Ezikiel 32:1-32
32 N’abalị mbụ, n’ọnwa iri na abụọ, n’afọ nke iri na abụọ,* Jehova gwara m okwu ọzọ, sị:
2 “Nwa nke mmadụ, bụọ abụ iru uju banyere Fero eze Ijipt. Sị ya,‘Mba dị iche iche weere gị ka ọdụm siri ike.
Ma, e gbuola gị.
Ị dịbu ka nnukwu anụ mmiri nọ n’oké osimiri,+ na-eti ụkwụ gị na aka gị n’osimiri gị.
I jikwa ụkwụ gị na-agbarụ mmiri ma na-emebi osimiri.’*
3 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị:
‘M ga-eme ka ọtụtụ mba jiri ụgbụ m kpuchie gị.
Ha ga-ejikwa ụgbụ m dọta gị.
4 M ga-ahapụ gị n’elu ala.
M ga-atụda gị n’ala.
Nnụnụ niile ga-ebi n’elu gị.
M ga-emekwa ka anụ ọhịa niile dị n’ụwa rie gị rijuo afọ.+
5 M ga-atụsa gị n’elu ugwu,Meekwa ka anụ gị ju na ndagwurugwu dị iche iche.+
6 M ga-emekwa ka ala ṅụọ ọbara ga-agbapụta gị n’ahụ́ n’elu ugwu.
Ọbara gị ga-ejukwa n’iyi dị iche iche.’*
7 ‘Mgbe a ga-emenyụ gị ka ọkụ, m ga-ekpuchi eluigwe, meekwa ka kpakpando ndị dị na ya gbaa ọchịchịrị.
M ga-eji ígwé ojii kpuchie anyanwụ.
Ọnwa agaghịkwa na-enye ìhè.+
8 M ga-eme ka ihe niile na-enye ìhè n’eluigwe gbaa ọchịchịrị n’ihi gị.
M ga-emekwa ka ọchịchịrị gbaa n’ala gị.’ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.
9 ‘M ga-eme ka iwe ju ọtụtụ ndị obi mgbe m ga-eme ka e si n’ime gị dọrọ ndị mmadụ n’agha laa ná mba dị iche iche,N’ala dị iche iche ị na-amaghị.+
10 N’ụbọchị ị ga-ada,M ga-eme ka egwu jide ọtụtụ ndị.
Ndị eze ha ga na-ama jijiji, na-atụ egwu n’ihi gị mgbe m ga-efegharị mma agha m n’ihu ha.
Ha ga na-ama jijiji mgbe niile, onye ọ bụla n’ime ha ga na-atụ ụjọ ọnwụ.’
11 N’ihi na Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị:
‘Eze Babịlọn ga-eji mma agha ya bịa mesie gị ike.+
12 M ga-eme ka ndị bụ́ dike n’agha, ndị obi kacha fee azụ ná mba dị iche iche,+Jiri mma agha gbuo ndị agha gị niile.
Ha ga-ala ihe Ijipt ji anya isi n’iyi, bibiekwa mmadụ niile nọ n’ime ya.+
13 M ga-ebibi anụ ụlọ ya niile nọ n’akụkụ nnukwu mmiri dị iche iche.+
Ụkwụ mmadụ ma ọ bụ ụkwụ anụ ụlọ agaghịkwa agbarụ mmiri ndị ahụ ọzọ.’+
14 ‘N’oge ahụ, m ga-eme ka mmiri ha dị ọcha,M ga-emekwa ka osimiri ha na-asọ ka mmanụ.’ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.
15 ‘Ha ga-amara na m bụ Jehova+Mgbe m ga-eme ka ala Ijipt tọgbọrọ nkịtị, bibie ihe niile dị na ya,+Gbuokwa ndị niile bi na ya.
16 Ihe a bụ abụ iru uju. Ndị mmadụ ga-abụkwa ya.
Ụmụ nwaanyị mba dị iche iche ga-abụ ya.
Ha ga-abụrụ ya Ijipt na ndị ya niile.’ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.”
17 N’abalị iri na ise n’ọnwa,* n’afọ nke iri na abụọ, Jehova gwara m okwu, sị:
18 “Nwa nke mmadụ, beere ndị Ijipt ákwá arịrị, kwuokwa na a ga-eme ka ha banye n’ime ala, ha na ndị si ná nnukwu mba dị iche iche, nakwa ndị na-abanye n’olulu.*
19 “‘Ònye ka ị ka maa mma? Banye n’ime ala, ka gị na ndị a na-ebighị úgwù dinara.’
20 “‘Ha ga-ada ebe ndị e ji mma agha gbuo dara.+ E nyefeela ya* n’aka mma agha. Kpụrụnụ ya na ndị agha ya niile pụọ.
21 “‘Ndị agha kacha bụrụ dike n’agha ga-esi n’ime ime ili* gwa ya na ndị na-enyere ya aka okwu. Ndị Ijipt ga-abanye n’ime ala, dinara ebe ahụ ka ndị e menyere ihere,* ndị e ji mma agha gbuo.
