Ezikiel 27:1-36

  • Abụ iru uju banyere Taya bụ́ obodo kpuru ka ụgbọ mmiri (1-36)

27  Jehova gwara m okwu ọzọ, sị:  “Nwa nke mmadụ, bụọ abụ iru uju banyere Taya.+  Gwa Taya, sị,‘Gịnwa, bụ́ onye bi n’ọnụ ọnụ oké osimiri,Onye ya na ndị bi n’ọtụtụ agwaetiti na-azụkọ ahịa,Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Taya, ị sịrị, ‘Abụ m ebe mma ruru gwụ.’+   Oké osimiri gbara ala gị gburugburu. Ndị na-arụ gị ka ụgbọ mmiri emeela ka ị bụrụ ebe mma ruru gwụ.   Ha si n’osisi junipa nke si Sina nweta osisi niile e ji rụọ gị.+ Ha ji osisi sida nke si Lebanọn rụọ osisi a na-eke ákwà ụgbọ mmiri nke dị n’elu gị.   Ha ji osisi ook ndị si Beshan rụọ ụmara e ji akwọ gị. Ha ji ọdụ́ a kwụnyere n’osisi saịpres nke si n’agwaetiti Kitim rụọ ihu gị.+   Ákwà linin tụrụ àgwà nke si Ijipt ka ha kere n’elu gị. Ákwà na-acha anụnụ anụnụ na ákwà na-acha pọpụl nke si n’agwaetiti Elaịsha+ ka e ji kpuchie elu gị.   Ndị na-akwọ gị bụ ndị bi na Saịdọn na Avad.+ Taya, ndị na-akwọ gị bụ ndị gị nwere nkà.+   Ndị Gibal+ ma nke a na-akọ* na ndị ọrụ ha nwere nkà na-arachi oghere ndị dị na gị.+ Ụgbọ mmiri niile a na-akwọ n’oké osimiri na ndị na-arụ ọrụ na ha bịakwutere gị ka ha ree ngwá ahịa ha. 10  Ndị Peshia, ndị Lọd, na ndị Pọt+ so ná ndị agha gị, ndị na-alụrụ gị agha. Ha kokwasịrị ọta na okpu agha ha ná mgbidi gị. Ọ bụ ha mere ka ị dị ebube. 11  Ndị Avad, ndị so ná ndị agha gị, nọ gburugburu n’elu mgbidi gị. Ụmụ nwoke ndị obi siri ike nọ n’ụlọ elu gị. Ha kokwasịrị ọta ha dị okirikiri ná mgbidi gị gbaa gburugburu. Ọ bụ ha mere ka ị bụrụ ebe mma ruru gwụ. 12  “‘“Ndị Tashish+ bụ ndị ahịa gị n’ihi na i nwehiri akụ̀ nne.+ Ha na-eji ọlaọcha, ígwè, gbamgbam, na nkume led* ha agbanweta ngwá ahịa gị.+ 13  Ndị Jevan na ndị Tubal+ nakwa ndị Mishek+ bụ ndị ahịa gị. Ha na-eji ndị ohu na ihe ndị e ji ọla kọpa mee agbanweta ngwá ahịa gị.+ 14  Ndị si n’ezinụlọ Togama+ na-eji ịnyịnya nkịtị na ịnyịnya agha na jakị agbanweta ngwá ahịa gị. 15  Ndị Didan+ bụ ndị ahịa gị. Ị kpọrọ ndị bi n’ọtụtụ agwaetiti ka ha na-erere gị ahịa. Ha nyere gị ọdụ́+ na osisi eboni n’onyinye. 16  Ndị Ịdọm bụ ndị ahịa gị n’ihi ọtụtụ ihe ị na-emepụta. Ha na-eji nkume tọkwọiz, ákwà pọpụl, ákwà tụrụ àgwà, ezigbo ákwà, nkume kọral, na rubi agbanweta ngwá ahịa gị. 17  “‘“Ndị Juda na ndị Izrel bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-eji ọka wit si Minit,+ nri pụrụ iche, mmanụ aṅụ,+ mmanụ, na balsam+ agbanweta ngwá ahịa gị.+ 18  “‘“Ndị Damaskọs+ bụ ndị ahịa gị n’ihi ọtụtụ ihe ị na-emepụta nakwa n’ihi akụ̀ gị niile. Ha na-eji mmanya si Helbọn na ajị anụ si Zeha* agbanweta ngwá ahịa gị. 19  Ndị Vidan na ndị Jevan, ndị bi nso na Yuzal, na-eji ihe ndị e ji ígwè kpụọ, osisi kashịa,* na okpete na-esi ísì ọma agbanweta ngwá ahịa gị. 20  Ndị Didan+ na-eji ákwà* e ji anọ ọdụ n’elu ịnyịnya agbanweta ngwá ahịa gị. 21  Ndị Arab na ndị isi Kida niile+ bụ ndị na-erere gị ahịa. Ha na-erere gị ụmụ atụrụ na ebule na ewu.