Ezikiel 29:1-21
29 N’abalị iri na abụọ, n’ọnwa iri, n’afọ nke iri,* Jehova gwara m okwu, sị:
2 “Nwa nke mmadụ, chee Fero eze Ijipt ihu, buokwa amụma ihe a ga-eme ya na ndị Ijipt niile.+
3 Kwuo, sị: ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị:
“Fero, eze Ijipt, m ga-eme gị ihe.+
Ị bụ nnukwu anụ mmiri nke gbatịrị onwe ya n’iyi niile na-asọnye n’Osimiri Naịl.*+
I kwuru, sị, ‘Ọ bụ m nwe Osimiri Naịl.
M mere ka ọ dịrị maka onwe m.’+
4 Ma m ga-etinye nko n’agba gị ma mee ka azụ̀ ndị dị n’Osimiri Naịl gị rapara n’akpịrịkpa gị.
M ga-esi n’Osimiri Naịl gị dọpụta gị na azụ̀ niile rapaara n’akpịrịkpa gị.
5 M ga-ahapụ gị n’ala ịkpa, gị na azụ̀ niile dị n’Osimiri Naịl gị.
Ị ga-ada n’ọhịa. A gaghị achịkọta gị. A gaghịkwa atụtụkọta gị.+
M ga-eme ka anụ ọhịa na nnụnụ rie gị.+
6 Ndị niile bi n’Ijipt ga-amara na m bụ Jehova,N’ihi na ha dị ka okporo ọka* nke ndị Izrel na-enweghị ike ịdabere na ya.+
7 Mgbe ha jidere gị aka, ị gbajiri,Mee ka ha merụọ ezigbo ahụ́ n’ubu.
Mgbe ha dabeere gị n’ahụ́, ị gbajiri,Mee ka ụkwụ* ha mawa jijiji.”+
8 “‘N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “M ga-eji mma agha mee gị ihe.+ M ga-egbu ma mmadụ ma anụmanụ nọ n’Ijipt.
9 A ga-ala Ijipt n’iyi. Ọ ga-atọgbọrọkwa nkịtị.+ Ha ga-amarakwa na m bụ Jehova, n’ihi na ị* sịrị, ‘Ọ bụ m nwe Osimiri Naịl. Ọ bụ m mere ka ọ dịrị.’+
10 N’ihi ya, m ga-eme gị na Osimiri Naịl gị ihe. M ga-ala Ijipt n’iyi, meekwa ka ọ bụrụ ala kpọrọ nkụ. Ọ ga-atọgbọrọ nkịtị,+ malite na Migdọl+ ruo Sayini,+ ruokwa n’ókè ya na Etiopia.
11 Ma ụkwụ mmadụ ma ụkwụ anụ ụlọ agaghị esi na ya gafee.+ A gaghịkwa ebi na ya ruo afọ iri anọ.
12 M ga-eme ka ala Ijipt bụrụ ebe kacha njọ n’ala niile tọgbọ nkịtị. M ga-emekwa ka obodo ndị dị na ya bụrụ ebe kacha njọ n’obodo niile tọgbọ nkịtị. Ha ga-adị otú ahụ ruo afọ iri anọ.+ M ga-achụga ndị Ijipt ná mba dị iche iche, meekwa ka ha gbasasịa n’ala dị iche iche.”+
13 “‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Afọ iri anọ gachaa, m ga-esi n’obodo dị iche iche a chụgara ndị Ijipt kpọkọta ha.+
14 M ga-akpọghachite ndị Ijipt a dọọrọ n’agha, ha alọghachi Patrọs,+ bụ́ ala ha si. Ma, e nweghị ihe a ga-eji alaeze ha kpọrọ.
15 E nweghịzi ihe Ijipt ga-abụ ma e jiri ya tụnyere alaeze ndị ọzọ. Ọ gaghịkwa na-achị mba ndị ọzọ.+ M ga-eme ka ha dị nnọọ ole na ole nke na ha agaghịzi na-atụrụ mba ndị ọzọ ụka.+
16 Ndị Izrel agaghịzi na-atụkwasị ha obi,+ kama, ihe merenụ ga na-echetara ndị Izrel na aka ha gara ka ndị Ijipt nyere ha ekwesịghị ekwesị. Ha ga-amarakwa na m bụ Ọkaakaa Onyenwe ha bụ́ Jehova.”’”
17 N’abalị mbụ, n’ọnwa mbụ, n’afọ nke iri abụọ na asaa,* Jehova gwara m okwu, sị:
18 “Nwa nke mmadụ, Nebukadneza,*+ bụ́ eze Babịlọn, mere ka ndị agha ya lụso Taya agha.+ N’oge ahụ, isi mmadụ niile kwọchara, ubu ha niile echihịakwa. Ma, a kwụghị ya na ndị agha ya ụgwọ ọ bụla maka agha ha lụsoro Taya.
19 “N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘M ga-enye Nebukadneza* bụ́ eze Babịlọn ala Ijipt.+ Ọ ga-eburu akụ̀ ndị dị na ya, kwakọrọkwa ọtụtụ ihe na ya. Ihe ndị a ga-adịzi ka ihe e ji kwụọ ndị agha ya ụgwọ.’
20 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘M ga-enye ya ala Ijipt ka ọ bụrụ ụgwọ a kwụrụ ya maka ihe o mere Taya, n’ihi na ọ rụụrụ m ọrụ.’+
21 “N’ụbọchị ahụ, m ga-eme ka ndị Izrel nwee onye siri ike.*+ M ga-emekwa ka gịnwa bụ́ Ezikiel kwuo okwu ebe ha nọ. Ha ga-amarakwa na m bụ Jehova.”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ọ ga-abụ afọ nke iri a dọọrọ Eze Jehoyakim, Ezikiel, na ndị Juu ndị ọzọ n’agha.
^ N’amaokwu a nakwa n’amaokwu ndị ọzọ na-eso ya, “Osimiri Naịl” bụ Osimiri Nail n’onwe ya nakwa iyi niile na-asọnye na ya.
^ Na Hibru, “ahịhịa amị.”
^ Na Hibru, “úkwù.”
^ O nwere ike ịbụ Fero.
^ Ọ ga-abụ afọ nke iri abụọ na asaa a dọọrọ Eze Jehoyakim, Ezikiel, na ndị Juu ndị ọzọ n’agha.
^ Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
^ Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
^ Na Hibru, “m ga-eme ka mpi pulitere ndị Izrel.”