Ezikiel 24:1-27

  • Jeruselem dị ka ite tara nchara e ji esi nri (1-14)

  • Ọnwụ nwunye Ezikiel nwere ihe ọ na-egosi (15-27)

24  N’abalị iri n’ọnwa iri n’afọ nke itoolu,* Jehova gwara m okwu ọzọ, sị:  “Nwa nke mmadụ, dee akara ụbọchị a,* ya bụ, akara ụbọchị taa. Eze Babịlọn bidoro ịlụso Jeruselem agha n’ụbọchị taa.+  Tụọ ilu gbasara ndị a na-enupụ isi, kwuokwa gbasara ha, sị,“‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Sikwasịnụ ite e ji esi nri* n’ọkụ. Unu sikwasị ya n’ọkụ, gbanyenụ ya mmiri.+   Chịnyekwanụ anụ dị mma e beriri eberi n’ime ya.+ Tinyenụ apata ụkwụ ya na ubu ya. Wụjuonụ ya ọkpụkpụ ndị kacha mma.   Ọ bụ atụrụ nke kacha mma+ ka unu ga-esi. Unu ga-esonyekwa nkụ gburugburu n’okpuru ite ahụ. Sienụ anụ ya e beriri eberi, siekwanụ ọkpụkpụ ya.”’”  “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘Obodo nke na-egbu mmadụ* ga-ata ahụhụ.+ Ọ bụ ite tara nchara e ji esi nri, nke nchara ọ tara na-apụbeghị na ya. Wepụtanụ anụ dị n’ime ya otu otu.+ Unu eferela ya nza.   N’ihi na ọbara ndị e gburu n’obodo a dịcha na ya.+ Ha wụsara ya na nkume na-enweghị ihe dị n’elu ya. Ha awụsaghị ya n’ala, ka e nwee ike kpochie ya ájá.+   Ihe a ga-eme ka m jiri iwe taa ha ahụhụ. Ahapụrụ m ọbara ndị ahụ na nkume na-enweghị ihe dị n’elu ya, nke na-akwọkwa mụrụmụrụ,Ka a ghara ikpochi ya ájá.’+  “N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘M ga-ata obodo na-egbu ndị mmadụ* ahụhụ.+ M ga-achịkọta nkụ, ikpo ya ga-adịkwa elu. 10  Chịkọtanụ nkụ, menwuokwanụ ọkụ. Sienụ anụ ahụ ka o ghee eghee. Wụpụtanụ mmiri unu ji sie ya. Hapụkwanụ ọkpụkpụ ndị ahụ n’ite ka ha ree ọkụ. 11  Sikwasịnụ ite ihe na-adịghị e ji ọla kọpa rụọ n’ọkụ ka ọ dị ọkụ. Ọ ga-adị ọkụ, na-achakwa ọkụ. Unyi dị na ya ga-ere ọkụ.+ Nchara ọ tara ga-erechapụkwa. 12  Ihe a na-agwụ ike ma na-eme ka a daa mbà,N’ihi na ọ tara nnọọ nchara nke na ọ gaghị apụ apụ n’ahụ́ ya.+ Tụbanụ ya na nchara ọ tara n’ọkụ!’ 13  “‘Ọ bụ omume rụrụ arụ ị na-eme mere i ji bụrụ onye na-adịghị ọcha.+ M gbara mbọ ka m mee ka ị dị ọcha, ma, ị kwụsịghị ihe ndị ahụ mere ka ị ghara ịdị ọcha. Ị gaghị adị ọcha ruo mgbe iwe m na-ewesa gị dajụrụ.+ 14  Ọ bụ mụnwa, bụ́ Jehova, kwuru ihe a. Ọ ga-emezurịrị. M ga-eme ihe n’eleghị anya n’azụ, n’emeghịkwa ebere. Agaghịkwa m akwa mmakwaara.+ Ndị agha ahụ ga-ekpe gị ikpe maka ihe i mere nakwa maka àgwà ị kpara.’ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.” 15  Jehova gwara m okwu ọzọ, sị: 16  “Nwa nke mmadụ, m ga-anapụ gị onye ị hụrụ n’anya n’otu ntabi anya.+ Erula uju.* Ebela ákwá. Anya mmiri agbakwala gị. 17  Sụọ ude, ekwula okwu. Erukwarala onye nwụrụ anwụ uju.+ Kee ákwà isi gị,+ yirikwa akpụkpọ ụkwụ gị.+ Ekpuchila afụ ọnụ gị,+ erikwala nri ndị ọzọ buteere gị.”*+ 18  Mụ na ndị mmadụ nọ na-ekwurịta okwu n’ụtụtụ, nwunye m anwụọ n’uhuruchi. N’ụtụtụ echi ya, m mere nnọọ ihe a gwara m mee. 19  Ndị mmadụ nọkwa na-agwa m, sị: “Ọ̀ bụ na ị gaghị agwa anyị otú ihe a ị na-eme si gbasa anyị?” 20  Mụ agwa ha, sị: “Jehova gwara m, sị, 21  ‘Gwa ndị Izrel, sị: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘M ga-emerụ ụlọ nsọ m,+ nke bụ́ ebe unu ji anya isi na ebe unu hụrụ n’anya nakwa ebe unu ji kpọrọ ezigbo ihe.* A ga-eji mma agha gbuo ụmụ unu ndị nwoke na ụmụ unu ndị nwaanyị, bụ́ ndị unu hapụrụ n’obodo a.+ 22  Mgbe ahụzi, unu ga-eme nnọọ ihe Ezikiel mere. Unu agaghị ekpuchi afụ ọnụ unu. Unu agaghịkwa eri nri ndị ọzọ buteere unu.+ 23  Unu ga-eke ákwà isi unu, yirikwa akpụkpọ ụkwụ unu. Unu agaghị eru uju. Unu agaghịkwa ebe ákwá. A ga-ebibi unu n’ihi mmehie unu.+ Unu ga na-elekwa ibe unu anya na-asụ ude. 24  Unu ga-eji Ezikiel mara ihe ga-eme unu.+ Unu ga-eme nnọọ ihe o mere. Mgbe ihe o kwuru ga-eme, unu ga-amara na m bụ Ọkaakaa Onyenwe unu Jehova.’”’” 25  “Nwa nke mmadụ, n’ụbọchị m ga-anapụ ha ebe ha rụsiri ike, nke bụ́ ebe mara mma na-eme ha obi ụtọ, ebe ha hụrụ n’anya, nakwa ebe ha* ji kpọrọ ezigbo ihe, napụkwa ha ụmụ ha ndị nwoke na ụmụ ha ndị nwaanyị,+ 26  onye gbapụrụ agbapụ ga-abịa kọọrọ gị ihe merenụ.+ 27  N’ụbọchị ahụ, ị ga-emeghe ọnụ gị, gwa onye ahụ gbapụrụ agbapụ okwu. Ị gaghịzi agba nkịtị.+ Ha ga-ejikwa gị mara ihe ga-eme ha. Ha ga-amarakwa na m bụ Jehova.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọ ga-abụ afọ nke itoolu a dọọrọ Eze Jehoyakim, Ezikiel, na ndị Juu ndị ọzọ n’agha.
Na Hibru, “aha ụbọchị a.”
Ma ọ bụ “ite e ji esi nri, nke nwere ọnụ obosara.”
Ma ọ bụ “na-awụfu ọbara.”
Ma ọ bụ “na-awụfu ọbara.”
Ma ọ bụ “Etila aka n’obi.”
Na Hibru, “nri ndị mmadụ.”
Ma ọ bụ “ebe mkpụrụ obi unu na-enwere ọmịiko.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ha.”