+ 22  Ndị ahịa Shiba na Rema+ bụ ndị ahịa gị. Ha na-eji ụdị mmanụ otite niile kacha mma na-esi ísì ọma, nkume ndị dị oké ọnụ,* na ọlaedo agbanweta ngwá ahịa gị.+ 23  Ndị Heran,+ ndị Kane, ndị Iden,+ ndị ahịa Shiba,+ ndị Ashọ,+ na ndị Kilmad bụ ndị ahịa gị. 24  Ha na-anọ ebe ị na-ere ahịa na-erere gị uwe mara mma, uwe e ji ákwà na-acha anụnụ anụnụ na ákwà tụrụ àgwà mee, nakwa kapet tụrụ àgwà. E ji ụdọ kesie ihe ndị a niile ike. 25  Ọ bụ ụgbọ mmiri ndị na-aga Tashish+ na-eburu gị ngwá ahịa,Nke na akụ̀ gị juziri ebe niile, bụrụkwa ibu dị arọ* n’oké osimiri. 26  Ndị na-akwọ gị kwọrutere gị n’oké osimiri. Ifufe nke si n’ebe ọwụwa anyanwụ emeela ka i kpuo n’etiti oké osimiri. 27  N’ụbọchị ị ga-ada, ihe niile i nwere ga-adakpu n’oké osimiri,+Ma akụ̀ gị ma ngwongwo gị ma ngwá ahịa gị ma ndị na-arụ ọrụ n’ime gị ma ndị na-akwọ gịMa ndị na-arachi oghere ndị dị na gị ma ndị na-erere gị ahịa+ ma ndị niile na-alụrụ gị agha,+Ya bụ, ndị niile nọ n’ime gị. 28  Ndị na-akwọ gị tie mkpu ákwá, obodo ndị dị n’ụsọ osimiri ga-ama jijiji. 29  Ndị niile na-eji ụmara akwọ ụgbọ, ndị na-arụ ọrụ n’ụgbọ mmiri, na ndị niile na-akwọ ụgbọ mmiri n’oké osimiriGa-esi n’ụgbọ ha rịtuo ma guzoro n’elu ala. 30  Ha ga-eji maka gị na-eti mkpu, na-ebe ezigbo ákwá,+Na-ekpokwasị ájá n’isi ha, na-atụrụkwa onwe ha ná ntụ. 31  Ha ga-eji maka gị yiri ákwà iru uju, kpụchaakwa isi ha, ya ana-akwọ mụrụmụrụ. Ha ga-ejikwa maka gị bee ezigbo ákwá,* na-ebekwa nnọọ ákwá arịrị. 32  Mgbe ha na-ebere gị ákwá arịrị, ha ga-eji gị bụọ abụ iru uju, sị: ‘Ònye dị ka Taya, onye a lara n’iyi n’etiti oké osimiri?+ 33  Mgbe ngwá ahịa gị si n’oké osimiri pụta, i mere ka afọ ju ọtụtụ ndị.+ I ji nnukwu akụ̀ gị na ngwá ahịa gị mee ka ndị eze ụwa baa ọgaranya.+ 34  Ugbu a, i kpuola n’oké osimiri ka ụgbọ mmiri, dakpuo n’ala ala mmiri.+ Ma ngwá ahịa gị ma ndị gị niile dakpuchara n’ime mmiri.+ 35  Ndị niile bi n’agwaetiti dị iche iche ga-ekporopụ anya na-ele gị.+ Ndị eze ha ga-amakwa jijiji n’ihi ụjọ.+ Ihu ha ga-egosikwa na ha nọ ná nsogbu. 36  Ndị ahịa si n’obodo dị iche iche ga-afụ mkpọrọhịhị n’ihi ihe mere gị. A ga-ebibi gị na mberede. Mbibi gị ga-adịkwa egwu. Ị gaghịkwa adị ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.’”’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “bụ́ ndị okenye.”
Ma ọ bụ “opu.”
Ma ọ bụ “ajị anụ na-acha nchara nchara.”
Osisi kashịa bụ nwanne osisi sinamọn.
Ma ọ bụ “ákwà e kwere ekwe.”
Ma ọ bụ “nkume ndị pụrụ iche.”
O nwere ike ịbụ, “dịkwa ebube.”
Ma ọ bụ “bee ákwá n’ihi otú o si na-ewute ha ná mkpụrụ obi.”