Ezikiel 2:1-10
2 Onye ahụ gwara m, sị: “Nwa nke mmadụ,* bilie ọtọ ka m gwa gị okwu.”+
2 Mgbe ọ gwara m okwu, mmụọ nsọ dakwasịrị m ma mee ka m guzoro ọtọ,+ ka m wee nụ ihe onye ahụ na-agwa m okwu na-ekwu.
3 Ọ gwakwara m, sị: “Nwa nke mmadụ, m na-ezi gị ka ị gakwuru ndị Izrel,+ bụ́ mba dị isi ike, ndị nupụụrụ m isi.+ Ha na ndị nna nna ha na-emehie m ruo taa.+
4 M na-ezi gị ka ị gakwuru ụmụ na-aka anya na ndị isi ike.+ Ị ga-asịkwa ha, ‘Lekwanụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.’
5 Ma hà ga-anụ ma ha agaghị anụ, n’ihi na ha bụ ndị nnupụisi,+ ha ga-amara na e nwere mgbe ha na onye amụma nọ.+
6 “Ma gịnwa, nwa nke mmadụ, atụla ha egwu,+ atụkwala ụjọ maka ihe ha na-ekwu, ọ bụ eziokwu na ogwu+ gbara gị gburugburu* nakwa na ị nọ ebe akpị juru. Ha bụ ndị nnupụisi, ma atụkwala ụjọ maka ihe ha na-ekwu.+ Ụjọ atụkwala gị ma ị hụ ihu ha.+
7 Gwa ha ihe m kwuru, ma hà ga-anụ ma ha agaghị anụ, n’ihi na ha bụ ndị nnupụisi.+
8 “Ma gịnwa, nwa nke mmadụ, nụrụ ihe m na-agwa gị. Enupụkwala isi otú ndị isi ike a na-enupụ. Meghee ọnụ gị taa ihe m na-enye gị.”+
9 Mgbe m lere anya, m hụrụ aka a gbatịịrị m,+ m hụkwara na aka ahụ ji akwụkwọ mpịakọta e dere ihe.*+
10 Mgbe onye nwe aka ahụ gbasara akwụkwọ ahụ n’ihu m, m hụrụ na e dere ya ihe ihu na azụ.+ Ihe e dere na ya na-eme ka ndị mmadụ na-abụ abụ iru uju, na-ebe ákwá, na-akwakwa arịrị.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ihe a bụ nke mbụ n’ime ugboro 93 “nwa nke mmadụ” gbara n’akwụkwọ Ezikiel.
^ O nwere ike ịbụ, “ọ bụ eziokwu na ha bụ ndị isi ike, ha dịkwa ka ihe na-adụ gị ogwu.”
^ Ma ọ bụ “akwụkwọ a pịakọtara apịakọta.”