Ezikiel 3:1-27
3 Ọ gwaziri m, sị: “Nwa nke mmadụ, taa ihe dị n’ihu gị.* Taa akwụkwọ mpịakọta a, gaakwa gwa ndị Izrel okwu.”+
2 M meghekwara ọnụ m, ya enye m akwụkwọ mpịakọta ahụ ka m taa.
3 Ọ gwakwara m, sị: “Nwa nke mmadụ, taa akwụkwọ mpịakọta a m na-enye gị, tajuo afọ.” M wee tawa ya, ya ana-atọ m ụtọ n’ọnụ ka mmanụ aṅụ.+
4 Ya asị m: “Nwa nke mmadụ, gaa ebe ndị Izrel nọ ma gwa ha ihe m kwuru.
5 N’ihi na ndị m na-ezi gị ka ị gakwuru abụghị ndị ị na-anaghị aghọta asụsụ ha ma ọ bụ ndị asụsụ ha siri ike nghọta, kama ha bụ ndị Izrel.
6 Ha abụghị mba ndị ị na-anaghị aghọta asụsụ ha ma ọ bụ ndị asụsụ ha siri ike nghọta, ndị ị na-agaghị aghọta ihe ha na-ekwu. A sị na ọ bụ ha ka m ziri gị ka ị gakwuru, ha ga-ege gị ntị.+
7 Ma, ndị Izrel agaghị ege gị ntị, ebe ọ bụ na ha achọghị ige m ntị.+ Ndị Izrel niile bụ ndị isi ike. Obi ha kpọchikwara akpọchi.+
8 Emeela m ka ihu gị sie ike ka ihu ha, meekwa ka egedege ihu gị sie ike ka egedege ihu ha.+
9 Emeela m ka egedege ihu gị dịrị ka dayamọnd, siekwa ike karịa nkume.+ Ha bụ ndị nnupụisi, ma atụla ha egwu. Ụjọ atụkwala gị ma ị hụ ihu ha.”+
10 Ọ gwakwara m, sị: “Nwa nke mmadụ, nụrụ okwu niile m na-agwa gị, burukwa ha n’obi.
11 Gakwuru ndị obodo gị* a dọọrọ n’agha,+ gwakwa ha okwu. Gwa ha, sị, ‘Lekwanụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru,’ ma hà ga-anụ ma ha agaghị anụ.”+
12 Otu mmụọ* wee buru m,+ mụ anụ olu nke na-eme oké mkpọtụ n’azụ m, na-asị: “Ka e too Jehova n’ebe o bi maka na ọ dị ebube.”
13 Anụkwara m ụda nku ndị mmụọ ozi ahụ* ka ha na-emetụ ibe ha,+ nakwa ụda wiil ndị ahụ dị ha nso,+ nakwa ụda nke ihe na-eme oké mkpọtụ.
14 Mmụọ ahụ buuru m na-aga, m nọkwa na-aga ka onye obi na-adịghị mma na onye ezigbo iwe ji. Mmụọ Jehova nọkwa na-akpa ike dị egwu n’ahụ́ m.
15 M gawara ebe ndị ahụ a dọtara n’agha bi na Tel-ebib. Ha bi n’akụkụ osimiri Kiba.+ M bikwa ebe ahụ ha bi, ma, ihe m hụrụ juru m anya.+ M bikwara ebe ahụ abalị asaa.
16 Mgbe abalị asaa ahụ gachara, Jehova gwara m, sị:
17 “Nwa nke mmadụ, m họpụtara gị ka ị bụrụ onye nche ndị Izrel.+ Ọ bụrụ na ị nụ ihe ọ bụla n’ọnụ m, dọọ ha aka ná ntị otú m gwara gị dọọ ha.+
18 Ọ bụrụ na mụ asị onye ajọ omume, ‘Ị ga-anwụrịrị,’ ma ị dọghị ya aka ná ntị, i kwughịkwa okwu iji dọọ onye ajọ omume ahụ aka ná ntị ka ọ hapụ àgwà ọjọọ ya ma dịrị ndụ,+ ebe ọ bụ onye ajọ omume, ọ ga-anwụ n’ihi mmehie ya,+ ma ọbara ya ga-adị gị n’isi.*+
19 Ma, ọ bụrụ na ị dọọ onye ajọ omume aka ná ntị, ma ọ hapụghị ajọ omume ya na àgwà ọjọọ ya, ọ ga-anwụ n’ihi mmehie ya, ma ị gbarala isi onwe gị.*+
20 Ma, ọ bụrụ na onye ezi omume akwụsị ime ezi omume, mewe ihe ọjọọ,* m ga-eme ka ọdachi dakwasị ya, ọ ga-anwụkwa.+ Ọ bụrụ na ị dọghị ya aka ná ntị, ọ ga-anwụ n’ihi mmehie ya, a gaghịkwa echeta ezi omume o mere, ma, ọbara ya ga-adị gị n’isi.*+
21 Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ezi omume aka ná ntị ka ọ ghara imehie, o mehieghịkwa, ọ ga-adịrị ndụ na-aga n’ihi na ị dọrọ ya aka ná ntị,+ i sikwala otú ahụ gbara isi onwe gị.”*
22 Mmụọ Jehova dakwasịrị m ebe ahụ, Chineke asị m: “Bịa gawa na ndagwurugwu. M ga-agwa gị okwu ebe ahụ.”
23 M wee gawa na ndagwurugwu ahụ. Mgbe m ruru, m hụrụ ebube Jehova n’ebe ahụ,+ ụdị ebube ahụ m hụrụ n’akụkụ osimiri Kiba.+ M gbukwara ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala.
24 Mmụọ nsọ dakwasịkwara m ma mee ka m kwụrụ ọtọ.+ Chineke malitekwara ịgwa m okwu, sị:
“Gaa mechibido onwe gị ụzọ n’ime ụlọ gị.
25 Ma ha ga-eke gịnwa, bụ́ nwa nke mmadụ, ụdọ ka ị ghara inwe ike ịpụta gaa ebe ha nọ.
26 M ga-emekwa ka ire gị rapara n’okpo ọnụ gị. Ị ga-adakwa ogbi. Ị gaghịkwa enwe ike ịdọ ha aka ná ntị, n’ihi na ha bụ ndị nnupụisi.
27 Ma, m ga-emeghe ọnụ gị ma m gwawa gị okwu. Ị ga-asịkwa ha,+ ‘Lekwanụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.’ Ka onye chọrọ ịnụ nụrụ,+ ka onye na-achọghị ịnụ ghara ịnụ, n’ihi na ha bụ ndị nnupụisi.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “rie ihe ị na-ahụ.”
^ Na Hibru, “ụmụ ndị gị.”
^ N’asụsụ Hibru, mmụọ e dere ebe a nwere ike ịbụ mmụọ nsọ ma ọ bụkwanụ mmụọ ozi.
^ Na Hibru, “ihe ndị ahụ dị ndụ.”
^ Ma ọ bụ “m ga-ajụta ọbara ya n’aka gị.”
^ Ma ọ bụ “ị napụtala mkpụrụ obi gị.”
^ Ma ọ bụ “ihe na-ezighị ezi.”
^ Ma ọ bụ “m ga-ajụta ọbara ya n’aka gị.”
^ Ma ọ bụ “napụta mkpụrụ obi gị.”