22 N’ebe ahụ ka Asiria na ndị ya niile nọ. Ili ha gbara ya* gburugburu. E ji mma agha gbuo ha niile.+
23 Ili ndị mmadụ nọ n’obodo ya dị n’ime ime olulu.* Ozu ndị ya niile tọgbọkwa gburugburu ili ya. E ji mma agha gbuo ha niile, n’ihi na mgbe ha dị ndụ, ha mere ka ndị mmadụ na-atụ ụjọ.
24 “‘Ozu ndị obodo Ịlam niile tọgbọ gburugburu ili Ịlam.+ E ji mma agha gbuo ha niile. Ha banyere n’ime ala, bụrụ ndị e menyere ihere.* Mgbe ha dị ndụ, ha mere ka ndị mmadụ na-atụ egwu. Ihere ga-eme ha na ndị na-abanye n’olulu.*
25 Ha busaara ya àkwà* n’ebe ndị e gburu egbu nọ. Ozu ndị ya niile tọgbọkwa gburugburu ili ya. Ha niile bụ ndị a na-ebighị úgwù, ndị e ji mma agha gbuo, maka na mgbe ha dị ndụ, ha na-emenye ndị mmadụ egwu. Ihere ga-eme ha na ndị na-abanye n’olulu.* E busara Ịlam ebe ndị e gburu egbu nọ.
26 “‘N’ebe ahụ ka Mishek na Tubal+ na ndị ha* niile nọ. Ili ndị mmadụ* gbara ya gburugburu. Ha niile bụ ndị a na-ebighị úgwù, ndị e ji mma agha magbuo, maka na mgbe ha dị ndụ, ha na-emenye ndị mmadụ egwu.
27 Ọ̀ bụ na ha na ndị a na-ebighị úgwù bụ́ dike n’agha, ndị ji ngwá agha ha banye n’ili,* agaghị edina otu ebe? A ga-edosa mma agha ha n’okpuru isi ha.* Mmehie ha ga-adịkwa n’ọkpụkpụ ha, n’ihi na n’oge ndị a bụ́ dike n’agha dị ndụ, ha na-emenye ndị mmadụ egwu.
28 Ma, a ga-ebibi gị* ebe ndị a na-ebighị úgwù nọ. Gị na ndị e ji mma agha gbuo ga-atọgbọkwa otu ebe.
29 “‘N’ebe ahụ ka Ịdọm+ na ndị eze ya na ndị isi ya niile nọ. N’agbanyeghị na ha dị ike, e likọtara ozu ha na ndị e ji mma agha gbuo. Ha na ndị a na-ebighị úgwù+ na ndị na-abanye n’olulu* ga-atọgbọkọ.
30 “‘N’ebe ahụ ka ndị isi niile si n’ebe ugwu nọ, ha na ndị Saịdọn niile,+ ndị ha na ndị e gburu egbu nwụkọrọ ọnwụ ihere, n’agbanyeghị na ike ha kpara mere ka ha dị egwu. Ha ga-atọgbọrọ ka ndị a na-ebighị úgwù, ha na ndị e ji mma agha gbuo. Ihere ga-emekwa ha na ndị na-abanye n’olulu.*
31 “‘Fero ga-ahụ ndị a niile. A ga-akasikwa ya obi maka ihe niile mere ndị ya.+ A ga-eji mma agha gbuo Fero na ndị agha ya niile.’ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.
32 “‘Mgbe Fero nọ ndụ, ọ na-emenye ndị mmadụ egwu. Ọ bụ ya mere ya na ndị ya niile ga-eji tọgbọrọ ebe ndị e menyere ihere* na ndị e ji mma agha gbuo tọgbọ.’ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ọ ga-abụ afọ nke iri na abụọ a dọọrọ Eze Jehoyakim, Ezikiel, na ndị Juu ndị ọzọ n’agha.
^ Na Hibru, “osimiri ha.”
^ Na Hibru, “Ihe si n’ahụ́ gị ga-ejukwa n’iyi dị iche iche.”
^ O nwere ike ịbụ n’ọnwa nke iri na abụọ. Lee anya n’amaokwu nke mbụ.
^ Ma ọ bụ “n’ili.”
^ Ya bụ, Ijipt.
^ Na Hibru, “ndị a na-ebighị úgwù.”
^ Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
^ O nwere ike ịbụ eze Asiria.
^ Ma ọ bụ “ili.”
^ Na Hibru, “ka ndị a na-ebighị úgwù.”
^ Ma ọ bụ “n’ili.”
^ Ma ọ bụ “ihe ndina.”
^ Ma ọ bụ “n’ili.”
^ Na Hibru, “Ili ya.”
^ Na Hibru, “ya.”
^ Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ọ ga-abụ na ihe a na-ekwu ebe a bụ ndị dike n’agha a na-elikọta ha na mma agha ha iji kwanyere ha ùgwù.
^ O nwere ike ịbụ Fero ma ọ bụ Ijipt.
^ Ma ọ bụ “n’ili.”
^ Ma ọ bụ “n’ili.”
^ Na Hibru, “a na-ebighị úgwù.”