova gwara m okwu ọzọ, sị:
2 “Nwa nke mmadụ, chee ihu n’ala Sia bụ́ ugwu ugwu,+ buokwa amụma ihe a ga-eme ya.+
3 Sị ya, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Ala Sia bụ́ ugwu ugwu, m ga-eme gị ihe. M ga-eweli aka m mee gị ihe, meekwa ka ị tọgbọrọ nnọọ chakoo.+
4 M ga-eme ka a laa obodo ndị dị n’ime gị n’iyi. Ị ga-atọgbọrọkwa nkịtị.+ Ị ga-amarakwa na m bụ Jehova.
5 N’ihi na ị nọ na-ewesa ndị Izrel iwe n’akwụsịghị akwụsị.+ I nyefekwara ha n’aka ndị ga-eji mma agha gbuo ha n’oge a na-ata ha ahụhụ ikpeazụ.”’+
6 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘N’ihi ya, ebe ọ bụ na m na-adị ndụ, m ga-eme ka e gbuo gị,* o nweghịkwa ihe ga-eme ka ị ghara ịnwụ.+ Ebe ị chọrọ ka e gbuo ndị ị kpọrọ asị, a ga-egbukwa gịnwa.+
7 M ga-eme ka ala Sia bụ́ ugwu ugwu tọgbọrọ nkịtị.+ M ga-egbu onye ọ bụla na-agafe na ya ma ọ bụ onye ọ bụla na-alaghachi na ya.
8 M ga-eme ka ndị gị e gburu egbu jupụta n’ugwu ukwu gị niile. Ndị e ji mma agha gbuo ga-adakwa ma n’ugwu nta gị niile ma na ndagwurugwu gị niile ma n’iyi gị niile.
9 M ga-eme ka ị tọgbọrọ nkịtị ruo mgbe ebighị ebi. E nweghịkwa onye ga-ebi n’obodo ndị dị n’ala gị.+ Unu ga-amarakwa na m bụ Jehova.’”
10 “Ebe ọ bụ na ị sịrị, ‘Mba abụọ a na ala abụọ a ga-abụ nke m, anyị ga-ebichi ha,’+ n’agbanyeghị na Jehova nọnyeere ha,
11 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘N’ihi ya, ebe ọ bụ na m na-adị ndụ, m ga-eji iwe na ọnụma mee gị ihe otú ahụ i mere ndị m n’ihi asị ị kpọrọ ha.+ M ga-emekwa ka ha mara m mgbe m kpere gị ikpe.
12 Ihe a m ga-eme gị ga-eme ka ị mara na mụnwa, bụ́ Jehova, nụrụ okwu ọjọọ niile i kwuru banyere ugwu ndị dị n’Izrel. Ị sịrị: “E meela ka ha tọgbọrọ nkịtị. Ọ dịziiri anyị mfe ugbu a ibibi ha.”*
13 Unu kwuru okwu ọjọọ gbasara m ka unu na-etu ọnụ. Unu kwuru ọtụtụ okwu ọjọọ gbasara m.+ M nụkwara ha niile.’
14 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘Ụwa niile ga-aṅụrị ọṅụ mgbe m ga-eme ka ị tọgbọrọ nkịtị.
15 Ala Sia bụ́ ugwu ugwu, ya bụ, Ịdọm niile,+ m ga-eme ka ị tọgbọrọ nkịtị otú e mere ka ala ndị Izrel tọgbọrọ nkịtị, ebe ọ bụ na ị chịrị ya ọchị.+ Ị ga-atọgbọrọ chakoo. Ha ga-amarakwa na m bụ Jehova.’”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “ka a wụfuo ọbara gị.”
^ Ma ọ bụ “Ha dịzi ka anụ oriri n’aka anyị.”